Ihe ndị mere n'ụbọchị Mọnde, Jun 5, dịka gọọmentị Enugwu machiri 'sit-at-home'

Peter Mbah

Ebe foto si, Peter Mbah

Otu n’ime ihe gbara ọkpụrụkpụ Gọvanọ Peter Mbah ji malite ọrụ ya bụ ima ọkwa dara ụda nke machiri ndị mmadụ isonye n’iwu onye nọrọ n’ụlọ e ji ‘sit at home’ mara n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ibu agha megide 'sit at home' n'Enugu dịka o siri kwuo ga-amalite n'ụbọchị Mọnde, abali ise nke ọnwa Juun, 2023.

N’akwụkwọ ozi gọvanọ Mbah kesara n'ụbọchị Satọde abalị atọ nke Juun, ọ gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla ịpụta gaa ebe dị ha mkpa n'ụbọchị Mọnde, maka na gọọmentị etinyela atụmatụ nchekwa zuru oke n'ebe dị icheiche.

Akwụkwọ ozi ahụ gọvanọ binyere aka na ya kwuru sị: "Nke a bụ iji gwa ụlọakwụkwọ, ahịa, ụlọahịa, ụlọọgwụ, ndị ọkwọ ụgbọala, na ọha obodo niile, ka ha cheta na gọọmentị amachiela ma kagbuo ọnọdụ 'sit-at-home na mpaghara niile n'Enugwu steeti."

Aha onyonyo, 'Sit at home' ebiela n'Enigwu? Lee ka ọndọdụ ebe dị
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

N'ụbọchị Mọnde ahụ bụ abalị ise nke ọnwa Jun, BBC kpagharịrị ma hụ etu ihe siri gaa.

Ozi gọọmentị gwara ọha ka ha pụta gaa mkpa ma kwuo:

"Gọọmentị na-adọ mmadụ niile aka na ntị ka ha rube isi na mmachi a. Ndị ọrụ gọọmentị ga na-akpagharị iji hụ na ndị mmadụ rubere isi n'iwu ọhụrụ a. Ụlọahịa ọbụla, ọdọ ụgbọala ọbụla, ụlọọrụ ọbụla, maọbụ ụlọakwụkwọ ọbụla nupuru isi ma kpọchie ogige ha n'ụbọchị Mọnde, gọọmentị nwereike imechi ogige ahụ kpamkpam."

Mana otu nnwereonwe bụ Ipob zipụtara ozi n'ụbọchị Mọnde ahụ bụ ụbọchị Gọvanọ Mbah hibere ka mmachi sit-at-home dị ire, ma kwuo na:

"Anyị na-akwado atụmatụ ya (Peter Mbah) ịkwsụsị 'sit at home', anyị akwụsịla 'sit at home'"

Ha gara n'ihu kwuo:

"Ka Peter Mbah ghara ime ụdịrị ndahie aka ọkamụta Soludo mere nke bụ atụmatụ iji ọrụ nchekwa Naijirịa kwụsịt 'sit at home'... Ya bụ atụmatụ kpụrụ afọ n'ala n'Ebonyi, Imo nakwa Anambra steeti."

"Hapụ 'sit at home' ka ọ nwụọ ọnwụ chi ya."

N'o aka ahụ otu, Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob), Ohaneze ndigbo, Bịshọpụ ụka Katọlịk na Nsukka bụ Catholic Bishop of Bịshọpụ Godfrey Onah, Achịbịshọpụ ụka Anglịkan n'Enugu bụ Emmanuel Chukwuma, otu jịkọrọ ọgbakọ ndị obodo dị iche iche n'Enugu bụ 'Enugu State Association of Presidents-General of Town Unions' nakwa ndị ọzọ nwere agba na steeti ahụ zipụtara ozi dọnyere Gọvanọ Mbah ukwu n'ọkwa a o mara.

Okporoụzọ tọgbọ chakoo n'akụkụ dị iche iche n'Enugu agbanyeghi iwu Gọvanọ Peter Mbah nyere
Nkọwa foto, Okporoụzọ tọgbọ chakoo n'akụkụ dị iche iche n'Enugu agbanyeghi iwu Gọvanọ Peter Mbah nyere
Dịka okporoụzụ tọgbọ chakoo n'ụtụtụ Mọnde a, ndị ntorobịa nọ n'ụzọ agba bọọlụ
Nkọwa foto, Dịka okporoụzụ tọgbọ chakoo n'ụtụtụ Mọnde a, ndị ntorobịa nọ n'ụzọ agba bọọlụ

Gọvanọ Mbah kpagharịrị n'ụbọchị Mọnde a, iji gosi na o kwudosiri ike n'okwu ya dịka ozi ya na Twitter gara n'ihu kwuo:

"Ndi Enugwu agaghị aga n'ihu na-anọdụ n'ụlọ ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị ọrụ mbụ n'izuụka. Anyị ekwesịghị ịkwado ndakpọ akụnaụba anyị mana anyị ga-agba mbọ hụ na anyị kwalitere ya."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Etu ọnọdụ ihe dị n'ụbọchị Mọnde, abali ise nke ọnwa Juun, 2023.
Nkọwa foto, Ọnụ ụzọ ahịa ndị mmadụ ka gbachiri n'ụbọchị Mọnde, abali ise nke ọnwa Juun, 2023
Ụlọakụ nakwa ụlọọrụ ndị mmadụ gbachiri agbachi n'ụbọchị Mọnde, abali ise nke ọnwa Juun, 2023
Nkọwa foto, Ụlọakụ nakwa ụlọọrụ ndị mmadụ gbachiri agbachi n'ụbọchị Mọnde, abali ise nke ọnwa Juun, 2023

Ihe ị kwesịrị ima maka ‘Sit at home’

Ọnọdụ 'sit-at-home' bụ iwu ndị otu nnwereonwe a na-akpọ 'Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile, kamgbe ọnwa Ọgọst afọ 2021, iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jide onyendu ha bụ Mazi Nnamdi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa.

Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ọtụtụ ndị ekperima na ndị ojiegbe malitere ịgagharị na mpaghara dị icheiche na-amanye iwu a, site na iwakpo ndị mmadụ, na-agba ụgbọala ọkụ, na-awakpo ndị ọrụ gọọmentị, ụlọọrụ gọọmentị, ndị ọrụ nchekwa ma na-egbukwa ụfọdụ ndị mmadụ bụ ndị pụtara ịga ahịa, mkpa ha maọbụ ọrụ n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

Kamgbe ahụ, ụbọchị Mọnde bụzi ụbọchị ‘ezumike’ nke gọọmentị etinyeghi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ maka na ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụta iro.

Ndị mmadụ ejughi n'ụzọ n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde, abalị ise nke ọnwa Juun dịka naanị ụgbọala olemole n'agba n'ụzọ
Nkọwa foto, Ndị mmadụ ejughi n'ụzọ n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde, abalị ise nke ọnwa Juun dịka naanị ụgbọala olemole n'agba n'ụzọ

Etu steeti ndị ọzọ n’ọwụwa anyanwụ Naijirịa siri buso iwu agha

Gọvanọ steeti ndị ọzọ na mpaghara ahụ ekwukwaala na ha akwadoghi ya bụ iwu dịka ha gbara mbọ buso ya bu iwu agha.

N’Anambra steeti, mgbe e duchara Gọvanọ Chukwuma Soludo iyi n’ọrụ n’afọ 2022, ọ mara ọkwa kwuo na agaghịzị akwado iwu ahụ.

N'okwu ya mgbe ahụ, ọ sị

"Anyị akagbuola atụmatụ ịnọ n'ụlọ dịka ndị ndu obodo, ndịisi ụlọụka, ndị Ipob na ndị ọzọ kwadoro anyị n'atụmatụ ahụ."

Etu ọnọdụ siri gaa n'ihu dị n'akụkụ Nkpor nke Anambra steeti

Ebe foto si, levithegrapher

Nkọwa foto, Etu ọnọdụ 'sit at home' siri gaa n'ihu dị n'akụkụ Nkpor nke Anambra steeti

Soludo sị malite n’ụbọchị Mọnde 4 Eprel, 2022 na a ga-enwe ọgbakọ ekpere n'ụlọụka niile dị n'Anambra nakwa Ọwụwa Anyanwụ iji kagbuo atụmatụ 'sit-at-home'.

Ụlọụka Katọlik nakwa Anglikan malitere ikpe ekpere maka mpịachi atụmatụ onye apụla ezi kwa Mọnde ọbụla n'Anambra Steetị mana akụkọ mwakpo gara n’ihu na-arị elu na steeti ahụ ọkachasị kwa ụbọchị Mọnde nke mere ndị mmadụ jiri gaa n’ihu n’akụkụ dị iche iche na-anọ n’ụlọ dịka ụfọdụ ụlọahịa gakwara n’ihu na-akpọchị ụzọ ha kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.