Disability bill: Lee ntaramahụhụ dịịrị onye ọbụla ji ndị nwere nkwarụ arịọ arịrịọ n'Enugwu steeti

Aha onyonyo, Disability bill: Lee ntaramahụhụ dịịrị onye ọbụla ji ndị nwere nkwarụ arịọ arịrịọ
Disability bill: Lee ntaramahụhụ dịịrị onye ọbụla ji ndị nwere nkwarụ arịọ arịrịọ n'Enugwu steeti

Ọgụ ndị nwere nkwarụ na-alụ kamgbe afọ ole ma ole gara aga amịtala mkpụrụ ugbua dịka gọọmentị Enugwu Steeti binyere aka n'akwụkwọ iwu a kpọrọ "Discrimination against people with disability prohibition Bill".

Ihe nke a pụtara bụ na ndị nkwarụ enweela ikik inwe ihe niile ga-enyere ha aka na ndụ dịka ụdịrị nkwarụ ha nwere siri dị.

Onyeisi otu jikọrọ ndị nkwarụ n'Enugwu bụ JONAPWD bụ maazị Onyebuchi Mba, bụ onye kpuru isi kelere ndị oneiwu Enugwu nakwa Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị maka ịhụ na ndị nkwarụ nwetara oke ha dika ndị Enugwu.

Maazị mba sị na ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ n'iwu a bụ na onye ọbụla na-akpokọta ndị nwere nkwarụ n'atụmatụ iji ha na-arịọ arịrịọ ga-aga mkpọrọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na obi dị ha ụtọ maka na iwu nke Gọọmentị etiti hiwere n'afọ 2018 abụrụla ihe Gọọmentị Enugwu binyere aka na ya.

Iwu metụtara ikike ndị nwere nkwarụ

Otu onye otu kwụụrụ onwe ya bụ NGO so gbaa mbọ n'iwu bụ Onyinye Mama gwara BBC na ya bụ iwu ọhụrụ nyere Enugwu afọ iri iji mezichaa ebe niile iji rubeisi n'iwu a.

Iji maa atụ, ụlọ ọbaego niile ga-enwe ihe a kpọrọ "Ramp" ebe ndị nkwarụ nọ na 'wheelchair' ga-esi abanye n'ụlọ ọbaegọ.

Nke ọzọ dịka ibe ya bụ na ndị ministri niile bụ nke gọọmenti nwee ga-enye ndị nkwarụ oke ruru pasentị ise n'ihe ọbụla ha na-eme.

Ndị nkwarụ otu a jkọrọ ọnụ gụnyere; ndị isi, ndị ngwọrọ, ndị anaghị ekwu okwu, ndị anaghị anụ ihe, ndị anyarị, ndị gbajiri ụkwụ na aka dgz.