Niger Coup: Sanusi agaala zute onyeisi ọchịchị ndịagha Nijie

Ebe foto si, Halimah Sa’diya S/Twitter
Emir chịburu Kano bụ Sanusi Lamido Sanusi gara mba Nijie ga zute onyeisi Ọchịchị ndịagha mba ahụ bụ Generalụ Abdourahmane Tchiani.
Nke a na-abịa ka ọ gachara abalị asaa otu jịkọrọ mba ndị nọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ Economic Community of West African States (ECOWAS) Ecowas nyere Tchiani na ndị agha ibe ya weghara ọchịchị n'ike na mba ahụ.
Sanusi na Tchiani nwere ọgbakọ na Niamey,isiobodo Nijie nke a na-eche na ha kpara ihe metụtara ọnọdụ onye ekwe, ibe ya ekwe dị n'etiti ndị ndu agha Nijie na otu Ecowas.
N'abalị 26 nke ọnwa Julai afọ 2023, ndịagha Nijie chụturu onyeisiala mba ahụ bụ Mohammed Bazoum n'ọkwa ma weghara ọchịchị.

Ebe foto si, Halimah Sa’diya S/Twitter
Otu Ecowas nke Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu nọ n'isi ya dịka onyeisioche nyere ndịagha ahụ weghara ọchịchị abalị asaa irutu ma nyeghachi Bazoum ike ọchịchị, e meghị otu ahụ, ha ewere aka ike soo ha mana ndịagha ahụ kwechiri.
Ka ọ dị ugbua, otu Ecowas etinyela mmachi na iihe ntaramahụhụ dị iche iche megide Nijie nke gụnyere ịkwụsị ife ụgbọelu gafee mba ndị dị n'otu Ecowas, mgbubi ọkụ latrik nke Naijiria na-enye bu mba ahụ na ihe ndị ọzọ.
Ndịagha ahọpụtala Ali Mahaman Lamine Zeine dịka Praịm minista ha ọhụrụ

Ebe foto si, AFP
Onye ndu ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba Niger bụ ọchịagha Abdourahmane Tchiani ahọpụta onye bụbu minista akụnaụba mba ahụ dịka praịm minista ọhụrụ ha.
Ali Mahaman Lamine Zeine ga-anọchi anya Mahamadou Ouhoumoudou, bụ onye mere njem na mba ofesi mgbe e weere ọchịchị n’ike ahụ.
Akụkọ kwuru na Zeine nọ n’ihe dịka agbata afọ iri ise ma rụọ ọrụ dịka onye nchịkọta obiọchịchị nakwa minista akụnaụba site n’afọ 2001 ruo mgbe ndịagha chụturu Onyeisiala Mamadou Tandja n’afọ 2010.
Ọnụ na-ekwuru ndịagha kwupụtara nhọpụta ya n’ihe onyonyo TV gọọmenti nwe a kpọrọ Télé Sahel n’abalị Mọnde.
Zeine arụọla ọrụ n’ụlọakụ ‘African Development Bank dị na mba Chad, Ivory Coast nakwa Gabon na nso nso a dịka otu ngalaba mgbasaozi n’ịtaneti bụ Actu Niger siri kwuo.
N’otu aka ahụ ndịagha họpụtakwara ọchịagha Amadou Didilli dịka onyeisi kọmitii na-ahụ maka udo nakwa ọchịagha Abou Tague Mahamadou dịka onyeisi nchịkọta ndịagha.
A kpọpụtara aha Ibro Amadou Bachirou dịka onyeisi ndị ọrụ onyendu ha ebe Halibou Assoumane bụ onyendu ndị nchekwa onyeisiala a kpọrọ ‘presidential guard’.
Niger Coup: Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa ajụla ịnabata ka a gaa ọgụ na mba ahụ

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria agwala Onyeisioche otu 'Economic Community of West African States bụ ECOWAS n' ịchafụ bụ Bola Tinubu ka ya na ndị ogbo ya ndị ndu obodo dị ọzọ n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka ka ha jiri nwayọọ soro okwu metụtara mweghara ọchịchị n'ike mere na mba Nijie na nso nso a.
N'ịzụụka gara aga, ndịagha mba Nije kwaturu Onyeisiala mba ahụ bụ Mohammed Bazoum n'ọkwa ya ma weghara ọchịchị.
N'ọgbakọ imeụlọ nke ndị sinetọ mere ụbọchị Fraide iji kpaa maka akwụkwọozi nke Tinubu zitere ha ka ha binye aka na mkpebi nke Ecowas kpebiri, ha katọrọ nkwatu a kwaturu ọchịchị n'ike na Nijie, ma sị na ọ ka mma ka Ecowas si ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mmekọrịta mba na ibe ya dozie okwu ahụ .
Ha gakwara n'ihu kpokuo Ụlọomeiwu nke Ecowas ka ha nye aka ịhụ na ekpeziri okwu ahụ.
Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Godswill kwuru sị, " Ụlọomeiwu Ukwu na-akpọku Onyeisiala Naijiria dịka onyeisioche otu Ecowas ka o tinye uchu n'isi ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa mmekọrịta mba na mba dozie nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị dapụtara na Nijie."
“Ụlọọmeiwu na-akpọku Ụlọomeiwu nke Ecowas ka ha katọkwa ihe mere na Nijie ma soro tụpụta alo etu a ga-esi mezie ya."
Cheta na nsonso a Onyeisiala Bola Tinubu zigara Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria akwụkwọozi ma rịọ ka ha binye aka n'akwụwkọ na Naijiria dịka otu mba nọ n'Ecowas ka eme ihe nile ọ ga-ewe ịji chụta ndị agha weghara ikike ọchịchị n'ike na Nijie.
Otu Ecowas nke Tinubu nọ n'isi ya kpebiri ịkpachi enyemaka akụnaụba a na-enyebu mba Nijie, ma kpọkwaa oku ka mba niile so n'otu Ecowas nakwa mba dị ọzọ rube isi na ntaramahụhụ ha nyegara Nijie.
Ha nyekwara ndị agha mba Nijie otu izuụka iji nyeghachi Bazoum ọchịchị, dịka ha kwuru na ha nwere ike iji aka ike manye ndịagha ahụ ka ha rituo.

Ebe foto si, Screengrab
Olee ọnọdụ ndị isi mba n'Ecowas kwụ maka mwepụ ọchịchị onyekwuo uche ya na mba Niger?
Otu Ecowas amachiela ụgbọelu ọbụla ifefe maọbụ ifeba mba ahụ
Otu 'Economic Community of West African States' (Ecowas) amachiela ụgbọelu ọbụla ifefe maọbụ ifebanye na mba Niger Republic, bụ nke a na-akpọ 'no flight zone' na bekee.
Otu ahụ, nke onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu bụ onyeisioche ya, nwere mkpebi a n'ọgbakọ gbatagbata ha mere n'ụbọchị Sọnde n'Abuja, Nigeria, banyere ọnọdụ ọchịchị na mba Niger Republic, ebe ndị agha mba ahụ chụturu onyeisiala ha bụ Mohamed Bazoum, ma weghara ọchịchị.
Nke a bụ otu n'ime ntaramahụhụ nke Ecowas tinyere iji manye ndị agha ahụ ka ha nyeghachi ndị nkịtị ọchịchị.
Mkpebi a pụtara na emechiela oke jikọrọ mba Niger Republic na mba Afrịka ndị ọzọ ma n'ikuku ma n'ala.
Lee mkpebi Ecowas nwere n'ọgbakọ a:
- Mohamed Bazoum ka bụ onye ha ma dịka onyeisiala mba Niger Republic, naanị ihe ọbụla Bazoum mere maọbụ nke o nyere ikike ka e mee, ka Ecowas ga-anabata
- Ha katọrọ atụmatụ ndị agha iweghara ọchịchị n'ike, nakwa ijichi Mohamed Bazoum na ndị ezinụlọ ya
- Ha kpọrọ oku ka atọhapụ onyeisiala Mohamed Bazoum ma tinyeghachi ya n'ọkwa onyeisiala
- Agaghị anabata ịgba arụkwaghị m ọbụla nwereike isi n'aka onyeisiala Mohamed Bazoum
- Ha ga-ahụta njichi ndị agha jichiri Mohamed Bazoum dịka ntọrọ, ma jidekwa ndị agha jichiri ya ma o nwee ihe ọbụla mere Bazoum na ndị ezinụlọ ya
- Ọ bụrụ na otu izuụka gachaa, Ecowas ga-eme ihe ọbụla ha nwereike iji weghachite ọchịchị usoro iwu na mba Niger, nke nwereike ịgụnye iji aka ike. N'ihi nke a, ndị isi agha nke mba niile nọ n'otu Ecowas ga-enwe ọgbakọ na-egbughị oge ọbụla
- A ga-ejide ndị niile aka ha dị n'ọgbaaghara nakwa mwakpo nke ndị aka ha dị ọcha na mba Niger
- Ecowas katọrọ okwu nkwado ọbụla si n'aka ndị ọchịchị mba ụwa dị icheiche maọbụ ndị agha ọrụ ngo ụfọdụ gbasara etu ndị agha mba Niger si weghara ọchịchị n'ike
- Ha kelere mba ụwa dị icheiche ndị katọrọla ihe ndị agha mba Niger mere
- Họpụta otu onye ma ziga ya na mba Niger Repọblik ka ọ ga nye ndị agha ahụ weghaara ọchịchị ozi a si n'aka otu Ecowas
Otu Ecowas kpebikwara ịkpachi enyemaka akụnụba a na-enyebu mba Niger, ma kpọkwaa oku ka mba niile so n'otu Ecowas, nakwa mba ụwa dị icheiche ka ha rube isi na ntaramahụhụ ndị a.
Ha nyekwara ndị agha mba Niger otu izuụka iji nyeghachi Mohamed Bazoum ọchịchị, dịka ha kwuru na ha nwereike iji aka ike manye ndị agha ahụ ka ha mee nke a.
"Afrịka etopụtala ugbua, anyị agaghị anabatakwa mweghara ọchịchị n'ike maọbụ nkụsa usoro iwu," Onyeisiala Bola Tinubu kwuru dịka ọgbakọ ahụ bịara na njedebe.
"Dịka ndị ndu n'Afrịka, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ịhụ na udo na ọganihu dị n'Afrịka site n'itinye ọdịmma ndị nke anyị n'ihu n'ihe niile anyị na-eme.
"Anyị ga-akwụdosi ike oge niile n'ịkwado ndị nke anyị n'ụzọ nnwereonwe, ọ bụghị site n'ikike nke egbe."
Anyị ma na ndị Ecowas na-achọ iwakpo mba anyị - Ndị Agha Niger

Ebe foto si, RTN
Tupu e nwee ọgbakọ Ecowas nke ụbọchị Sọnde, onyeisi ndị agha ahụ weghaara ọchịchị na mba Niger kwuru na ha ma na ihe e ji kpọọ ọgbakọ ahụ bụ "iji hazie atụmatụ etu ndị agha Ecowas ga-esi buso wakpo mba Niger n'obodo Niamey".
"Ha chọrọ ime nke a site n'enyemaka mba Afrịka ndị ọzọ ndị na-esoghi n'otu Ecowas, nakwa enyemaka ụfọdụ mba ndị nọ na Ọdịda Anyanwụ ụwa, mana anyị agaghị agbachị nkiti ma nke a mee, anyị ga-ebusokwa ha agha," ka ndị agha ahụ kwuru.
Cheta na otu African Union ekwuola na ha na-enye ndị agha mba Niger naanị izuụka abụọ iji hafee ọchịchị n'aka ndị nkịtị.
Ha katọrọ etu ndị agha ahụ si weghara ọchịchị n'ike, ma kwuo na ọ dị mwute etu ndị agha iweghara ọchịchị n'ike si arị elu n'Afrịka ugbua.
Niger Republic: Ecowas agaghi anabata nkwatu ọchịchị na Nijie- Onyeisioche

Ebe foto si, Bola Tinubu / AFP
Cheta na dịka akụkọ gbasara mweghara ọchịchị n'ike na mba Niger fesara n'ụbọchị Tuzde, Julaị 25, 2023, Onyeisi oche otu Ecowas bụ Bola Tinubu, kwuru na ha agaghị anabata ihe na-eme na mba ahụ.
Ndịagha mba ahụ obi adịghị mma gbachiri okporoụzọ e si abanye obi onyeisiala mba ahụ n'ụtụtụ Wenezde dịka a na-ebioo ebubo na ha chọrọ ịkwatu onyeisiala mba ahụ bụ Mohamed Bazoum n'ọkwa bụ onye a họpụtara na ntuliaka e mere n'afọ 2021.
Mana Onyeisioche Ecowas bụ Bola Tinubu kwuru n'ozi o wepụtara n'ehihe Wenezde na "Ndị ndu ECOWAS mna ndị nile hụụ ọchịchị onyekwuouche ya na ha agaghị anabata ọnọdụ ọbụla ga-ekposa ọchịchị onye kwuouche ya nke mba ahụ."
Nijie bụ mba nkwatu ọchịchị na-emekarị. Kemgbe afọ 1960 ha nwere nnwereonwe, e nweeela mweghara ọchịchị n'ike ụgbọrọ anaọ.
Ndịagha agbachiela ụzọ e si abanye obi Onyeisiala mba Niger Republic

Ebe foto si, AFP
Ndịagha mba Nijie agbachiela obi onyeisiala mba Nijie bụ Mohamed Bazoum na Niamey, isiobodo mba ahụ.
A nụghị ụda egbe ọbụla mana o doghị anya ma e nwere ndị chọrọ iwehghara ọchịchị n'ike na mba ahụ.
Ụlọọrụ onyeisiala kwuru n'ozi ha wepụtara na Twitter na ndị nche na-eche onyeisiala gbaliri inweta nkwado ndịagha na mbọ ha ịgba ọchịchị onye kwuouche ya mgba okpuru mana na o nweghị isi.
Ụlọntaakụkọ AFP kwuru na Onyeisiala Mohamed Bazoum na ezinaụlọ ya nọ n'ụlọ ha.
Otu onye a kpọghị aha ya gwakwara ụlọ ntaakụkọ ahụ na ihe mere bụ 'iwe kpusuru ndị agha. maka na a na-akpa ya bụ ihe.
" Onyeisiala na ezinaụlọ ya nọ ọfụma. Ndịagha na ndị nche Onyeisiala dị njikere iwakpo ndị aka ha dị n'ihe na-eme," dịka ụlọọrụ onyeisiala si kwuo.
Akụkọ kwuru na aka chịrị mba ahụ pụrụ n'oche na nsonso a bụ Mohammed Issoufu na ndị onyeisiala gara aga na-akpa etu a ga-esi ahụ na okwu ahụ aghaghị n'ihu.
Nijie so na mba dị n'ọd̄ịda Anyanwụ Afrịka a na-akwatukarị gọọmentị n'ọkwa n'ike.
Kemgbe afọ 1960, e nweela nkwatu ọchịchị ugboro anọ ma nwekwa ọtụtụ mgbe a nwalere ime nke a.














