Ịkọ cocoa m mụtara n’aka ndị nna nna m bụ ihe m ji aracha pịọm ugbua
Maazị Jerome Clement bụ onye obodo Itu Mbaụzọ dị n’okpuruọchịchị Bende Abia steeti akọwaale etu o si malite ịkọ mkpụrụosisi cocoa.
Ọ sị na ịkọ cocoa bụ aka ọrụ ha nwetere n’aka ndị nna nna ha ochie bụ ndị na-akọ cocoa.
“Amalitere m ịkọ cocoa mgbe m dị obere, ọ bụ aka ọrụ anyị nwetara n’aka ndị nna nna anyị ochie.”

Clement gara n’ihu kọwaa etu ha si akọ cocoa site n’ịkụ mkpụrụ ya ruo mgbe ha na-aghọ ya.
O kwuru na ọ bụ n’oge udu mmiri ka ha na-akọ cocoa, na ọ na-ewe ihe ruru afọ atọ maọbụ anọ cocoa etozuo oke ịghọ.
O kwuru na ha na-enwete nnukwu ego n’azụmaahịa ịkọ na ire cocoa.
“Anyị na-ere otu ‘pound weight’ cocoa ọnụego narị naịra asaa na iri ise (N750). Ị gbanweela ya na tọn, agba (64kg) iri na isii mejupụtara otu tọn. Ihe anyị na-ere otu tọn ahụ bụ ọnụego otu nde naịra na ụma asaa (N1.7bn).

Ọ gbakwụnyere na e ji cocoa emepụta ọtụtụ ihe dị iche iche dịka tii ọṅụṅụ, ‘chocolate’ nakwa akụrụngwa nri ndị ọzọ.
Clement kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti ga-enyere ha aka n’inye ha ego na ha nwere ala buru ezigbo ga-eme ka kọpụta cocoa n’ebe ọ dị ukwuu.

Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka cocoa

- Cocoa bụ otu n’ime akụmakụ ugbo na-enye ezigbote ego a kpọrọ ‘cash crops’.
- Naịjirịa bụ mba nke anọ kachasị akụ cocoa na mbaụwa. A na-akọpụta ihe ruru 2500,00 tọn dịka ngalaba na-ahụ maka ịkọ cocoa n’ụwa (International Cocoa Organisation) si kwuo.
- Naịjirịa nwetere ego ruru otu ijeri narị naịra na ijeri iri abụọ na abụọ (N122.9bn) site n’ire cocoa na mbido afọ 2022.
- Ụfọdụ mba Naịjirịa na-eresi cocoa gụnyere; Netherland, Belgium, Germany, Indonesia, Malaysia, Canada na Amerịka.










