Ọ bụ eziokwu na e kweghi ndị Igbo gbata PVC n'Igbede?

BBC Disinformation Unit chọpụtara na ihe onyonyo ahụ sị na ndị ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) na-akpachapụ ndị Igbo n’idebanye aha maka PVC bụ akụkọ nduhie.
Ihe onyonyo ahụ nke e sere n’akụkụ ụlọọrụ Inec dị n’Igbede okpuruọchịchị Ojo Legọs Steetị gosiri ka ndị mmadụ na-alụ ọgụ ebe ndị ọzọ na-ekwu na e kweghi ha debanye aha maka na ha bụ ndị Igbo.
Mana anya hụrụ ka ihe jiri mee gwara BBC na ọgbaghara ahụ abụghị maka na ndị ọrụ Inec jụrụ inye ndị mmadụ ohere idebanye aha maka PVC.
Otu onye hụrụ ya, Chinaza Ikemeziem gwara BBC na ọ bụ ndị bịara idebanye aha ha siri ọnwụ na onye ọrụ Inec agaghị eji ngwa ọrụ esi n’ọrụ ha apụ.
“Ihe mere bụ na igwe mmadụ bịara idebanye aha maka PVC maka na ahịa Alaba mechiri n’ihi ya, nke mere ọrụ ji karịa ndị Inec ahụ.
“Ihe mere bụ na onye ọrụ Inec chọrọ iburu ngwa ọrụ aga ebe ọzọ a na-edebanye aha, ndị ahụ ajụ sị na ọ agaghị ibu ya pụọ nke a butere ọgụ.
“Mana tupu ọgụ ahụ adapụta, o nweghi ihe dịka ịkpa oke agbụrụ megide ndị mmadụ maka idebanye aha.
“Nsogbu bụ na naanị otu ngwaọrụ ka e ji edebanye aha n’ụlọọrụ ya mere mgbe ha chọrọ iburu ngwaọrụ aga ebe ọzọ ndị mmadụ ajụ.

Otu onye ọzọ bụ Waheed gwara BBC na e tiri ya ihe maka na o nyeere onye ọrụ Inec aka gbaa ọsọ mgbe ndị ahụ jichiri ya. “O nwere ngwaọrụ ndị Inec na-ebuga ebe ndị ọzọ a na-edebanye aha, bụ ndị na-enweghi ike ịbịa n’ụlọọrụ ha.
“Ụfọdụ ndị bịara ebe ahụ jụrụ na a gaghị ebe ya apụ ma ọ bụrụ ma edebanyeghi aha, a gbara mbọ ka m kọwaara ha mana ha jụrụ.
“Ha wakporo onye ọrụ Inec nke nwoke ebe nke nwaanyị ji ọkada gbaa ọsọ, a dọkara uwe m ebe m na-achọ ịzọpụta nwoke ahụ.
“Ha wakpokwara otu onye okenye obodo ahụ nke mere ndị ntoroọbịa obodo ahụ jiri bịa lusoo ha ọgụ.
Waheed gwara BBC na o nweghi mgbe ndị ọrụ Inec gbochiri ndị mmadụ idebanye aha.

Ọgbaghara a mere n’akụkụ ahịa Alaba dị n’Ojo Legọs.
Onyeisi ngalaba ‘electronics’ n’ahịa ahụ bụ Paulinus Ugochukwu sị ka e mechie ahịa otu ụbọchị ka ndị ahịa nwee ike gbata PVC maka ntuliaka afọ 2023.
Ugochukwu sị na ọ bụ eziokwu na o nwere ebe ọgbaghara dapụtara kama na o nweghi ndị egbochiri idebanye aha.
“Anyị nụrụ maka ihe mere n’Igbede, mgbe anyị nụrụ ya anyị kpọrọ ha sị ka ebe niile dere jụụ.
“Anyị na Inec na-arụkọ iji hụ na onye ọbụla debanyere aha ha maka inwete PVC”.








