Lee ihe Charly Boy kwuru maka Peter Obi, Nnamdi Kanu, na ọnọdụ nchekwa n'Ala Igbo
Charles Oputa a ma dịka Charly Boy etinyela ọnụ n'ihe gbasara Naịjiria, ọkachasị ebe ọ metụtara ọchịchị, ọnọdụ nchekwa n'Ala Igbo nakwa Nnamdi Kanu.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Charly Boy rụtụrụ aka na nzọpụta Naịjiria adịghị n'aka ndị pati Peoples Democratic Party (PDP) na All Progressives Congress (APC).
Ọ kọwara na PDP na APC bụ otu nne na nna ji ha, na e nweghi ihe dị iche na pati abụọ ahụ.
Ọ kọwara na o nweghi mgbe o ji tụwa anya na Peter Obi ga-abanye pati ahụ ma nọrọ n'okpuru pati PDP zọọ ọchịchị ọkwa onyeisiala.
O kwuru na akụkọ na Peter Obi ahapụla PDP nyere ya ọṅụ n'ihi na o che na ihe a Peter mere bụ ihe o kwesịrị ime, ma kwuo na Peter bụ otu onye ọ ma nwere ihe ọ ga-ewe ịchịnwu Naịjiria ọfụma.
Gbasara ọnọdụ nchekwa n'Ala Igbo
Charly Boy jara atụmatụ nchekwa Chukwuma Soludo bụ gọvanọ Anambra steeti wepụtara ike.
Ọ kọwara na ọ ghọtaghị etu ndị omekome ahụ na-akpa ike n'ala Igbo si nọrọ n'azụ ụlọ ha na-akpa ike.
O kwuru na mkpamkpa a na-akpa n'Ala Igbo ebutela ma ndakpọ akụnaụba na mpaghara ahụ.
Gbasara Nnamdi Kanu, Onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) e ji eji
Charly Boy kwuru na ọ bụ eziokwu na Nnamdi Kanu ji maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo wepụta onwe ya, mana ihe ọzọ abanyela n'ime ya.