Ọ bụ eziokwu na INEC na-enye ndị bi na Niger Republic PVC?

Akụkọ ụgha

Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) akọwaala na ọ bụghị eziokwu na ha nwere ogige ebe a na-edebanye aha ndị ga-atụ vootu na mba Niger Repọblic.

Nke a na-abịa dịka ngalaba mgbochi akụkọ ụgha nke BBC mere nnyocha gbasara akụkọ na-efegharị nke kwuru na Inec nwere ogige iri abụọ na otu ebe ha na-edebanye aha ndị mmadụ na Niger Repọblik.

Cheta na ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka na-aga n'ihu ugbua n'akụkụ Naịjirịa niile.

Ebee ka akụkọ ụgha a si?

PVC Registration

Ebe foto si, YIAGA/Twitter

Nkọwa foto, Ndị na-edebanye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka na 'Old Parade Ground', Abuja

Akụkọ a malitere site n'akara Facebook a kpọrọ Nche Nwabunike.

mana nnyocha BBC mere gosiri na akara Facebook a yiri nke adịgboroja.

Iji maa atụ, onye a nwere naanị ndị enyi itoolu na facebook, onweghịkwanụ ihe ọbụla o dere gbasara onwe ya, ewezuga naanị otu foto o tinyere.

Ụdị akara facebook dị otu a bụ nke a na-ejikarị ekesa akụkọ ụgha, dịka nnchọpụta BBC sirila gosi n'oge gara aga.

Onye ọzọ kesara akụkọ a bụ onye aha ya bụ mazi IK Ijezie, onye tinyere foto ebe ndị mmadụ kwụ n'ahịrị, iji kọwaa na ebe ahụ bụ mba Nigeri Repọblik, mana ọ bụghị eziokwu.

Foto ahụ Ijezie tinyere adịlaarị n'ịntaneetị kamgbe afọ 2018. ọ bụ n'Ekiti Steeti ka e sere ya oge a na-akwado ime ntuliaka ọkwa gọvanọ n'afọ ahụ.

Ọtụtụ ndị ọzọ ekesakwaala akụkọ ụgha a n'ọgbakọ soshal midia ndị ọsọ dịka Twitter, Whatsapp na ndị ọzọ.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị Inec bụ Festus Okoye gwara BBC na akụkọ a bụ asị.

Okoye kwuru na iwu akwadoghị Inec ime ihe ọbụla na mpaghara ọbụla na-abụghị na Naịjirịa.

"Onweghị etu anyị ga-esi nwee ọgbọ ndebanye aha na mba Niger Republic," Okoye kwuru.

"Ọ bụrụgodu na mmadụ debanyere aha nke ya site n'ọba ozi anyị n'ịntaneetị, onye ahụ kwesịkwara ịga n'ụlọọrụ anyị iji debanye aha ya nke ọma."

Okoye kwuru na ọgbọ ebe a na-atụ vootu na Naịjirịa niile dị 176,846 n'ọnụ ọgụgụ; "onweghị nke dị na mba ọbụla na-abụghị Naịjirịa".

Ọ dọrọ ọha obodo aka na ntị ka ha keghara akụkọ ahụ anya maka na ndị na-agbasa ya bụ ndị chọrọ iji agbụrụ nakwa okpukperechi kewaa Naịjirịa.