BBC Igbo Debate 2023: Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ na South East

Ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Enugwu Steeti ekwuola ihe ga-eme ma ọ bụrụ na e nye ha ohere ịchị steeti ahụ.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu

  1. Igbo ndị ọma ndewo maka ị nọnyere BBC Igbo

    Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

    Anyị na-ekele gị onye nọnyere anyị n'ọgbakọ nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Abia, Ebonyi nakwa Enugwu steetị, nke BBC Igbo haziri n'afọ a bụ 2023.

    Anyị ji aka na ị nụla banyere nkwa ndị a kwere gị ma ọ bụrụ ha merie n'ọkwa.

    Ụgwọ i ji ugbua bụ ịnata kaadị e ji atụ vootu ma gaa binyere onye ọbụla ị chọrọ aka n'ụbọchị ntuliaka.

    Maka akụkọ banyere ntuliaka nakwa ndị ọzọ gaa n'ọbaozi anyị bụ BBCIgbo.com

    Daalụ! Ụbọchị ọzọ ka anyị chụọ n'owere nchi.

  2. Chijioke Edeoga

    Chijioke Edeoga nke LP

    Nkwa ndị o kwere:

    • Ọchịchị m ga-ehiwe ministri ga-atọ ntọala maka ụlọakwụkwọ praịmarị. A ga-ahụ na arụrụ ụlọkwụkwọ praịmarị tara ọchịchị. Aga m eleba anya na Praịmarị maka na ọ bụ ebe agụmaakwụkwọ malitere.
    • Anyị ga-eweta ọkụ latrik ma mee ka ọ dịịrị na-aga maka na ọ bụ ya bụ isisekpu ntị na-ahụ na ndị ọrụ aka rụrụ ọrụ.
    • Anyị ga-emezi ụzọ dị n’ime obodo ka ndị ụrọ ugbo nwee ike na-ebupụta ihe ubi gawa n’ime obodo mepere emepe.
    • Aga m ebelata aka n’ego gọọmentị na-emefu n’ọchịchị iji tinye ego ndị a n’ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa nakwa nke ezumike nka.
    • Ọchịchị m ga-ehiwe iwu ga-ahụ na onye ọrụ ọbụla ga-eso tinye ego n’ụgwọ ezumike nka ha.
    • Anyị ga-achọpụta ụzọ ọzọ a ga-esi enwete ọkụ latrik dịka ikike anyanwụ.
    • Ọchịchị m ga-akwado ndị uweojii na ndị nchekwa ọzọ n’ụzọ ọbụla dị mma iji chekwaa obodo anyị.
    • Ihe banyere nnwereonwe Biafra bụ ihe a ga-eme site na mkparịtaụka, ịgbakọta isi ọnụ nakwa i mere ndị mmadụ ihe ha na-achọ.
    • Aga m eme ka ihe dịrị ndị achụntaego mfe site n’inye ha ohere ka ha bịa hiwe ụlọorụ. Anyị ga-ebelata ụtụisi ha na-akwụ n’ụlọọrụ ha.
    • Anyị ga-agbasa ma chọpụta ụzọ ndị ọzọ e si enwete mmiri n’Enugwu. Anyị ga-ewere mmiri si n’ala nakwa iyi ma mezie ha ebe ndị mmadụ nwereike ịṅụ ya.
  3. Frank Nweke Jr

    Frank Nweke Jr nke APGA

    Nkwa ndị o kwere:

    • Ọchịchị m ga-enye ndị nkuzi ọzụzụ pụrụiche ka ha nwee ike na-akuzi ihe ọfụma. A ga-ebuli ego a na-akwụ ndị nkuzi. Anyị ga-arụzigarị ụlọakwụkwọ dị iche iche.
    • Aga m etinye anya n’ihe ndị ntoroọbịa nwere mmasị na ha dịka ejije, iti egwu, egwuregwu nakwa ngalaba ndị ọzọ metụtara ndị ntoroọbịa.
    • Anyị ga-enwogharị ọrụ ugbo ka o were tekịnụzụ na-eme ya ka ndị ntoroọbịa tinye uche ha na ya.
    • ọchịchị ga-agba mbọ hụụ na a kwụrụ ndị niile e ji ụgwọ ọnwa na nke ezumike nka ụgwọ. Anyị ga-enweogharị usoro e ji agwụ ezumike nka bụ ‘pension’.
    • Aga m achọpụta ihe mere na Enugwu anaghị enwe ọkụ latrik ọfụma, ma kpọkuo ụlọọrụ EEDC na-ahụ maka ka eleba ya anya. Ọchịchị m ga-achọpụta ụzọ ndị ọzọ a ga-esi ewepụta ọkụ latrik dịka ikuku gaasị, ikike si n’anyanwụ.
    • A gaghị achọ m achọ na steeti Enugwu ma ihe ọbụla mee. Aga m akwado ndị ọrụ nchekwa zite n’izụrụ ha ụgbọala nakwa ngwaọrụ. Anyị ga-eji tekịnụzụ arụ ọrụ banyere nchekwa. Mụ na ndị ndu obodo n’okwu mmanụ.
    • O doro ewu na ọkụkọ anya na e nwere mmegbu ma abịa n’okwu ndị Igbo na Naịjirịa mana usoro inwete nnwereonwe bụ ihe e ji nwaanyọ eme na-abụghị tigbuo zọgbuo.
    • Aga m enwe ndị oji ego achụnta ego ọnọdụ ga-adị ha mma iji hụụ na ha batara Enugwu bịa hiwe ụlọọrụ ha.
    • A ga-enye ụlọọrụ ndị mmadụ nwe ohere ka ha leba anya ma gbuo nsogbu banyere inwete mmiri n’Enugwu Steeti.
  4. Donatus Obi-Ozoemena

    Donatus Obi-Ozoemena nke ADC

    Nkwa ndị o kwere:

    • Ekwere m na mwulite mmadụ, ụmụaka ga-agụ akwụkwọ n’efu, ọchịchị m ga-enye ndị ọtakara na ndị.praịmarị nri n’ụbọchị ọbụla, a ga-ebelata ọnụego a na-achụ n’agụmaakwụkwọ.
    • Aga m enye ndị nkuzi nturuugo (scholarship) ka ha nwee ike na-etinye uchu n’ọrụ ha n’ikuzi ihe.
    • Mụ na ndị ụlọakụ ga-agbakọ aka ọnụ binye ndị azụmaahịa ego ka ha were rụọ ụlọọrụ dị iche iche ma sị ha were mmadụ pasentị 50 bụ ndị Enugwu n’ọrụ.
    • Ọchịchị m ga-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ha site n’ibelata ego gọọmentị na-emefu n’ọchịchị ha. Aga m ehiwe kọmitii ga-eleba anya n’ụgwọ ezumike nka (pension).
    • Anyị ehiwela ntọala etu a ga-esi enye ndị Enugwu ọkụ site n’ụtụtụ ruo n’abalị na-anyụghị anyụ. Ọkụ nyụọ ruo otu awa, kọmishọna m na-ahụ maka ọkụ latrik ga-akọwa ihe mere.
    • Aga m ewepụta akara ekwentị ndị mmadụ nwereike ịkpọ ma ọ bụrụ ihe ọbụla mee na mpaghara Enugwu ọbụla. Aga m ewepụ ndị ọrụ nchekwa ịnọchi n’okporoụzọ aghara aghara. Ndị ọrụ nchekwa m ka abụ ndị ọdịnala.
    • Ọ bụ eziokwu na a na-emegbu ndị Igbo mana ụzọ e si achụ nnwereonwe a adịghị mma kama ka anyị gbaa mbọ soro n’ihe a na-eme bụ ịbanye n’ọchịchị.
    • Ọchịchị m ga-enye nchekwa na ọkụ latrik ka ndị achụntaego bịa rụọ ụlọọrụ ha. Anyị ga-enye ha ala n’efu na-anaghị ha ụtụisi.
    • Aga m ehiwe kọmitii ga-eleba anya na nsogbu banyere mmiri n’Enugwu, ihe ọbụla ha chọpụtara ka ọchịchị ga-eme.
  5. Lee ndị a na-atụ anya ha na nrụrịtaụka nke taa

    Uchenna Nnaji

    Ebe foto si, Uchenna Nnaji/Facebook

    Nkọwa foto, Uchenna Nnaji na-azọ ọkwa Gọvanọ Enugwu na pati 'All Progressives Congress'

    Uchenna Nnaji bụ onye ga-eji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti.

    Ọ bụ onye oji eg achụ ego a ma ama na ngalaba mmanụ agbịdị na ikuku gaasị.

    Nwanne ya bụ Nnoli Nnaji nọ n'otu Peoples Democratic Party ebe ọna-azọ ọkwa ịnọchite Nkanu East na West n'ụlọ omeiwu Naịjirịa.

    Frank Nweke Jr

    Ebe foto si, Frank Nweke Jr/Facebook

    Nkọwa foto, Frank Nweke Jr na-azọ ọkwa gọvanọ Enugwu na pati APGA

    Frank Nweke Jr bụbu Mịnịsta mgbasaozi oge Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala Naịjirịa.

    Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nchịkọta otu a kpọrọ 'Nigerian Economic Summit Group'

    Ọ bụkwa onyeisi ndị ọrụ nke Gọvanọ Chimaroke Nnamani malite n'afọ 2001 ruo 2003

    Chijioke Edeoga

    Ebe foto si, Chijioke Edeoga

    Nkọwa foto, Chijioke Edeoga na-azọ ọkwa gọvanọ Enugwu Steeti na Labour Party

    Chijioke Edeoga nwetara ọzụzụ dịka ọkaiwu na na mba UK.

    Ọ bụbu Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu n'Enugwu steeti

    Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisioche okpuru ọchịchị Isi Uzo

    Donatus Obi-Ozoemena

    Ebe foto si, Donatus Obi-Ozoemena

    Nkọwa foto, Donatus Obi-Ozoemena na-azọ ọkwa Gọvanọ na pati 'African Democratic Congress' ADC.

    Donatus Obi-Ozoemena bụ ụkọchukwu nwe ụlọụka 'God's anointed live ministries'

    Ọ zọbuola ọkwa Gọvanọ Enugwu n'afọ 2019 na pati 'United Democratic Party' (UDP).

    O biri na mba Amerịka otụtụ afọ.

  6. Ụbọchị a kara aka eruola

    Ndị na-azọ gọvanọ n'Enugwu steeti

    Igbo ndị ọma, ụnụ ma na ụka a kpara akpa, isi ka e ji ekwe ya.

    Taa bụ ụbọchị ikpeazụ maka nrụrịtaụka nke BBC Igbo na-ahazi maka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ na steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, na ntuliaka 2023.

    Ọ bụ naanị na Abia, Ebonyi nakwa Enugwu steeti ka a ga-enwe ntuliaka Gọvanọ n'ọnwa Maachị afọ a.

    Anambra mere nke ha na Nọvemba afọ 2021, ebe Imo Steeti ga-eme nke ha na ngwụcha afọ 2023.

    Cheta na ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti nwere nrụrịtaụka nke ha na BBC Igbo n'ụbọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị, ebe ndị nke Ebonyi nwere nke ha n'ụbọchị 27 nke Jenụwarị.

    Taa bụ ụbọchị ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Enugwu ga-apụta kọọrọ ọhaneze ihe ha ga-eme ma ha banye n'ọchịchị.

  7. Benard Ifeanyi Odoh

    Benard Ifeanyi Odoh na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi Steeti

    Nkwa ndị o kwere gụnyere;

    • Agụmakwụkwọ ga-abụ n’efu na praịmarị na sekọndịrị, anyị ga-eme ọgbakọ banyere agụmaakwụkwọ n’izuụka abụọ anyị banyere ọchịchị.
    • Anyị na ndị ụlọụka ga-agbakọta aka ọnụ hazigharịa agụmaakwụkwọ. Anyị ga-enye ụfọdụ ụmụakwụkwọ ohere ka ha gaa gụọ akwụkwọ n’ofesi.
    • Aga m enye ndị ojiego achụ nta ego ohere ka ha hiwe ụlọọrụ dị iche iche nke ga-enye ndị mmadụ ọrụ.
    • Ọchịchị m ga-agba mbọ hụụ na obodo ọbụla ga-enwe ebe mmiri ọṅụṅụ nke ya.
    • Ọchịchị m ga-ekewapụta ụzọ ndị ọzọ a ga-esi enwete ọkụ latrik dịka ikike anyanwụ, ikuku dgz ma mee iwu ga-eme ka ọ dị mfe.
    • Agaghị etinye ọnụ n’okwu onye ga-abụ onyeisi obodo nakwa otu dị iche iche na steeti maka na ọ bụ anya gọọmentị na-etinye ebe ahụ mere ka esemokwu na nchekwa dị ọjọọ n’Ebonyi Steeti.
    • Aga m eji tekịnụzụ ebuso mpụ, ohi na nrụrụaka agha n’Ebonyi Steeti, nye ndị nchekwa ngwaọrụ zuruokw ma mee ka ọrụ dị n’obodo.
    • Ndị Igbo niile bụ ndị Biafra ma anyi o kwere ma anyị ekweghi.
    • Anyị ga-agba mbọ imepe ala Igbo tupu ekwuwa okwu ị ga n’ọchịchị etiti.
    • Ebubeagu dịka otu nchekwa nke otu onye nwe, aga m ekposa ha ma zụgharịa ha ma tinye ndị agwa ha dị mma n’ọrụ.
    • Anyị ga-etinye uchu n’ụlọọrụ na-emepụta mmanụ nri dị, anyị na ụlọorụ ndị mmadụ nwe ga-agbakọ aka ọnụ imepe ọrụ ugbo ọfụma.
  8. Adol Awam Chris

    Adol Awam Chris na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi Steeti

    Nkwa ndị o kwere gụnyere;

    • Agụmaakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị ga-abụ n’efu n’ọchịchị m.
    • Anyị ga-arụzigharị ụlọakwụkwọ dị n’obodo anyị ka ndị nọ n’ofesi bịa na-agụ akwụkwọ n’Ebonyi.
    • Ọchịchị m ga-eme ka obodo dịrị ndị oji ego achụ nta ego jụụ ka ha nwereike ihiwe ụlọọrụ ha nke ọma ma nye ha nchekwa zuru oke.
    • Aga m enwogharị akụnaụba steeti Ebonyi.
    • Aga m eme ka mmiri dị mma gbasaa n’Ebonyi Steeti ma ruo mmadụ niile aka.
    • Ụzọ mbụ ga-eme ka udo na nchekwa dị n’Ebonyi Steeti bụ ka e nye onye ọbụla oke ruru ya.
    • Pati anyị bụ NNPP nwere usoro anyị hiwere maka nchekwa bụkwanụ nke m ga-agbaso.
    • Ọ bụ mmegbu ndị Igbo butere ọchịchọ nwereonwe Biafra bụ nke na-arị ibe ya elu ugbua.
    • Aga m eweta ọdọụgbọmmiri (port) n’Ebonyi iji kpọlata ndị azụmaahịa anyị.
    • Ntọala e ji hiwe Ebubeagu adịghị mma, aga m azụgharị ha ma nye ha ezi ntọala.
    • Aga m ebinye ndị ọrụ ugbo na ndị nwere ụlọorụ ego ka ha tinye n’azụmaahịa ha.
    • Ọchịchị m ga-akwụsị ịna ndị azụmaahịa okporoụzọ ndị ụtụisi.
  9. Lee ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Ebonyi Steeti

    Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi Steeti

    Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Steetị ndị dị n’Ọwụwa Anyanwụ bụ nke BBC Igbo na-ahazi amalitela ka na-aga n'ihu.

    Nke taa bụ Fraịde 27 Jenụwarị 2023 ga-adị n'etiti ndị na-azọ ọkwa na steeti Ebonyi.

    Ụfọdụ n'ime ndị a gụnyere;

    Ifeanyi Chukwuma Odii na-azọ n'aha pati Peoples Democratic Party (PDP).

    Adol-Awam Chris ji ọkọlọtọ pati New Nigeria People’s Party (NNPP)

    Benard Ifeanyi Odoh na-azọ n'aha All Progressives Grand Alliance (APGA).

  10. Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Ebonyi Steeti

    Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo! Anyị na-abata gị n'ọgbakọ nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Ebonyi Steetị taa bụ Fraịde 27 Jenụwarị 2023.

    Ngwa, buru oche bịa ka ị nụrụ ihe ha ga-ekwu banyere ọchịchị ha na-azọ.

  11. Agaghị m esonyezi na nrụrịtụka maka ọnwụ Nna m ukwu Ikonne - Enyinnaya Nwafor

    Aha onyonyo, Agaghịzị m esonye nrụrịtaụka BBC Igbo dịka m na-aga ikwanyere nna m ukwu ugwu

    Enyinnaya Chima Nwafor na-azọ ọkwa gọvanọ Abia steeti n'aha Young Progressives Party (YPP) esonyezighi na nrụrịtaụka BBC Igbo Debate 2023) maka ọnwụ Ikonne bụ ogbo ya nke PDP, iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

    O kwuru na dịka nwata a zụrụ azụ na ọ gaghị abụ ihe ziri ezi ịnọ na-akarọ ọha atụmatụ ọchịchị ya ebe nna ya ukwu lara mmụọ.

  12. Uchenna Ikonne na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti anwụọla

    Uchenna Ikonne na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti

    Ebe foto si, Uchenna Ikonne

    Ọkammụta Uchenna Eleazar Ikonne ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party PDP azọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti alaala mmụọ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị 2023.

  13. Ngozika Gladys Johnson Ogbuneke

    Ngozi Johnson Ogbuneke na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti

    Ebe foto si, Ngozi Johnson Ogbuneke

    Ngozi Johnson-Ogbuneke ji ọkọlọtọ Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steetị.

    Ọ bụ onye dọkịta na-ahụ maka ịgba ọkpụkpụ na mba Briten.

    Nkwa ndị o kwere:

    • Aga m eme ka agụmaakwụkwọ praịmarị bụrụ n’efu, ebe m ga-ewepu 25% n’ụgwọ akwụkwọ sekọndịrị
    • Anyị ga-eji ụzọ dị iche iche emepụta ọkụ latrik dịka n’ikuku na-elekwasịghị anya na gọọmentị etiti.
    • Anyị ga-emezi ụdọ ọkụ latrik ndị nke mebiri emebi, ma rụọ ndị ọhụrụ.
    • Aga m ewulite ọnọdụ obibi ndụ ndị ọrụ nchekwa ọkachasị ndị uweojii. Anyị ga-eleba anya n’okwu ndị ọchịehi ka ndị ọrụ ugbo nwee ike ị ga n’ọrụ ha.
    • Ana m arịọ ndị Ipob ka ha soro nzọm ụkwụ onyendu bụ Nnamdi Kanu, onye sị na o ji ụzọ udo na-achọ nnwereonwe.
    • E nwere ụzọ dị iche iche ndị Igbo nwereike iji nwere onwe ha dịka azụmaahịa, mmepe obodo, akụ ruo ụlọ, ọ bụghị site na tigbuo zọgbuo.
  14. Emeka Nwamkpa

    Emeka Nwamkpa na-azọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti

    Emeka Nwamkpa ji aha Accord Party (AP) na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti.

    Ọ bụ onye ụkọchukwu n'ogogo Bishọp.

    Nkwa ndị o kwere:

    • Anyị ga-etinye ọnọdụ gbata gbata n’okwu agụmaakwụkwọ n’Abia Steeti
    • Anyị ga-emezi ụlọọrụ ndị mebiri emebi ma rụọ ụlọọrụ ndị ọhụrụ, iji kewapụta ọrụ nye ndị mmadụ.
    • Anyị ga-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa atọ n’ime otu ọnwa iji kwụchapụ ụgwọ niile e ji ha kamgbe.
    • Anyị ga-enye ndị ọrụ nchekwa ngwa ọrụ ruuru ha ma chụọ mpụ ọsọ erughi ala.
    • Ọ bụ eziokwu na mmegbu dị n’ebe ndị Igbo nọ, ọ ga-adị mma ka ndị otu na-achọ nwereonwe ha banye n’ọchịchị Naịjirịa, ọ ga-eme ka ha nwee ohere imezi mpaghara ọfụma ma kwuo uche ha.
  15. Nnenna Lancaster Okoro

    Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti

    Ebe foto si, Nnenna Lancaster-Okoro

    Nnenna Lancaster Okoro nke Peoples Redemption Party (PRP)

    Ọ bụ onye ọkaiwu na-ahụ maka agbata mba na ibe ya (border)

    Nkwa ndị o kwere;

    • Anyị ga-enyochapụta ndị ọrụ adịgboroja niile nọ n’Abia chụọ ha n’ọrụ ma kwụọ ndị ọrụ niile ụgwọ e ji ha.
    • Anyị ga-achọpụta ụzọ ndị ọzọ e si enweta ọkụ latrik dịka ikike anyanwụ, nke si n’ikuku na ndị ọzọ na-abughị i che ka gọọmentị nye anyị ọkụ latrik.
    • Ọchịchị m ga-emezi ndị uweojii ọfụma ka ha were obi ha rụọ ọrụ n'ihe banyere nchekwa.
    • Aga m ehiwe otu nchekwa ime obodo a kpọrọ 'vigilante' ma lezie ha anya ọfụma.
    • Anyị ga-akụziri ndị mmadụ usoro ha ga-eji echekwa onwe ha, ma gbaa ama n’ihe ọjọọ ọbụla na-eme na gburu gburu ha
    • Agaghị achọ ka anyị taa ahụhụ anyị tara n'oge agha Biafra, aga m achọ ka anọkọọ ọnụ kpaa nkata maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo.
    • Dịka nwaanyị, aga m agba mbọ were obi omeala dịka nwaanyị kpezie udo dị n'etiti ndị iwe dị n'obi.
  16. Mascot Uzor Kalu na nkwa ndị o kwere

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti

    Ebe foto si, Mascot Uzor Kalu

    Mascot Uzor Kalu ji ọkọlọtọ Action Peoples Party (APP) azọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti.

    Ọ bụ onye oji ego achụ nta ego nakwa onye azụmaahịa doro anya.

    Nkwa ndị o kwere:

    • Anyị ka ekewapụta ọrụ puku iri anọ n’ime afọ anọ - puku iri n’ime otu afọ.
    • Anyị ga-akpọ ndị ọrụ bekee oku chọpụta ego ole e ji ha ma kwụọ ha ụgwọ niile e ji ha.
    • Anyị ga-akwụ ndị ọrụ ụgwọ n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa ọbụla.
    • Anyị ga-eme nyocha banyere etu e si emefu ego niile a na-enwete n’Abia Steeti.
    • Nsogbu ụzọ dị n'Abia ọkachasị n'Aba bụ nsogbu idemmiri, anyị ga-akpọta ndị ọkachamara ka ha tọọ ntọala ebe mmiri gaa na-esi asụpụ.
    • Anyị ga-akụziri ndị nchekwa ime obodo ọrụ ọfụma ma kwadoo ha site n'inye ha ngwaọrụ.
    • Onye Igbo ọbụla bụ onye Biafra, nsogbu nnwereonwe bụ mmegbu dị n'akụkụ ndị Igbo na Naịjirịa, ọ bụrụ na ndị ọchịchị Igbo na-arụ ọrụ ha ọfụma, ọchịchọ nwereonwe agaaraghị ị na-arị elu etu a.
    • Ọ bụ gọvanọ Abia Steeti kwesịrị ịga njem ka e nwee ike tọhapụ Kanu bụ onyendu Ipob.
  17. Lee ndị so na nrụrịtaụka maka ọkwa Gọvanọ Abia Steeti

    Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ Abia Steeti

    Nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ Steetị ndị dị n’Ọwụwa Anyanwụ bụ nke BBC Igbo na-ahazi amalitela taa.

    Ọ ga-adị n’etiti ndị na-azọ ọkwa na steeti atọ gụnyere Abia, Enugwu na Ebonyi malite taa bụ Wenezde 25 Jenụwarị, Fraịde 27 Jenụwarị nakwa Sọnde 29 Jenụwarị, 2023.

    Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n’Abia Steetị ga-awụchi n’ọgbọ taa bụ Wenezde 25 Jenụwarị ịzara ọnụ ha ma kọọrọ ndị Abia ihe a ga-eji atụrụ ha vootu n’oge ntuliaka.

    Ụfọdụ ndị a na-atụ anya ga-esonye na nrụrịtaụka a gụnyere (na-esoghi usoro ọbụla);

    Gregory Ibe nke All Progressive Grand Alliance (APGA)

    Mascot Uzor Kalu nke Action Peoples Party (APP)

    Ngozi Johnson-Ogbuneke nke Social Democratic Party (SDP)

    Enyinnaya Chima Nwafor nke Young Progressive Party (YPP)

    Alex Otti nke Labour Party (LP)

    Nnenna Lancaster Okoro nke Peoples Redemption Party (PRP)

    Emeka Nwamkpa nke Accord Party (AP)

  18. Ndewo oooo! Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ nrụrịtaụka BBC Igbo

    Ọgbakọ nrụrịtaụka BBC Igbo maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti

    Obi ọma ka BBC Igbo ji anabata gị na nrụrịtaụka ndị na-azọ ọkwa Gọvabọ n'Abia Steetị.

    Buru oche gị bịa ka ị nụrụ nkwa ndị a na-ekwe gị ma ọ bụrụ ha merie na ntuliaka afọ 2023.