Fake News: Mbaka ọ katọrọ Peter Obi ọzọ n'ụbọchị ụka, Ọkụtoba 2?

Fr Ejike Mbaka

Akụkọ amalitela ifegharị na soshal midia nke na-ekwu na ụkọchukwu a ma ama n'Enugwu steeti bụ Ejike Mbaka, katọrọ aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ugbua n'otu 'Labour Party'.

Asịrị a kwuru na Mbaka katọrọ Peter Obi n'ụbọchị ụka, abalị abụọ nke Ọkutoba, ma kwuo sị: "ọ bụrụ na ihere emeghị Peter Obi na 2023, mara na Chineke akpọghị m oku."

Mana nnyocha BBC Igbo egosila na akụkọ ahụ abụghị eziokwu chaachaa, maka na Mbaka ekwughị ihe ọbụla iji katọọ Peter Obi ọzọ.

Ya bụ akụkọ na-efegharị dịka Dayọsis Enugwu kwuru n'ụbọchị Sọnde na ezigala ụkọchukwu Mbaka ka ọ gaa obere njem ekpere iji gee Chineke ntị.

Ụkọchukwu Benjamin Achi, bụ ọnụ na-ekwuru dayọsis Enugwu, gwara BBC Igbo n'ekwentị na "onweghị mgbe Mbaka ji kwuo ụdị okwu ahụ".

"Anyị egeela onyonyo okwu Mbaka kwuru n'ụbọchị ụka ahụ, ụfọdụ ndị ụkọchukwu nọkwa ebe ahụ, onweghị ihe dị otu ahụ Mbaka kwuru," Fada Achi kọwara.

"Onweghị ihe akaebe ọbụla gosiri na Mbaka kwuru ihe dị otu a n'ebe ọzọ, ya mere anyị ji kwenyesie ike na akụkọ a na-efegharị ugbua bụ akụkọ ụgha."

Ihe Mbaka kwuru n'Ọkutoba 2 gbasara ntuliaka 2023

Fr Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry

BBC Igbo nwetara onyonyo ebe Mbaka kwuru okwu n'ụbọchị ụka, Ọkụtọba 2, gbasara ntuliaka 2021.

O kwuru sị: "Arịọrọ m Chineke ka o gosi m ihe ga-eme gbasara ọgbakọ ekpere 'Adoration', mana Chineke gosiri m ihe gbasara Naịjirịa na ntuliaka 2023."

"Mana enwere ihe Chukwu ga-egosi gị ma sị gị mee ka mmadụ niile mara, nwee nke ọ ga-egosi gị sị gị zochie ya."

"Chukwu gosiri m ihe banyere ntuliaka a nke unu ji etigbu onwe ụnụ... mana ọ gwara m ka m ghara ikwuputa ya ugbua."

"Onweghị onye mụ na ya na-ese okwu... onweghị ihe Chukwu gosiri m na-anaghị abịa na mmezu."

"Ewepu na Chukwu nyere m iwu ka m ghara ikwupụta ihe a o gosiri m, agaara m ịgwa ụmụ Naịjirịa ihe ha ga-eme, maka ka ọ dị ugbua, ọtụtụ mmadụ na-egbu onwe ha oge."

Ihe Mbaka kwuru maka Peter Obi n'oge gara aga

PETER OBI na FR MBAKA

Ebe foto si, PETER OBI/FR MBAKA

Ụkọchukwu Mbaka kwuburu okwu n'ọnwa June afọ a gbasara Peter Obi na ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ọ na-azọ.

N'oge ahụ o kwuru na "Peter Obi bụ onye 'aka gụm'" ... ma kwukwaa na "onye 'aka gum' enweghị ike ịbụ onyeisiala Naịjirịa".

Mana Mbaka mechara rịọ mgbaghara ma kwuo na ọ bụ nghọtahie ka ndị mmadụ ghọtahiere ya.

Bishọp ụka Katọlik n'Enugwu steeti bụ Callistus Onaga katọkwara ihe ahụ Mbaka kwuru n'oge ahụ.

Onaga kwuru na nke a abụghị nkuzi Katọlik ma ncha.

Ọ bụkwa nke a kpatara o ji nye iwu ka ekpere 'adoration mịnịstrị' kwụsịgodu nwa mgbe nta.