Gịnị ka gọọmentị Enugwu Steeti maka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ?

Ebe foto si, Other
Ndị bi na mpaghara dị icheiche n'Enugwu Steeti na-eti mkpu akwa arịrị maka ọnọdụ nchekwa bụ nke ha sị na ọ na-akawanye njọ kwa izuụka na steeti ahụ.
Ntọrị mmadụ, izu ohi, mwakpo ndị ojiegbe, ọgụ ndị otu nzuzo, dgz, ihe ndị a ka ụfọdụ ndị bi n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ na-emezi ha ụra aga n'anya.
Akụkọ pụtara n'ụbọchị Tọzde, etu ndị njem si gbabaa n'ime ọhịa, ma ndị okenye ma ndị ntorobịa, n'akụkụ okporoụzọ Opi Nsukka, dịka e kwuru na ndị ntọrị mmadụ wakporo ụfọdụ ndị njem n'okporoụzọ ahụ.
Onyonyo ọzọkwa pụtara na Soshal Midia n'otu ụbọchị Tọzde ahụ, nke kwuru na ndị ntọ tọọrọ mmadụ abụọ na mpaghara 9th Mile, n'ihu ụlọọrụ 'Nigera Brewery'.
Otu nwoke aha ya bụ John Udenta, gwara BBC Igbo, na ọ bụ obere ihe ka ya ji gbalahụ ndị ntọ n'ụbọchị Mọnde, Jun26, dịka ya na-aga na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka bụ ebe ọ na-akụzị nkuzi.
"Mgbe anyị na-erute n'ebe Api, Opi, anyị hụrụ ụgbọala SUV abụọ ụzọ ha ghecha oghe, ọ bụrụ na ndị ntọ akpụrụla ndị niile nọ n'ime ụgbọala abụọ ahụ tinye isi n'ọhịa," Udenta kwuru.
Ndi bikwa na mpaghara Engwu kọọrọ BBC Igbo etu ha si achị obi n'aka oge niile ma ndị otu nzuzo busowe onwe ha agha.
Ndị otu nzuzo a na-abụkarị ụmụakwụkwọ na-agụ n'ụlọakwụkwọ dị elu dị icheiche dị n'Enugwu nke gụnyere 'Enugwu State University of Technology' (Esut), 'Institute of Management and Technology' (IMT), 'University of Nigeria Enugu Campus' (Unec), 'Enugu State College of Education Technical (ESCET) na ndị ọzọ.
'Mmachi 'sit-at-home' mere ka nchekwa kawanye njọ' - Onye bi Enugwu

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu onye gwara BBC Igbo okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ dị ka ọnọdụ nchekwa ọ kawanyere njọ kamgbe Gọvanọ Peter Mba machiri ọnọdụ 'sit-at-home' kwa ụbọchị Mọnde na steeti ahụ.
Cheta na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob, tinyere iwu mmachi mkpaghara kwa ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile, kamgbe ọnwa Ọgọst afọ 2021.
Ha mere nke a iji gosipụta iwe ha n'oge ahụ maka etu gọọmentị Naịjirịa si jichie onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu ma tinye ya na mkpọrọ n'Abuja.
Mana n'ụbọchị e duru ya n'iyi ọrụdịka gọvanọ Enugwu Steeti n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, Gọvanọ Peter Mbah kwuru na ya akagbuola iwu sit-at-home, ma gwa ndị mmaọ̄ụ ka ha na-apụta na-akpagharị ụbọchị Mọnde ọbụla.
Peter Mbah kwere nkwa na ya etinyela atụmatụ nchekwa zuru oke iji chekwaa ndụ ndị mmaọ̄ụ n'ụbọchị Mọnde niile, mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ dịka ihe ọ na-akwanye njọ kama ịkawanye mma.
"Mwakpo na ntọrọ mmadụ amalitekwala na mpaghara 'Four Corner Udi, Opi Nsukka, Enugwu Ezike, Ugwogo Nike, na ebe ndị ọzọ," onye ahụ gwara BBC.
"Ị sị m kwuo, aga m asị na ọnọdụ nchekwa ka njọ," ka o kwuru.
Ihe ndị uweojii na-ekwu maka ọnọdụ a

Ebe foto si, Enugu Police
N'ụbọchị 25 nke ọnwa Jun, ndị uweojii Enugwu steeti gosiri ọha obodo ọtụtụ ndị ha sị na ha jidere n'ihi ịkpa arụ dị icheiche nke gụnyere izu ohi, ịtọrọ mmadụ, ịnọ n'otu nzuzo nakwa ihe ndị ọzọ.
Daniel Ndukwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu kwuru na Kọmishọna ndị uweojii bụ Ahmed Ammani enyela iwu ka ndị uweojii ghara izu ike ruo mgbe ha zachapụrụ ndị ekperima niile nọ na steeti ahụ.
"Anyị dị njikere ị ga n'ihu n'ichekwa ndụ na akụnụba ndị niile bi na steeti a, mana ihe anyị na-arịọ bụ ka ndị mmadụ na-ewetara anyị ozi gbasara ndị ekperima nakwa ọrụ ha n'oge iji nyere anyị aka," Ndukwe kwuru.
O kwere nkwa na ndị uweojii ga-echekwa onye ọbụla wetaara ha ozi nke ọma ma hapụ ịgba ya n'anwụ.









