Awkuzu Sars: Ndị uweojii Anambra amalitela ịchọ onye otu ha maka ebubo dakwasịrị ya

Ebe foto si, Getty Images
N’ozi ọhụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n’ụbọchị Mọnde, ọ kpọpụtara ha otu onye otu ha nke a sị bụ Emeh Nnamdi Daniel dịka onye a na-achọ achọ n’ihi ebubo so okwu ha na-enyocha ugbua.
Ikenga kọwara na Emeh dị afọ 26 kpara agwa megidere usoro ọrụ ha dịka: iji ngwa ọgụ n’ụzọ megidere iwu, nzufu ego, ịtetọ aha mmadụ, nrụrụ aha nakwa iji ụzọ aghọghọ gosi onwe ya dịka onye ọzọ.
O kwuru “Emeh na-efe ala nna ya n’ụlọọrụ ndị uweojii Anambra a bụrụla onye aha ya nọ n’okwu a na-enyo enyo ugbua”
“Anyị na-agwa ọha ndị mmadụ ka ha wetere ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla nọ ha nso ozi ma ha hụ ya maọbụ kpọọ anya n’akara ekwentị anyị bụ 07039194332 nakwa 08039334002.”
Ọ kọwara na nke a ga-enyereaka na nwụchị ya dịka ọ kwuru na ha agaghị agbapụ onye ọbụla wetere ozi a afọ.
Nke a na-abịa dịka ebubo ọhụrụ dapụtara na soshal midia nke kpọpụtara aha Eme ma kwuo na a ga-agbapu ya afọ n’ihe ọjọọ a sị o merela.
Ndị na-ebo ebobo kwukwara na ya bụ nwaamadị bụ onye ọkachamara n’okwu ihe Kọmpụta dịka ha kwuru na ọ tụọrọla ọha asị banyere ebe ọ nọ ugbua.
Cheta na ọba ozi ebe ebubo ọhụrụ si malitere kemgbe izu gara aga malite iwepụta ebubo aghara aghara banyere ndị uweojii n’Anambra steeti.
Ebubo ndị a gụnyere na ha atọrị ndị mmadụ, anapụ ha ego dị n'akpaego n'ụlọakụ ha ma memila ha nakwa ihe ndị ọzọ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ihe gọvanọ Chukwuma Soludo na-ekwu maka okwu a

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/facebook
Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo enyela ọkaịwu ukwu nke steeti ahụ iwu ka enyochagharị ikpe niile gbasara ebubo mmegide ikike dịịrị onye nke emere na Police Zone 13 dị n'ụkpọ na nke ndị Rapid Response Squad dị n'Awkuzu.
Nke a nọ n'akwụkwọ ozi ọdeakwụkwọ Gọvanọ bụ Christian Aburime wepụtara dịka a ebubo na-efegharị na soshịal Midịa nke na-atụ aka n'ihe gbasara ịkpọchị ndị mmadụ n'ụzọ ezighị ezi, ịtọ mmadụ, igbụ ọchụ ya na ire akụkụ ahụ mmadụ n'aka ndị uweojii.
Soludo ji ohere a gwa ndị mmadụ ka ha dere duu n'ihi na gọọmentị di njikere ịhụ na onye ọbụla aka ya dị na mpụ ndị a ga-anata ụgwọ ọ kwesịrị.
Anyị na-achọ CSP Patrick Agbazue, SP Nwode Nkeiruka, Harrison Atama - Force Hqtr
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Isiụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa enyela iwu ka ndị uweojii Anambara steeti atọ a na-ebo ebubo na ha atọrị ndị mmadụ, napụ ha ego dị n'akpaego n'ụlọakụ ha ma memila ha wuchie n'isiụlọọrụ ha n'ụbọchị Fraide maka nnyocha.
Nke a na-abịa dịka akụkọ fegharịrị na soshal midia nke na-ebo ebubo na ndị mmadụ ụweojii atọ; CSP Patrick Agbazue, SP Nwode Nkeiruka na Harrison Atama na-atọrọ ndị mmadụ, boo ha ebubo ụgha, ma napụ ha maọbụ ndị ezinaụlọ nnukwu ego na ụgbọala n'ike ma gbuo ha na-akpụpụghị ha ụlọikpe.
Ebubo ahụ kwụkwara na ndị a na-egbu ụfọdụ ndị a , bọkasị a anụ ha resị ndị na-agba mgbere anụ mmadụ.
Ebubo ndị a na-apụta ihe abalị atọ ndị bi na Nnewi, Anambara steeti boro ebubo na ndị uweojii 'Area Command' Nnewi gbagburu otu nwoke enweghị ihe o mere na nso ogige ha.
Agbazue bụ onyeisi na-achịkọta ndị uweojii gbatagbata a kpọrọ "Rapid Response Squad (RRS), nke Anambara State SP Nwode bụ ọnụ na-ekwuru isi ụlọọrụ ndị uweojii ngalaba 'Zone 13 HQs, Ukpo-Dunukofia, ebe Inspector Harrison Akama bụ onye uweojii sọ arụ ọrụ na otu gbata gbata nke Anambara.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjriịa bụ Olumuyiwa Adejobi wepụtara n'akara ya na Twitter na abalị Fraide, o kwuru na akụkọ ahụ erula onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Usman Alkali Baba ntị dịka o kwuru na o malitela itinye anya na ya bụ okwu.
Adejobi sịrị: "A kpọọla ndị uweojii a- CSP Patrick Agbazue, onye na-achịkọta ngabala gbagbata 'Rapid Response Squad (RRS), nke ndị uweojii Anambara ; SP Nwode Nkeiruka,bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Zone 13 HQs, Ukpo-Dunukofia, na Inspector Harrison Akama so RRS arụ ọrụ , oku ka ha bịa n'isis ụlọọrụ ndị uweojii dị na Louis Edet House, Abuja taa bụ Fraide maka mmalite nnyocha n'ihi ebubo kara aka nke e boro megide ha iji mata ma na ebubo ndị ahụ abụ eziokwu., ebe a ga-ehiwe otu ga-enyocha okwu ahụ n'izụka abụọ, dịka onyeisi ndị uweojii Naijiria si nye ntuziaka."
'A na-achọ nwa nwanne nne m kemgbe Juun 2022
Dịka akụkọ ahụ na-efegharị, ụfọdụ ndị sị ya bụ ihe metụtara ha ekwuola etu ndị uweojii a si nwụrụ ndị nke ha ma napụ ha akatamkpo ego ha dowere n'ụlọakụ.
Ụfọdụ boro ebubo na ha jichiri onye nke ha ma meche gbuo ha, ma werekwa ekwentị ha na-ezi ndị metụtara ha ozi ịna ego ka ha gbufuchara ndị onye nke ha.
Otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na , 'Nwa nwanne nne m na-efu efu kemgbe ọnwa Juunụ afọ 2022."
"E ji ekwentị ntị ya zitere m ozi, sị m ka gwa ezinaụlọ ya ka ha weta nde naira abụọ, emeghị etu ahụ na anyị agaghị ahụ ya ọzọ."
Ihe Adejobi kwuburu maka okwu a
Ọ sịrị, " Isiụlọrụ ndị uweojii ma maka okwu a. Anyị na-elebanye ya anya dịka ọ bụ okwu dị mkpa. Onyeisi ndị uweojii n'onwe ya etinyela anya na ya. Anyị na-ele anya ikwu maka ya . Bikonụ dere nụ juu dịka anyị na-eme ihe kwesịrị maka ya."
Ụfọdụ boro ebubo na ụndị nke a na-efu efu n'Anambra steeti bụ ndị ezinaụlọ ha amaghị maka ha nọ n'aka ndị uweojii ha sị nọchịrị James Nwafor dịka ahụghịkwa ha anya ọzọ.
Cheta na aha onye uweojii n'Anambra steeti aha ya bụ James Nwafor malite iwu n'afọ 2020 dịka e boro ya ebubo igbu ndị mmadụ n'ụzọ megidere iwu nakwa imekpa ndị mmadụ ahụ.

James Nwafor bụ onye Ebonyi steeti, mana ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba Sara n'Awkwuzu, Anambra tupu ọ laa ezumike nka n'ọrụ ndị uweojii n'afo 2018.
E boro ya ọtụtụ ebubo metụtara igbu, ịtọrọ na ịmemina ndị mmadụ. Ndị uweojii nọrọ ebubo ndị a mana enweghị ihe si n'ime ya pụta.
N'oge ngagharịiwe EndSars na 2020, aka chịburu Anambra bụ Willie Obiano kwuru na a chụọla nwaamadị ahụ n'ọrụ.
Ihe ụmụafọ Naịjirịa na-ekwu
Akụkọ a akpatala ọtụtụ okwu nakwa nkatọ dịka ụmụ Naịjirịa na-arụ ndị uweojii aka ma na-ekwu na kemgbe afọ ole m ole a kpowara oku itinye anya n’usoro ọrụ nakwa agwaa ndị otu uweojii na enweghị ihe na-apụta n’ime ya.
Ebe ụfọdụ na-ekwu na ha enweghi ntụkwasịobi na nnyocha a ndị uweojii kwupụtara na ha na-eme n’elu okwu a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ndi ọzọ na-akpọkwa gọvanọ steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo oku ka o tinye ọnụ n'anya na ya bụ okwu na-adapụta na steeti ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4

Ebe foto si, Getty Images
End Sars: Ebubo mmekpa ahụ n'aka ndị uweojii Naịjirịa
Cheta na n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche na ndị ntorobịa mere ọtụtụ ngagharịiwe nke ha kpọrọ ‘EndSars’ n’ọnwa Ọktoba nke afọ 2020 megide ndị uweojii Naịjirịa ma mee ọtụtụ mkpesa banyere mmekpa ahụ n’aka ndị uweoji Naịjirịa.
Ọtụtụ boro ndị uweojii ebubo ọkachasị ndị nke ngalaba ndị uweojii a kpọrọ, Special Anti-Robbery Squad (Sars) dịka e kwuru na ha na-egbu ndị nkiti aghara aghara, a tọrọ ụfọdụ, emekpa ndị mmadụ ahụ ma ghara ịtụ iwu Naịjirịa metụtara ikike dịrị onye egwu.
Mkpesa ndị a riri elu dịka ọha ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka achụsasị ngalaba Sars a ma lebeanya n'etu ndị uweojii si ekpasa ndị nkiti agwa na Naịjirịa.
Onyeisiala Muhammadu Buhari mechara machie ngalaba ndị uweojji ahụ, bụ nke ọtụtụ eboro ebubo mkpekpa ahụ, mwakpo nakwa ihe ndị ọzọ n’ụbọchị 11 nke ọnwa Ọktoba, 2020.
Ngagharịiwe EndSara a biri n’ike n'ụbọchị 20 nke ọkwa Ọktọba 2020 mgbe ndị agha Naịjirịa gbara ndị nkiti aghara agahra n’akụkụ Lekki Tollgate Legọs steeti.
Okwu si ihe dapụta butere ọtụtụ nkatọ n’aka ụmụ ụwa dịka steeti dị iche iche nke gụnyere Legọs steeti hibere kọmịtịị lebara anya n’ebubo ndị mmadụ ji maka ya kpalite ngagharịiwe.
Ụfọdụ steeti mechara kwụọ ndị ezinaụlọ a sị ndị uweojii gburu maọbụ mekpaa ndị nke ha ahụ ebe steeti ndị ọzọ egeghị ntuziaka kọmịtịị ndị ahụ nyere ntị.
Mana agbanyeghị na a machiri ngalaba Sars ahụ, akụkọ mmekpa ahụ, ogbugbu nakwa mwakpo na-ezighi ezi n’aka ndị uweojii Naịjirịa ka bụkwa ihe a na-anụkarị n’akụkụ dị iche iche na Naịjirịa ruo ugbua.









