Hilda Dokubo: Ndị na-achị Naịjirịa amaghị ihe ndị ha na-achị chọrọ

Aha onyonyo, Hilda Dokubo: Ndị na-achị Naịjirịa amaghị ihe ndị ha na-achị chọrọ
Hilda Dokubo: Ndị na-achị Naịjirịa amaghị ihe ndị ha na-achị chọrọ

Na mkparịtaụka anyị na Hilda Dokubo nwere n'afọ 2018, ọ kọwaara BBC Igbo ihe o ji anya hụ n'ọrụ gọọmenti nakwa ihe mere o ji pụọ.

Dokubo kwuru na ịrụ ọrụ gọọmenti dịka onye ọkaibe n'ọrụ, ị na-arụ dịka igbu onwe gị oge.

O kwuru sị na oke dị n'etiti ndị na-achị na ndị ha na-achị ebuka. Nke a mere na ndị na-achị amaghị ihe na-emetụta ndị ha na-achị.

Hilda Dokubo

Ebe foto si, Hilda Dokubo

N'agbanyeghi ihe ọ hụrụ n'ọrụ gọọmenti, Dokubo kọwara ka o si nwaa ike ya ịhụ na ndị ntoroọbịa ọ na-anọchite si rite uru n'oge ọ nọ n'ọkwa.

N'okwu ọzọ, Hilda kọwakwara ka o si bido njem ya na ime ejije. Ọ sị na o bidoro ya bụ njem mgbe ọ ka bụ nwatakịrị.

N'otu aka ahụ, Dokubo dụrụ ndị Igbo ndụmọdụ ka ha gbalịa jikọọ aka dozie ala Igbo maka na e nweghi ihe ndị Igbo na-enweghi.

Onye bụ Hilda Dokubo?

Hilda Dokubo bụ onye na-eme ejije ama ama nke ukwuu.

O so na ndị bidoro ime ejije na Naịjirịa.

Ọtụtụ ihe nkiri Naijiria ọ merela gụnyere Gone Forever, My Goodwill, na The CEO.

Dokubo eritela ọtụtụ nturuugo n'ime ejije.

O hibere otu NGO a kpọrọ 'Center for Creative Arts Education (CREATE)', nke na-akwalite nka iji nyere ụmụnwanyị na ndị ntoroọbịa aka.

Hilda Dokubo bụkwa onye ọ na-amasị ikwuchitere ndị na-enweghi ọnụ na-ekwuchitere ha.

N'afọ 2020, Hilda Dokubo sonyere ndị ngagharịiwe EndSars na Legọs maka mmegbu ha sị na ndị uweojii na-eme ndị mmadụ.