Akwụkwọ ozi Nnamdi Kanu degaara Simon Ekpa bụ ezie, ama m akara edemede ya - Ada Biafra

Aha onyonyo, Akwụkwọ ozi Nnamdi Kanu degaara Simon Ekpa bụ ezie, ama m akara edemede ya - Ada Biafra

Chinyere Anigbogu bụbu onyeisi ọrụ Nnamdi Kanu, onyendu Indigenous People of Biafra, ekwuola na ọ bụ Kanu dere akwụkwọ ozi degaara Simon Ekpa, nke ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimako wepụtara n'izuụka gara aga.

Anigbogu, onye e ji Ada Biafra mara, kwuru nke a na mgbasaozi ndị otu ya bụ pro-Biafra Organisation mere n’Enugwu steeti n’ụbọchị Sọnde 30 Julaị 2023.

O kwuru na ya na Nnamdi Kanu arụọla ọrụ ọtụtụ afọ, na ọ maara nke ọma na akara edemede dị n’akwụkwọ ozi ahụ ọkaiwu Ejimakor gụpụtara bụ nke Kanu.

Ọ sị na ọ bụ ya mere otu ha jiri na-akwado ọkwa Kanu mara sị ka a kagbuo atụmatụ ịnọ n’ụlọ.

“Mụ na Nnamdi Kanu arụọla ọrụ ọtụtụ afọ, o doro m anya na akara edemede dị n’akwụkwọ ozi ahụ bụ nke ya.”

“Ọ dị mma etu Kanu matara na Biafra agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na anyị na ndị ndu ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbakọtaghị aka.”

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Simon Ekpa asaala Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu, Simon Ekpa

Ebe foto si, Getty Images/Simone Ekpa Facebook

Onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'autopilot' bụ Simone Ekpa ekwuola na akwụkwọ ozi si n'aka nnamdi Kanu bụ 'adịgboroja'.

Onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Nnamdi Kanu degara otu na ndị na-eso ya mabụrụkwa onye ndu otu alaka Ipob kewapụrụ bụ Simon Ekpa akwụkwọozi nye ya ntuziaka ka ọ kwụsị ikpọ oku nọrọnụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa ịkpọrị ndị gọvanọ mpaghar ahụ.

Mana n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya n'abalị Fraide, Ekpa sịrị na akwụkwọ ozi ahụ bụ, "ezigbote adịgboroja."

Ọ sịrị, "Nnamdi Kanu enweghị ike ide akwụkwọozi na-eto ndị ndọrọndọrọ ọchịchị tụsara n'akụkọ oku ka a tọhapụ ya."

Ekpa , onye na-akpozi onwe ya 'Praim Minista nke ndị Biafra", boro ebubo na ọ bụ ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS dere akwụkwọozi ahụ.

Nke a bụ mbụ Kanu na-eji akara onwe ya(his handwriting) zigara ya ozi.

Ọtụtụ mgbe gara aga, Ekpa nupuru isi n'ozi Nnamdi Kanu bụ onye nọ na mkpọrọ DSS kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 maka ebubo iyi ndụ egwu, zigarala Ekpa ozi site na ndị ọkaiwu na okenye Igbo dị ọzọ garala hụ ya na mkpọrọ.

Nnamdi Kanu: Gwanụ Simon Ekpa na onye ọbula na-akpọ 'sit-at-home' abụghị onye na-eso m

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Nnamdi Kanu enyela onye ndu otu alaka Ipob bụ Simon Ekpa ntuziaka ka ọkwụsị ikpọ oku nọrọnụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ.

N'akwụkwọozi nke o degara Ekpa nke rutere BBC Igbo aka site n'aka Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor, Kanu gwara Ekpa ka o sepụ aka n'ịkpọ oku nọrọn'ụlọ nakwa ibu agha megide ndị gọvanọ dịka ọ sị na ọ maghị ndị na-enye aka n'okwu ntọhapụ ya.

Ọkaiwu Ejimakor kwuputara ozi ọhụrụ Kanu ziri ya maka Simon Ekpa n'ehihie Faride dịka ọ na-gwa ndị ntaakụkọ okwu n’Enugwu ma wepụta akwụkwọ ozi nke Nnamdi Kanu jiri aka ya dee n'akara nke onwe ya(handwriting).

Ya bụ ozi bụ ntuziaka Kanu nyere Simon Ekpa maka Ekpa na-akpọkarị n’ala Igbo nke butela ọnwu ọtụtụ mmadu.

“Simon, a na m enye gi ịwu ka ikwusi ịkpọ oku sit-at-home…MNK

Ejimakor gosiri ndị ntaakụkọ ya bụ akwụkwọ nke Mazi Nnamdi Kanu ji aka ya dee

Cheta na e ji Nnamdi Kanụ na mkpọrọ DSS kemgbe ọnwa Juun afọ 2023 dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị nakwa iyi ndụ egwu.

ozi Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post