Lee ndị nwereike ịnọchi Uchenna Ikonne ịzọ ọkwa Gọvanọ Abịa Steeti na PDP

Bob Ogu, Christopher Enweremadu, Okey Ahiwe, na Uche Ikonne

Ebe foto si, Bob Ogu/Christopher Enweremadu/Okey Ahiwe/Uche Ikonne

Nkọwa foto, Bob Ogu, Christopher Enweremadu, Okey Ahiwe, na Uche Ikonne larala mmụọ
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) nke Abia Steeti amalitela ịchọ onye ọzọ ga-anọchi anya ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-enwe na steeti ahụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị afọ a.

Nke a na-abịa dịka onye ha wepụtaburu bụ Ọkammụta Uchenna Eleazar Ikonne lara mmụọ n'izuụka gara aga.

Dịka iwu ntuliaka si kwuo, onye ọbụla na-azọ ọkwa ọchịchị ma nwụọ tupu ụbọchị ntuliaka, otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ nọ na ya ga-eme ntuliaka imeụlọ ọzọ ngwangwa iji wepụta onye ga-anọchi ya.

N'ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 29, ndị isi PDP n'Abia Steeti nwere ọgbakọ n'ụlọ Gọvanọ Okezie Ikpeazu dị n'Umuobiakwa, Obingwa, iji kpaa etu ha ga-esi hazie ntuliaka imeụlọ ọzọ.

N'ọgbakọ ahụ ka ha nọrọ kweta na ya bụ ntuliaka imeụlọ ga-adị n'ụbọchị Satọde, abalị anọ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2023.

Ha kpebikwara na ọ ga-abụ n'okpuru ọchịchị Isialangwa North, ebe Uchenna Ikonne larala mmụọ si, ka a ga-esi ewepụta onye ọhụrụ ga-eji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa Gọvanọ.

Mana kedụ onye maọbụ ndị a na-eche ga-azọ ọkwa a?

BBC Igbo kpọtụụrụ ụfọdụ ndị ma maka ndọrọndọrọ ọchịchị n'Abia steeti, nke gụnyere ụfọdụ ndị pati PDP, ha wee kwuo na aha mmadụ atọ kacha ada ụda na ndọrọndọrọ a bụ: Okey Ahiwe, Bob Ogu na Christopher Enweremadu.

Okechukwu Ahiwe

Okey Ahiwe

Ebe foto si, Okey Ahiwe

Nkọwa foto, Okechukwu Ahiwe bụ onyeisi ndịọrụ Gọvanọ Okezie Ikpeazu ugbua

Okey Ahiwe bụ onye oji ego achụ ego na ngalaba mmadụ agbịdị na ikuku gaasị, tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

O ji ọkwa onyeisi ndị ọrụ (Chief of Staff) nke Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazu.

Ọ bụ onye Umuire, Eziama Ntigha nke dị n'okpuru ọchịchị Isiala Ngwa North.

"Tupu Ọkammụta Uche Ikonne emerie ntuliaka imeụlọ PDP, ọtụtụ chere na Okey Ahiwe ga-azọ ya bụ ọkwa," otu onye PDP na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo.

Onye ahụ kọwara Ahiwe dịka onye nwere umeala na-anaghị eme oke mkpọtụ.

Bob Chiedozie Ogu

Bob Ogu

Ebe foto si, Bob Chiedozie Ogu/Facebook

Bob Ogu bụ onye ji ọkwa Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ n'Aba Steeti ugbua.

Ọ bụ ọkaiwu, ma bụrụkwa onye bụbu onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu a kpọrọ Nigeria Bar Association, nke ngalaba Aba n'abịa Steeti, n'afọ 2017.

O nwekwara ọzụzụ na ngalaba nhazi obodo nke bekee na-akpọ 'Urban and Regional Planning'.

Christopher Enweremadu

Christopher Enweremadu

Ebe foto si, Christopher Enweremadu

Nkọwa foto, Christopher Enweremadu

Christopher Enweremadu arụbuola ọrụ dịka onyeisi ụlọ omeiwu nke Abia Steeti.

Ọ rụbukwara ọrụ dịka onyeisioche okpuru ọchịchị Isiala Ngwa North.

Nna ya bụ Bernard Onyenguzo Enweremadu bụbu Eze ọdịnala nke Ngwa-Ukwu ma bụrụkwa onyeisi ndị Eze niile na mpaghara Ngwa niile tupu ọ laa mmụọ.

Ugbua, Chris Enweremadu bụ Kọmishọna na-ahụ maka okpuru ọchịchị nakwa echichi na gọọmentị Abia Steeti

Ndị ọzọ...

Gabriel Onyendilefu na Ncheta Omerekpe

Ebe foto si, Gabriel Onyendilefu/Ncheta Omerekpe

Nkọwa foto, Gabriel Onyendilefu na Ncheta Omerekpe

Aha mmadụ abụọ ndị gwara BBC Igbo okwu kpọrọ banyere ịzọ ọkwa Gọvanọ na PDP Abia steeti bụ Gabriel Onyengelefu na Ncheta Omerekpe.

Onyengelefu bụ onye rụburu ọrụ dịka Onye mgbakọ ego (Accountant General) nke gọọmentị Abia Steeti, nakwa Kọmishọna hụrụ maka ọdịmma okpuru ọchịchị na echichi.

Mana ọ bụ onye Umuwaocha Ikem Nvosi nke dị n'okpuru ọchịchị Isiala Ngwa South.

"N'ihi na ọ bụghị onye Isiala Ngwa North kpọmkwem, ọ dịghị m ka ọ ga-enweta nkwado ịnọchị anya Prof Ikonne," onye ọzọ na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru.

N'aka nke ọzọ, Ncheta Omerekpe so zọọ ntuliaka imeụlọ PDP nke Uche Ikonne larala mmụọ meriri.

Mana tupu ụbọchị ahụ a ga-eme ntuliaka, Omerekpe na mmadụ isii ndị ọzọ so ya azọ ọkwa ahụ kwuru na ha ewepụla aka na ya bụ ndọrọndọrọ.