Sit-at-home: Ihe 'South East Forum', Ohaneze kwuru maka nọrọnụlọ Simon Ekpa tinyere

Hope Uzodimma, Ohaneze

Ebe foto si, Hope Uzodinmma/BBC

Otu jikọrọ ndị gọvanọ Owuwa Anyanwụ a kpọrọ 'South East Governors' Forum' na otu Ohaneze ebekuola Gọọmentị Etiti ka ha gbata, tinye aka na igbo nsogbu nke nọrọnụlọ butere na mpaghara ahụ.

Alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'autopilot' tinyere nọrọnụlọ izuụka abụọ ,Ọwụwa Anyanwụ na nsonso a nke butere mmechi ahịa na ọrụ, ọnwụ nakwa mmerụahụ ahụ ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị bu egbe na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ.

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinmma bụ onye gbara ama a n'aha otu ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, rụtụrụ aka na nsogbu so nọrọnụlọ ahụ akariala ndị gọvanọ steeti dị iche iche dị n' Ọwụwa Anyanwụ aka.

Nsogbu nọrọụlọ akarịala ndị gọvanọ Ọwụịwa Anyanwụ aka

Hope Uzodimma

Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

Uzodimma sị, "Ọtụtụ gọọentị steeti dị n'Ọwụẁa Anyanwụ emefuola ego na ihe ndị ọzọ mana na-agbanyeghị nke a, nsogbu ka na-aga n’iru."

" Ya mere ndị ndu mpaghara a na otu ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu ji zukọọ kwekọrịta ibeku onyeisiala ka ọ bịa hụ na e wetara udo na mpaghara Ọwụẁa Anyanwụ.”

"Nchekwa iji nwe ohere aga mkpa ha so dị ndị Ọwụẁa Anyanwụ mkpa dịka ndị so bụrụ Naijiria."

Uzodimma gara n'ihu tụọ arịrị na ọ bụghị na ndị mmadụ chọrọ ịnọ n'ụlọ kama "Ọ bụ egwu na-atụ ndị mmadụ n'ihi ihe ndị mere oge gara aga."

Ndị ojiegbe gburu ụfọdụ ma merụọ ndị ọzọ ahụ nizuụka abụọ gara aka dịka ha na-amanye ndị mmadụ rrube isis nn'oku nọn'ụlọ nke Simon Ekpa bụ onye ndụ alaka totu Ipob kpọrọ onwe ha 'autopilt tinyere n'Ọwụị̀a Anyanwụ.

'Sit-at-home' bụ Igbo imegide onwe ha- Ohaneze

Ohaneze

N'otu aka ahụ, otu Ohaneze ebekuola Gọọmentị Etiti ka ha gbatara mpaghara Ọwụị̀a Anyanwụ ọsọ enyemaka n'ihi ndakpọ nchekwa na azụmahịa nke oku nọọnụlọ wetara na mpaghara ahụ.

Ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze bụ Alex Ogbonna ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na " Nchekwa dị n'aka Gọọmentị Etiti, sọsọ anyị agaghị alucha ọrụ dị na ya".

"Nọrọnụlọ a na-eme, ọ baraghị anyị uru, onwe anyị ka na-emegide."

" Ọ bụrụ na ndị na-emegide anyị hụ ka anyị na-eme gide onwe anyí , ha ga-asịe anyị gaa n’ihu."

O gara n'ihu kwuo na ọ bụghị itigbuo-zogbuo maọbụ nọrọnụlọ ka a ga-eji kpọpụta Nnamdi Kanu na mkpọrọ kama ọ bụ ihe Bekee kpọrọ 'diplomatic solution'.

Simon Ekpa, Peter Obi

Ebe foto si, Simon Ekpa/Peter Obi/Facebook

Onye ndu otu alaka Ipob nke kpọrọ onwe ha 'autopilot' bụ Simon Ekpa akatọọla onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha otu Labour party bu Peter Obi maka ịkpo oku ka a na-ahụta ndị na-amanye nọrọnụlọ n'Ọwụwa Anyanwu dịka ndị ekperima.

N'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde, Obi kpọrọ mmanye nọrọnụlọ akaọrụ ndị ekperima ma sị na otu Ipob ekwuola n'ọha na ha etinyeghị iwu 'nọrọnụlọ'.

Mana ọsịsa ya o nyere n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya, Ekpa, onye kpọrịrị Obi sịrị , " Obi bụzị ọnụ na-ekwuru Ipob."

Cheta na Ekpa bụ onye malitere alaka otu Ipob nke ya ọ kpọrọ, 'Autopilot' tinyere nọrọụlọ izuuka abuo n'Ọwụwa Anyanwụ nke ọ sị na ya na ndị otu ya ji akpo oku ka a tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

E ji Kanu na mkpọrọ DSS kemgbe Juun afọ 2021 maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu Gọọment Etiti.

Were oku 'nọrọnụlọ' na mkposa azụmahia na mmekọrịta ya dịka akaọrụ ndị ekperima -Peter Obi

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha otu Labour party bu Peter Obi atụọla arịrị banyere ndakpọ akụnaụba nke enweghị nchekwa na-arị elu butere n'Ọwụwa Anyanwụ na mpaghara Naijiria ndị ọzọ.

Dịka o kwupụtara mwute banyere tigbuo-zogbuo na-aga n'etiti Ugwu Awụsa, n'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya n'ụbọchị Tọzde, katọrọ mkposa azụmahịa na mmekọrịta mmadụ n'ibe ya nke oku otu alaka Ipob wetara n'Ọwụwa Anyanwụ.

Na nsonso a, e gburu ụfọdụ mmadụ, merụọ ọtụtụ ahụ dịka otu alaka otu alaka Ipob nke Simon Ekpa bụ onye ndu ha manyere nọrọnụlọ izuụka abụọ n'Ọwụwa Anyanwụ, Naijiria.

Obi sịrị," Ọ bụ ihe mgbarụ obi na a gara n'ihu na-ekposa azụmahịa nakwa mmekọrịta mmadụ n'ibe ya n'Ọwụwa Anyanwụ n'ihi oku 'nọrọnulọ' a sị si n'aka otu 'Indigenous People of Biafra'(Ipob), oge otu ahu kwuru n'ọha hooha na ntuziaka ahụ esighị n'aka ha."

"Ihe na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ bụ mpụ nke e kwesịrị iji n'oge kwachapụ nku, ma ndị ọrụ nchekwa na ndị obodo jịkọọ aka."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4