Cynthia Okereke profile: Ihe ndị ejije Nollywood na-ekwu maka ogbo ha lara mmụọ

Onye ejije Nollywood

Ebe foto si, Cynthia Okekere

Otụtụ ndị ihe ejije na Naijiria atụọla arịrị maka ọnwụ onye otu ha bụ Cynthia Okereke.

Okereke gbara afọ 63 nwụrụ na nsonso a ka ọ rịachara ahụ obere oge.

Chukwu kachie ezinaụlọ gị obi- Monalisa

Monalisa Chinda

Ebe foto si, Monalisa/Instagram

Otu n'ime ndị ogbo ya ma bụrụkwa ọnụ na-ekwuru otu jịkọrọ ndị ejije a kpọrọ 'Actors Guild of Nigeria' bụ Monalisa Chinda kpere ekpere ka nwa ada Enugwu lara mmụọ zuru ike na ndokwa.

N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya na mgbede Wenezde, Monalisa sịrị,"Zuru ike nke ọma, ezi Cynthia."

"Ka Chukwu kachie ezinaụlọ gị obi."

A gaghị echefu ọdịmma mụ na gị ebeebe

Charles Inojie

Ebe foto si, Charles Inojie/Instagram

N'aka nke ọzọ, Charles Inojie, sịrị na " O riri m ọnụ okwu."

N'ozi o wepụtara n'akara Instagram, Inojie onye kọwara Okereke dịka enyi and nne ya sịrị,"A gaghị echefu ọdịmma mụ na gị ebeebe."

Ihe furu ndị Enugwu- Govanọ Peter Mba

Peter Mbah

Ebe foto si, Peter Mbah/Faceebook

Aka na-achị Enugwu steeti sonyekwara na ndị kwara akwa arịrị maka ọnwụ Onye ihe ejije a ma ama bụ Cynthia Okereke.

N'ozi o wepụtara o wepụtara n'akara Twitter ya, Mbah sịrị" Ọnwụ ya bụ nnufu ihe furu nd ị Enugwu steeti, ndị ejije ,ezinaụlọ ya na ndi Enyi ya."

Mbah onye kọwara Cynthia okerekere dịka ada Enugwu sịrị,"Ana m ekpe ekpere ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Etu Cynthia Okereke, onye ejije Nollywood si laa mmụọ

Onye ejije Nollywood

Ebe foto si, Cynthia Okereke

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ezinaụlọ onye ejije Nollywood a ma ama dịka Cynthia Okereke agbaala ama na ọ laala mmụọ.

Ndị be ya gwara BBC Igbo n’ụtụtụ Wenezde na ọ nwụrụ dịka “ọ daturu obere ọrịa.”

Akụkọ pụtaburu na ọ nọ n’ọnọdụ nkubitu nwamgbenta kemgbe mana odobeghi anya mkpọ kwem etu o siri daba n’ọnọdụ ahụike ahụ.

Ụfọdụ ndị ogbo ya n’ọrụ ejije amalitela izipụta ozi banyere ndụ ya nakwa ihe ndị ha ga-eji echeta ya.

Emeka Rollas bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ ejije Naịjirịa bụ 'Actors Guild of Nigeria' gwakwara BBC Igbo na "di Okiakụ Okekere gwara m na ọ laala mmụọ n'ezie".

Otu n’ime ha bụ Joseph Okechukwu dere n’Instagram ya “Kemgbe ihe karịrị afọ 20 m matara gị, ị bụ ezigbo mmadụ ndị mmadụ na-achọ ịnọ nso dịka ị nwere obi dị mma”.

“Ihe nke a akuriela m etu m agaghị enweike ikwu okwu ugbua”.

Gọvanọ Peter Mbah bụ steeti Okereke si zipụtara ozi kwuo na "ọnwụ gị bụ ezigbo ihe efu nye ndị ọrụ ejije, nye Enugu steeti nakwa ndị ezinaụlọ gị".

"A ga-echeta ọrụ gị nke ukwuu na Nollywood".

Cheta na n’ebe Jụlaị nke afọ 2022 na aha Oriakụ Okereke wuru ewu mgbe ndị ntọ tọọrọ ya na onye ejije ibe ya bụ Clemson Cornel.

E merechara tọhapụ ha abụọ ka otu izuụka gachara.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ihe ị kwesịrị ịma maka Cynthia Okereke

Cynthia Okereke

Ebe foto si, Cynthia Okereke/Instagram

  • Ọ lụrụ di, mụọ ụmụ ma nwee ụmụ ụmụ
  • Ọ bụ onye Enugu steeti
  • Ụfọdụ n’ime ejije ndị ochie wepụtara aha ya n’ihu ọha gụnyere ejije ‘King Jaja of Opobo’ , ‘Osuofia in London’, ‘Coronation’ na ndị ọzọ
  • E ji ịkpa agwa dịka nne maọbụ onye nwere ezigbo obi ọma mara ya n’ejije Nollywood
  • Ya na ọtụtụ ndị ejije Nollywood ndị ochie emekọọla ejije dịka Patience Ozokwor, Nkem Owoh, Chiwetalu Agu, John Okafor na ndị ọzọ
  • Ọ lara mmụọ n’ụbọchị Tuzde, abalị 11 nke ọnwa Jụlaị, 2023

Ọtụtụ ndị ọrụ ejije Nollywood ndị ọzọ alaala mmụọ n'aụ́ọ nke merela ka ọha kwaa ezigbo arịrị ma rie uju maka ha.

Ụfọdụ ndị ọrụ ejije Nollywood ndị ọzọ larala mmụọ n'afọ a

Murphy Afolabi

N'ọnwa Mee, otu onye ọrụ ejije na ngalaba ejije Nollywood ndị agbụrụ Yoruba e ji aha Murphy Afolabi mara lara mmụọ n'afọ 49.

Onyeisi otu ndị ejije nke Theatre Arts and Motion Pictures Practitioners Association of Nigeria (TAMPAN) bụ Bolaji Amusan gbaara BBC ama ọnwụ ya. Afolabi lara mmụọ otu izuuụka ka ọ gbara afọ 49.

Peace Anyiam-Osigwe

Ọnwụ nwaada Anyiam-Osigwe bụ onye hibere ụlọọrụ na-enye ndị ejije ihe nrite n'okpuru aha 'Africa Movie Academy Awards(AMAA)', lara mmụọ n'afọ 53 n'ọnwa Jenụwarị 2023.

Ezinaụlọ ya gbara ama maka ọnwụ ya mgbe ahụ mana ha agbaghị n'anwụ etu o siri laa mmụọ. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-emepụta ejije na Nollywood tupu ọnwụọ.

Sunday Akinola

Onye ọrụ ejije na ngalaba Nollywood nke agbụrụ Yoruba a bụ onye ọtụtụ ma maka agwa ọ kpara na ejije ‘Feyikogbon’.

Ọ lara mmụọ n'afọ Jenụwarị 2023.

Ọnwụ ya bịara ka ọ gbachara afọ 80.

Ọnwụ ya bịara dịka akụkọ pụtara na ahụike akịrị ya daturu adatu.

Ụfọdụ na-ekwu na ‘Feyikogbon’ so n'ejije Nollywood nke Yoruba kacha pụta n'oge dịka ọ pụtara ma nọọrọ ogologo oge na NTA kemgbe ebe afọ 1980.

Femi Ogunrombi (Papa Ajasco)

Onye ntaakụkọ a nakwa onye ọrụ ejije aka ochie a bụ Shaibu Husseini mara ọnwa ọnwụ Ogunrombi bụ onye ọtụtụ ma dịka 'Papa Ajasco' n'ọnwa Jenwụarị 2023.

Ọha ndị mmadụ kwara oke akwa ka ọ nwụụ n'ihi etu ọha siri hụ ya n'anya.

Ogunrombi bụbu onye ọrụ ahụike mana ọ mechara wụba ọrụ ejije n'ebe afọ 1980.

O mechiri ụlọọgwụ ya na 1979 ma gaa gụọ akwụkwọ na mahadum Obafemi Awolowo

Ogunrombi nọchịrị onye ejije Abiodun Ayoyinka n'agwa ya n'ejije Papa Ajasco mgbe ọ pụrụ.