Ada Ameh: Etu o siri laa mmụọ

Ada Ameh

Ebe foto si, Instagram/Ada Ameh

Adah Ameh bụ nwaanyị a ma ama na-eme ejije Nollywood alaala mmụọ.

Emeka Rollas bụ onyeisi otu ndị ejije Nollywood akpọrọ Actors guild of Nigeria gbara BBC ama na ya bụ akụkọ bụ eziokwu.

O kwuru “Anyị enwetela ozi ịgbaama na ọ nwụrụ n’ezie”.

Ọ kọwakwara na ndị otu ha mabeghị etu o siri nwụọ kpọm kwem.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na ọ dara ma kubitu na Delta steeti.

A mabeghi kpọm kwem etu ya bụ ihe si mee.

Dịka nwa ya ọ mụrụ naanị ya nwụrụ n'afọ 2020, Ameh kwuru na ọnwụ nwaa ya metụtara ya n'ụzọ ọjọọ ma kụdaa mmụọ ya nke ukwuu.

Nwaa a o kwuru ọ mụrụ mgbe ọ dị naanị afọ 14 dị ya n'obi nke ukwuu.

Na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ Chude Jideonwo nwere n'afọ 2021, ọ kọwara na ọ tụtara ime nwa ahụ na-amaghị ama mgbe ahụ n'ihi na ndị enyi ya dubara ya na ndụ akwamiko mgbe ọ ka dị na nwata.

Cheta na n’ọnwa Juun nke afọ a, nwaada Ameh zipụtara ozi n’akara Instagram ya kọwa n’agwọ nọ n’akịrịka na ndụ ya dịka o kwuru na ọ nwere onye chọrọ ịkpụpụ ya ụlọikpe n’ihe ọ nweghị ike ruzuo ọrụ mmadụ nyere ya.

N’ihe onyonyo ahụ o kwuru “Nsogbu mmụọ ịda mba nke metụtara ụbụrụ isi m bụ ihe mere m iji ghara imezu ọrụ a”.

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị mmadụ nwereike ha agaghị aghọta nsogbu ụbụrụ isi a ji ya aka.

Ada Ameh

Ebe foto si, Instagram/Ada Ameh

Ihe i kwesịrị ị ma maka Ada Ameh

Adah Ameh

Ebe foto si, Instagram/AdaAmeh

  • Ọ bụ onye ejije Nollywood malitere ọrụ ya kemgbe afọ karịrị 25
  • Ihe ejije bupụtara aha ya n’ihu ọha bụ ejije ‘Domitilla’
  • O meela ọtụtụ ejije ndị ọzọ dịka 30 days in Atlanta bụ nke wuru ewu
  • Ọ nọ n’isi ejije na-amasị ọha a na-egosi na DSTV bụ ‘The Johnson’
  • A mụrụ ya afọ 1974
  • Ọ bụ onye Benue steeti
  • Ọ nwetala ọtụtụ nturuugo dịka onye ejije na Naịjirịa nakwa n’akụkụ ụwa ndị ọzọ dị ịcheịche
  • Nwa ọ mụrụ naanị ya bụ Aladi Godsgift Ameh lara mmụọ n’ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba, 2020. Kemgbe nke a mere, ndụ ya gbanwere n’ụzọ ọjọọ ma na-akwanye njọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya

Dịka nwaada Ameh bụ onye ihe na-amasị ọha, ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia ezipụta ozi na-ekwu etu obi dị ha maka ozi ọnwụ ya. Ozi arịrị ndị gosiri n'ezie na ọ bụ onye ọha hụrụ n'anya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4