Abia PDP Primaries: Ahọpụtala Okey Ahaiwe dịka onye ga-eji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa Gọvanọ Abia Steeti

Okey Ahiwe

Ahọpụtala Okey Ahaiwe pnye bụbu onyeisi ndị ọrụ gọọmentị Abia Steeti dịka onye ga-anọchite otu pati Peoples Democratic Party (PDP) na ntuliaka gọvanọ Abia Steeti.

Na ntuliaka e mere taa ka Ahaiwe nwetara vootu 469 iji merie Ude Oko-chukwu na Lucky Igbokwe ndị ha na ya soro zọọ ya bụ ọkwa dịka ha nwetara vootu 12 na otu na otu.

Ndị ọzọ soro zọo ya bụ ntuliaka bụ onye bụbụ onyeisioche pati a bụ Emma Nwaka onye nwetara vootu efu ebe onye bụbu onye omeiwu nta bụ Sampson Orji nwetara vootu 11.

A tụrụ vootu 516 ebe vootu 12 bụ nke agụpụrụ agụpụ.

Ndị na-eme ntuliaka imeụlọ PDPNdị na-eme ntuliaka imeụlọ PDP

Ugo eberela na mgbagbu dịka ndị otu PDP Abia steeeti gbakọrọ n'ama egwuregwu 'Umuahia Township Stadium' taa bụ Satode maka ntuliaka imeụlọ mmegharị iji họpụta onye ga-efere pati ha ọkọtọtọ na ntuliaka na-abịa dịka Uchenna Ikonne jibu ikike ahụ nwụrụ anwụ.

Ikonne, onye pati ahụ họpụtaburu ka ọ zọọ ọkwa gọvanọ n'aha pati ha na ntuliaka 2023 nwụrụ n'izuụka abụọ gara aga.

Ndị isi pati ha si Abuja nke gụnyere Gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki awuchiela n'amaegwuregwu ahụ maka ịhụ na ntuliaka ahụ gara n'anya ya.

Ka ọ dị ugbua, a kpọpụtala ndị na-azọ ya bụ ọkwa ka ha gwa ndị pati ahụ okwu tupu a tụọ vootu.

Ndị na-eme ntụliaka otu PDP
Ndị na-eme ntụliaka
Amaegwuregwu 'Umuahia Township Stadium'

Otu PDP nyere mmadụ ise ikike ịzọ onye ga-efere ha ọkọlọtọ

Govanọ Godwin Obaseki na ndị isi pati PDP
Nkọwa foto, Govanọ Godwin Obaseki nke Edo steeti bu onyeisi kọmiti na-ahazi ntuliaka mmegharị ahụ

Otu PDP nyere mmadụ ise ikike ịzọ ọkwa onye ga-efere ha ọkọlọtọ na ntuliaka imeụlọ ha a na-eme n'Ụmụahịa n'ụbọchị Satode nke abalị anọ ọnwa Febụwarị afọ 2023.

Ha gụnyere Okey Ahiwe, Ude Oko Chukwu, Emma Nwaka, Sampson Orji na Lucky Igbokwe.

Mmadụ atọ bụ Ezinwanyi Jonah, Bob Ogu na eric Opah wepụrụ onwe ha na ya bụ ntụliaka ma dọnyere Okey Ahiwe ukwu.