Ihe Cynthia Okereke na Cornel Agbogidi kwuru dịka atọhapụrụ ha

Cynthia na Clemson a na-achọ achọ ma mechaa hụ.

Ebe foto si, Cynthia Okereke/Instagram/Cornel Agbogidi/Instagram

Mmadụ abụọ na-eme ihe ejije na Nollywood bụ Cynthia Okereke na Clemson Cornel Agbogidi atọọrọ n’izu gara aga ma mechaa tọhapụ ekwuola okwu nke mbụ ha n’ọha.

N’ihe onyonyo ọhụrụ pụtara na soshal midia na ngwụcha izu a, Okereke na Agbogidi ji ụkpa eleke kwuo na obi dị ha mma etu ndị mmadụ siri kwado ha ma gbatara ọsọ enyemaka mgbe atọọrọ ha.

Okereke kwuru: “Amaghị m na m nwere ndị mmadụ na ndị nkwado etu a”

“Chukwu gọzịrịe m unu niile”

Agbogidi onye kwukwara na aṅụ juru ya ọnụ kwuru:

“Dịka onyeisi m bụ Brown End siri nye ndụmọdụ, aga m akọ ihe m gabigara n’oge adịghị anya ugbua esila m n’ụlọ ọgwụ pụta’

Dịka ha abụọ si njem ha gara n’ụlọọgwụ pụta, Okerekere kwuru na obara ya agbaliela elu ebe Agbogidi kwuru na ezigbo ike gwụrụ ya.

Ọha na-elezi ka anụ n’uju ihe ndị a gabigara n’aka ndị tọọrọ ha nakwa etu ya bụ ihe siri mee.

Monalisa Chinda

Ebe foto si, Instagram/Monalisa Chinda

Nkọwa foto, Monalisa Chinda na-arụ mgbasa ozi na 'Actors Guild of Nigeria' zipụtara ozi ntọhapụ ndị a

Ihe anyị ma maka ntọhapụ ha

Monalisa Chinda Coker bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndị otu jikọrọ ndị ejije na Naijirịa bụ Actors Guild of Nigeria depụtara n'izu a n'akara Instagram ya na atọhapụla mmadụ abụọ na-eme ejije na Nollywood.

Ọ dere na ọ bụ onyeisi otu a bụ Emeka Rollas kwuputara nke a ma sị na ọ bụ mmụọ Chineke batara ndị ntọ ahụ n'obi nke mere ka ha tọhapụ ha.

N'otu aka ahụ onyeisi ndị otu Actors guild of Nigeria ngalaba Enugwu bụ Brown End kwuru na ndị otu ha na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

End ji ohere ahụ nye ndị otu ha ndụmọdụ ka ha na-akpọrọ ndị ọrụ nchekwa oge ọbụla ha gara n'ebe ha na-eme ejije iji gbochie ịtọrọ ha.

Ha kelere ndị otu ha na ndị Naijirịa kwadoro ha oge a tọọrọ ndịa ma sị ka mmadụ niile buru nchekwa onwe ha n'obi , ọkachasị ndị na-eme ihe ejije.

Brown End
Nkọwa foto, Brown End onyeisi ndị na-eme ejije na Naịjirịa nke ngalaba Enugwu

Ezinaụlọ Clemson Cornel bụ onye ejije Nollywood agwaala BBC Igbo na ndị tọọrọ nwoke ahụ eziterela ha ozi na-ana ha otu puku narị dọlla iji tọghapụ ha abụọ.

O kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde ka ozi ekwentị ahụ batara n'ekwentị ya mana ọ kpaọghachihi ha rue ụnyaahụ bụ ụbọchị Satode.

"Ihe ha na-ana anyị bụ $100,000... marazienu ego ole ọ bụ n'ego anyị" ka onye ahụ kwuru n'ekwentị.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde ka otu jikọrọ ndị ejije bụ Actors Guild of Nigeria ziputara ozi na Cynthia na Clemson erughi be ha dịka ha si ebe ha gara ise onyonyo lọghachite.

N'otu ozi ahụ, ha zikwere ozi sị ndị ejije ndị ọzọ gbaa mbọ kwụsị ịpụ apụ n'etiti obodo eme ihe onyonyo maka nchekwa ha.

Ihe ndị uweoji kwuru dịka a na-achọ Clemson Cornel na Cynthia Okereke achọ

Njirimara ndị uweojii, Clemson Cornel (Agbogidi) na Cynthia Okereke

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe ekwuola na ha ahụla ụgbọala a na-eche na ọ bụ nke Cynthia Okereke, onye ejije Nollywood e kwuru na a na-achọ achọ.

Ndukwe kwuru na ha nwetara ozi na a hụrụ ụgbọala Toyota RAV4 na-acha mmemme n'akụkụ 'Four-Corners nke dị n'okporoụzọ si Enugu gawa Portharcourt.

O kwuru na ọ bụ taa bụ ụbọchị iri abụọ na itolu nke ọnwa Julai afọ 2022 n'elekere asaa na ụma nke ụtụtụ ka ha nwetara ozi a.

Mana ọ bụ n'ihe dịka elekere iri na otu nke ụtụtụ ka ha nwetara ozi na ụgbọala ahụ bụ nke Cynthia Okereke.

Ndukwe kwuru na ya bụ ozi kwukwara na ọ bụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Jun bụ ụbọchị ikpeazụ a hụru ụgbọala ahụ.

O kwuru na ha ebidola nyocha ịmata maka ya bụ ụgbọala na mkpesa ha nwetara maka onye a sị a na-achọ achọ.

Etu akụkọ a si pụta ihe

Clemson Cornel na Cynthia Okereke

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi Actors Guild of Nigeria bụ otu jịkọrọ ndị na-eme ihe ejije na Naijirịa bụ Monalisa Chinda edepụtala na ha na-achọ ndị otu ha abụọ bụ Clemson-Cornell Nnonyelu eji Agbogidi mara na Cynthia Okereke achọ dịka ndị ezịnụlkọ ha si na ha ahụbeghị ha.

Ọ bụ n'akara Instagram ya ka Chinda depụtara were sị na ọ bụ kamgbe ha mechara ihe ejije n'obodo Ozalla nke dị n'Enugwu Steeti.

Ọ dere sị na ha na-eche na atọọrọ ha abụọ atọ.

Dịka o siri dee, Onyeisi otu a bụ Emeka Rollas gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere ma sị ka ndị otu ha niile kpachara anya etu ha sị eme njem, ọkachasị na mpaghara mpụga obodo ọbụla.

Rollas kwukwara ka ndị ọrụ nchekwa mee nyocha ma chọta ebendị a nọ ma rịọ ndị mmadụ ka ha tinye ha n'ekpere.