Etu e si wakpoo Bernard Odoh jị pati APGA azọ ọkwa gọvanọ Ebonyi Steeti ma gbuo otu onye

ụgbọala ndị omekome gbara ọkụ

Ebe foto si, Charles Otu

Ndị omekome awakpoola ụgbọala Bernard Odo bụ onye jị ọkọlọtọ otu pati All Progressive Grand Alliance (APGA) azọ ọkwa gọvanọ Ebonyi steeti ma gbuo ọkwọọ ụgbọala ya n'abalị tọzde.

Odoh gwara ndị ntaakụkọ sị, " Ọ bụ ndị a kwụrụ ụgwọ ka ha gbuo m kpara arụ a. ha gburu ọkwọọ ụgbọala m ma jiri mgbọ egbe gbakasịa ahụ ụgbọala m".

N'otu aka ahụ ka onye na-ahụ maka mgbasaozi Odoh bụ Charles Otu kwuru na ndị omekome a gburu onye ọkwọọ ụgbọala ya bụ Ogbonna Francis ma merụọ onye uweojii so ha ahụ na ya bụ ihe mere.

Otu kwuru na ọ bụ n'ihe dịka elekere itou nke abali ka ya bụ ihe mere n'okporoụzọ dị nso ụlọ akwụkwọ Ntezi nke di n'okpuruọchịchị Ishielu nke dị n'Ebonyi Steeti.

Ihe otu n'ime ndị awakporo gwara BBC Igbo

otu onye agbatara egbe na-anata ọgwụgwọ

Ebe foto si, Enyinna Omoke

Otu onye sọ n'ahịrị ụgbọala mgbe ndị omekome a wakporo Odoh bụ Friday Nweke kwuru na ndị omekome a merụrụ ya ahụ ebe ọ dị ukwu n'aka ya.

Ya na BBC nwere mkparịaụka dịka ọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.

O kwuru sị, " Anyị si Agba alọta mgbe ndị oji egbe anyị amaghị ebe ha si bidoro gbawa anyị egbe, ha ji AK-47 na pump action. Ha gbatara m egbe n'aka".

Otu onye agbatara egbe na-anata ọgwụgwọ

Ebe foto si, Mkpuma Enyinna Omoke

Bernard Odoh gwara ndị nsonso ya ka ha deere juu ma kwuo ka ndị ọrụ nchekwa mee nyocha ha ma jide ndị kpara ya bụ arụ.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steti ahụ n'ekwe ntị maka ya bụ ihe kama ọzaghị.