Simon Ekpa asaala Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu

Ebe foto si, Simon Ekpa / Godswill Akpabio/Facebook
Onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'Autopilot bụ Simon Ekpa asaala onyeisi Ụlọomeiwu Naijiria bụ Godswill Akpabio n'okwu ya banyere nsogbu a sị na Ekpa na-akpalite n'Ọwụwa Anyanwụ site na ịmanye nọrọnụlọ na moppaghara ahụ.
Akpabio nọrọ n'ụbọchị Wenezde n'Ụlọimeiwu dịka ndị sentọ Ọwụwa Anyanwu kpalitere okwu banyere etu nọrọnụlọ si bute ọnwụ ndị mmadụ na ndakpọ nchekwa taa ndị gọvanọ mpaghara ahụ ụta maka etu ha sị nọrọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị n'okwu ahụ.
Akpabio kwuru na ọ bụru na, n' agbayeghị na ha na anata ego pụrụ iche maka nchekwa obodo(security vote) mana na-erube isi n'oku nọrọnụlọ, na ọ pụtara na ọ bụ Ekpa bụ onye si mba Finland akpọ ya bu oku na-achị n'Ọwụwa Anyanwụ dịka gọvanọ.
Mana n'ọsịsa ya, Ekpa kwuru na Akpabio amaghị nke ekwe na-akụ na ihe na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie.
Ekpa kwuru n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya ụbọchị Tọzde sị, " Ị ka na-akpọ m gọvanọ Owụwa anyanwụ, ebe m bụ Praịm Minista Biafra nọ mba ọzọ. Chere oge Akwa-Ibom sonyere na nọrọnụlọ izuụka abụọ..."
" Ị mabeghị ihe na-eme ma ọ bụrụ na ị maghị na anyị agbaala gị arụkwaghị m."
"Nani n'Abuja ka i nwere ike, ọ bụghị n'Ọwụwa Anyanwụ."
Ihe ndị Senetọ si ka e mee maka Ekpa, ọnọdụ nchekwa Ọwụwa Anyanwụ

Ebe foto si, Senate/Simon Ekpa/Facebook
Ndị Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akatọọla nọrọ n'ụlọ ma kpoo oku ka a kpụlata onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'Autopilot'bụ Simon Ekpa Naijiria ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọikpe.
A na-ebo Simon Ekpa bụ nwa afọ Naijiria bi mba Finland ebubo itinye iwu nọrọnụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ kwa Monde Ekpa iji kpo oku ka a tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu bụ onye e ji eji maka ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
Ha kpebikwara ịkpọ onyennọchiteanya mba Finland na Naijiria oku maka okwu ọnọdụ Ekpa na mba ahụ.
Onye omeiwu na na-anọchite, Imo-West n'ụlọomeiwu Ukwu Naijiria bụ Osita Izunaso bụ onye kpalitere okwu a n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Wenezde n'aha ndị senetọ si Ọwụwa Anyanwụ.
Izunaso tụrụ arịrị na nọrọnụlọ a kụtụọla ọnọdụ akụnaba Ọwụwa Anyanwụ, agụmakwụkwọ, azụmahịa na ahụike sịrị, "Okwu a bụ iji katọrọ nọrọnụlọ na-eme n'Ọwụẁa Anyanwụ Naijiria."
"Puku kwuru puku mmadụ atụfuola ndụ ha kemgbe nọrọnụlọ a nke mere ka ndị na-etinye ego na nkwalite akụnaụba gbaapụ n' Ọwụwa Anyanwụ."
"Ụlọomeiwu na-atụ uche ma ọ bụrụ na-agbaghị ụzọ owere mgba n'ihe gbasara, ọ gaghị echi, Simon Ekpa ga-eduhie ndị ntọrobịa."
Enyinnaya Abaribe sịrị, " onye amaghị ebe mmiri starts beating you, you would not know
" Sit-at-home malitere n'Ọgọstụ 2021 oge Ipob kwuru na ha ga aga nọrọnụlọ n'ihi njichi onye ndu ha."
"Oge ha mechara kha sị na ha anaghị anọkwa n'ụlọ, ndị omekome zoro n'ahụ nọrọnụlọ.
"Ụfọdụ ndị agboro pụta ha gbuo mmadụ, see ya onyonyo gbasa na soshal midia."
"O nweghị onye nọ n'Ọwụwa Anynanwụ nọrọnụlọ masịrị. Ọ bụ ndị omekome na-eme ihe."
"Ha ji iyi egwu na-emenye ndị mpaghara nile egwu."
Otunba Gbenga Daniels nyere nkwado ya sịrị, na nsogbu ahụ na-emetụ mpaghara ndị ọzọ.
"Ọ dị mkpa ịgwụsị nsogbu ."
"Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla n'ihi ihe a dịka Gụlak bụ ndị a sị na ndị na-amanye nọrọnụlọ gbagburu ya."
Kedụ ihe ndị gọvanọ na-eme? Akpabio

Ebe foto si, NGRSENATE/Facebook
N'okwu ya, onyeisi Ụlọomeiwu Naijiria Akpabio, jụrụ, "Kedụ ihe ndị gọvanọ merela iji gboo nsogbu a?"
Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Godwin Akpabio," Ọ bụrụ na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-erubere nọrọnụlọ, ndị ọrụ oyibo na-erubere ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ Simon Ekpa si Finland achị Ọwụwa Anyanwụ."
Ọ gara n'ihu sị, "Ndị gọvanọ na-ata ego pụrụ iche maka nchekwa, kedụ ihe ha ji ya eme?"
N'oku ụfọdụ ndị Senetọ si Ọwụị̀anyanwụ ka Gọọmentị Naijiria si ụzọ ndọrọndọrọ lebanye anya n'okwu Nnamdi Kanu, onye ndu Sineti bụ Bamidele Opeyemi kwuru ka akụpụ ya sị n'na okwu ahụ dị n'ụlọikpe.












