Pinnacle Oil Enugu: Ndị ojiegbe ọ gbara ụlọọrụ a ọkụ? Lee ihe anyị ma

Kepu kepu pụtara n'ekwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala a kpọrọ Pinnacle Oil dị na New Haven nke Enugwu Steeti n'abalị Tuzde 20 Juun, 2023.
Akụkọ a kwuru na ndị a ji egbe chusasịa ndị mmadụ na gburu gburu ebe a kpọrọ "Last Bus stop New Haven" ma mụnye ụlọọrụ Pinnacle Filling station bụ nke a sị na Gọvanọ Peter Mbah nwe ọkụ.
Mana BBC Igbo mere nyocha ma chọpụta n'ezie na ndị ojiegbe bịara ebe ahụ n'abalị Tuzde, ha gbara nnukwu egbe, chụsasịa ndị mmadụ mana ha agbaghị Pinnacle Filling Station ahụ ọkụ.
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ n'ụtụtụ Wenezde 21 Juun, 2023, onyeisi ụlọọrụ a gwara ya na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọorụ ha mebie ụfọdụ igwe ọrụ ha.
O kwuru na ha chọburu ịgba ya ọkụ mana ha emechaghị mee nke a. Onyeisi ụlọọrụa kwuru na ọ gala mee mkpesa n'aka ndị uweojii.

Anya hụrụ ka ihe si mee
Otu nwoke nọ nso mgbe ihe a mere gwara BBC ihe ndị ọhụrụ dịka mwakpo a na-eme.
N'okwu ya "Anyị nọ n'ọdọahịa anyị n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị Tuzde 20 Juun, 2023 mgbe ụmụokoroọbịa karịrị iri ji ụgbọala abụọ wakporo Pinnacle Filling Station dị na New Havene ebe a.
"Ha kwara mgbọ aghara aghara n'ihe karịrị ọkara awa, gbachịe ụzọ Upper Chime New Haven."
O kwuru na ọ nụrụ ka ndị ojiegbe a na-agwarịta onwe ha okwu ma sị na ebumnobi ha bụ ịgba ụlọọrụ mmanụ ụgbọala ahụ a sị Gọvanọ Mbah nwe ọkụ.
"Ezoro m n'okpuru tebụlụ dị n'ụlọahịa m wee na-ekiri ihe na-eme. Ha chọrọ ịmunye ọdọ mmanụ ụgbọala ahụ ọkụ mana otu n'ime ha kwuru na onwere ike igbu ọtụtụ mmadụ maka na ọ dị nso n'ebe obibi ndị mmadụ"

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
O kwuru na ndị omekaome ahụ jizi iwe mụnye otu ụgbọala nọ ebe ahụ ọkụ ma gbaa ọsọ.
"Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na ndị mmadụ jikọrọ aka gbanyụọ ọkụ ndị ojiegbe mụnyere n'ụgbọala ngwa ngwa ha pụrụ.
Ndịagha na ndị uweojii mechara wuchie ebe ahụ, mana tupu ha na-abịa ndị ojiegbe ahụ apụọla.
Dịka ọ dị ugbua ụlọorụ mmanụ ụgbọala Pinnacle Oil agbaghị ọkụ ọbụla.
Tupu akụkọ a apụta ndị uweojii Enugwu steeti ekwubeghi ihe ọbụla banyere mwakpo a, ọnụ na-ekwuru ha bụ Daniel Ndukwe azabeghị ozi e zigaara ya.
Cheta na Gọvanọ Peter Mbah nke Enugwu steeti nyere iwu ka ndị steeti ya kwụsị ị na-anọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.









