Uses of Rubber: Etu e si emepụta ‘rubber’ na nnukwu ugbo nke Izombe, Imo steeti

Aha onyonyo, Rubber Plantation in Imo State

Ọrụ ugbọ bụ otu ụzọ ndị mmadụ nwere ike isi nwete ego ma kwalite akụnụba ha mana ụfọdụ na-eleghara nke a anya.

E nwere ọtụtụ osisi na-enye ndị ọrụ ugbo oke ego dịka ha bara oke uru.

Otu n’ime osisi ndị a bụ osisi “rubber”.

BBC Igbo mere njem gaa na nnukwu ugbo ebe a na-akọpụta osisi “rubber” n’Izombe nke Imo steeti.

Ihe anya hụrụ ebe ahụ bụ ihe ịtụ n’anya.

Ndị ọrụ ugbo nọ ebe ahụ nke otu onye n’ime ha bụ Donatus Emedoro kọwara etu esi akọ, abụpụta nakwa etu eji amịpụta mmiri pụrụiche osisi a na-agba

O kwuru na e ji mmiri emepụta ihe dị ịcheịche.

O kọwara etu osisi rọba si etoru ruo afọ asaa tupu amalite mịpụtaba mmiri na-agbapụta n’ahụ ya.

A na-ere mpụtara mmiri mgbapụta osisi a n'ọtụtụ mba dịka ọ bụ ihe a na-achọ achọ.

Rọba so na ụfọdụ ngwaahịa Naịjirịa na-eresi mba ndị ọzọ.

Dịka uru mmanụ agbadi ji nwanyo nwayo ala, Naịjirịa nakwa mba ndị ọzo na-achọ ụzọ ndị ọzọ ha nwereike isi kwalite akụnụba ha.

Ndị ọrụ ugbo ahụ kọwara na ọrụ ugbo rọba adighi mfe ma nacha.

Emedoro kwukwara na ibite ego n’aka gọọmentị maka mkwalite ya bụ ọrụ bụ ihe na-adighị mfe.

O kwuru na nke a so etinye aka na ihe na-echere ya bụ ọrụ aka mgba na Naịjirịa.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola kwa mgbe kwa mgbe na ọrụ ugbo na ọzụzụ ụmụ anụmanụ nwereike ịbụ ụzọ ga-agbapụta Naịjirịa n’ọdịnaihu, ọkachasị dịka ngozi ala nakwa ngozi ọtụtụ osisi jupụtara na Naịjirịa.

Marakwa na Naịjirịa bụbu ọkaibe na ọrụ ugbo n'oge gara aga tupu mmanụ agidi anọchịte ya anya.

Site n’afọ 1960 ruo mbido afọ 1970 tupu achọpụta mmanụ agbidi n’uju n’ala Naịjirịa, rubber so n’akụmakụ ubi Naịjirịa kacha kọpụta.

Kedụ uru “Rubber” bara?

Ndị ọkacha mara n’ọrụ ugbo ekwuola na ihe e ji Rubber emepụta na mbaụwa kariri 40,000 nke gụnyere akụkụ ụgbọala(car parts), ihe egwuregwu ụmụaka (toys), akụrụngwa ndị dọkịnta na ndị ahụike, akụkọ ụgbọelu dị ịcheịche

  • E ji ya eme nchekwa ndị mmadụ n'aka ọdụdọ ọkụ latrịk, ya mere eji were rọba arụpụta ihe ndị ọkụ latrịka na-eyi n'ahụ nakwa n'ụkwu mgbe ha nọ n'ọrụ
  • E ji ya emepụta ọtụtụ akụrụngwa ndị egwuregwu (sports items)
  • Ọ naghị ata nchara maọbụ mebie ọsịsọ
  • E jiri rọba rupụta ihe, ọ naghi agbaji agbaji dịka ọ bụ ihe na-adọ adọ
  • Ihịhịa osisi a bụ nri nye ehi nakwa anụmanụ ndị ọzọ
  • E jikwa osisi Rọba arụ ụlọ.

Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Chiemela Mgbeahuru.