Etu otu onye ọrụ ngo si gbukasịa ụmụnwaanyị anọ ọ na-arụrụ ọrụ - Ndị obodo Nkerefi

Ebe foto si, Iwaria/BBC
Ndị Obodo Nkerefi dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu steeti nọ na nnukwu iru uju na ibe akwa ugbua maka nnukwu ọdachi dakwasara ha ụbọchị Tuzde, bụ ụbọchị 20 nke ọnwa June afọ 2023.
Otu nwoke na arụ ọrụ ugbo n'obodo ahụ ji mma wakpo ụmụ nwaanyị na-akọ ugbo ma gbuo mmadụ anọ n'ime ha.
Otu onye ntorobịa onye obodo Nkerefi bụ Mazi David Ani kọọrọ BBC Igbo ka ọdachị ahụ si mee.

Ebe foto si, Iwaria
"Ọ bụ ụbọchị Tuzde 20th June 2023 ka ụmụ nwoke atọ si Ezza, Ebonyi Steeti bịa ọrụ ngọ na be anyị gara ugbo ịga kọọrọ otu nwanyị osikapa."
"Nwaanyị ahụ na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ nọkwa n'ugbo ebe ha na-akọ osikapa, akpụ, na nrị ndị ọzọ"
"Ka ehihe ụbọchị ahụ ruru, nwaanyị ahụ butere nrị nye ndị ọ kpọrọ ọrụ ngo, ha atọ richaa nri ahụ, tupu otu n'ime ha abanye ime ọhịa sị ka ya gaa mposi."
Mazi Ani kwuru na ha na-eche na ọ bụ ọgwụ ike mkpụrụ mmiri ka nwa okorobịa ahụ gara ṅụọ n'ime ọhịa, nke mere na oge ọ pụtara n'ọhịa ahụ, o wakporo ụmụnwaanyị ya na ha sobu arụ ọrụ, were mma gbukasịwa ha.
Ani gara n'ihu kwuo na nwoke ahụ gburu ụmụnwaanyị anọ ebe ahụ, ma meruo mmadụ abụọ ọzọ ahụ.
"Ndị ọrụ ngo ibe ya nwara ike ha ịkwụsị ya mana ọ dị ka onye ara n'agba. Tupu onye ọbụla aghọta ihe na eme, odulaala ụmụ nwaanyị anọ mmụọ, ma gbalaga ọsọ," Ani kwuru.
"Anyị kụrụ ekwe wee na achọ ya bụ nwoke achọ ruo ugbua."
Ani kwuru na ọ na-adị ha ka ọ bụ ọgwụike ahụ a na-akpọ mkpụrụ mmiri (maọbụ chrystal meth na bekee) nke nwata nwoke ahụ ṅụrụ oge ọ banyere n'ime ọhịa, gbakara ya isi, mere o ji kpaa ụdị agwa ahụ .
Ndị nwe ozu ụmụ nwaanyị anọ ahụ nwụrụ eburula ha gaa n'ụlọ ozu, ebe ndị nke merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ.
Anyị amaghị ma ọ bụ ajọ mmụọ bara nwoke ahụ n'ime - Eze ndị Nkerefi
Luke Ogbu, bụ Igwe ndị Nkerefi, gwara BBC Igbo na ihe a merenụ gbagwojuru onye ọbụla anya, maka na onye ọbụla mabu nwata nwoke kpara arụ ahụ nke ọma.
"Nwoke a mere ihe a bụ onye ọbịa na be anyị, onweghị onye okwu na esere ya na ya tupu okpaa arụ ahụ," Igwe Ogbu kwuru.
"Site ugbua gawa, anyị ga-etinyezi anya na mmiri mara ndị nille na abata na be anyị akọ ọrụ ugbo.
"Nkerefi ga ewepụtazị usoro ịjụ ese iji mata ụdị mmadụ onye bụ, tupu anyị anabata onye ahụ ịbịa rụọ ọrụ ngo ịkọ ugboa maọbụ ime ihe ọbụla na be anyị."
O kwukwara na ha etinyela mmadụ anọ ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu ma buga ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ.
BBC kpọtụkwara ndị uweojii Enugwu Steeti, mana ọnụ na-ekwuru ha bụ Daniel Ndukwe sị na ha ka na-eme nnyocha gbasara akụkọ a.














