Akwa Ọkụkọ enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ

Akwa Okuko

Ebe foto si, Akwa Ọkụkọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyonyo na-efegharị na soshal midia ugbua na-egosi na otu dibia aha e ji mara ya bụ Akwa Ọkụkọ tiwara akị, onye ndị ntọ tọọrọ n'ụbọchị 23 nke ọnwa Julaị 2023, enwerela onwe ya.

Ndị ojiegbe wakporo obodo Oba, dị n'okpuruọchịchị Idemmili South, ma tọrọ dibia ahụ n'ụlọ ndina ọ rụrụ, bụ ebe ya na ọtụtụ mmadụ nọ enwe aṅụrị.

Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ gburu ụfọdụ ndị na-eche nche n'ụlọ ndina ahụ tupu ha tọrọ ya bụ Dibia.

Mana n'ihe onyonyo nke BBC hụrụ n'ụtụtụ Satọde a, dibia a ama dịka Akwa Ọkụkọ tiwara akị, nọ na-akọrọ ndị mmadụ ihe ọ gabigara n'aka ndị ntọ ahụ oge ha kpụụrụ ya.

"Ndị ahụ obi adịghị ha mma, mana onweghị onye m ji ụgwọ, erighi m ego mmadụ, onweghị onye m mejọrọ," dibia ahụ kwuru.

Ndị uweojii Anambra ekwubeghị ihe ọbụla gbasara nke a. Toochukwu Ikenga, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti azaghachibeghị ozi anyị zigaara ya n'ekwentị.

Akwa Tiwara Akị ezigbo aha ya bụ Chidozie Nwangwu

Ebe foto si, Facebook/Akwa Tiwara Aki

Nkọwa foto, Akwa Tiwara Akị ezigbo aha ya bụ Chidozie Nwangwu
Akwa Okuko Tiwara akị bụ dibịa anya nzu a ma ama

Ebe foto si, Akwa Okuko/Facebook

Cheta na kepukepu fesaburu n'ụbọchị Tuzde, 25 Julaị, na atọhapụla dibia ahụ, mana o mechara bụrụ na akụkọ ahụ abụghị eziokwu.

N'ụbọchị ahụ, BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra bụ Tochukwu Ikenga n'ụtụtụ Tuzde 25 Julaị, o kwuru na ha enwetebeghi ozi banyere ntọhapụ dibịa anya nzụ a.

Kepukepu a gara n’ihu kwuo na ọ bụ ndị uweojii bịara inwuchi ndị ekperima nọ n’ụlọ ndịna nke Akwa Okuko nwee, bịara nwuchie Akwa Okuko ma buru ya pụọ.

Tochukwu kwuru na ọ bụ asị na aka ndị uweojii adịghị na nwuchi maọbụ ntọrọ Akwa Okuko.

Ọnọdụ enweghị nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa agbaliela elu nke ukwu n'ime afọ olemole gara aga.

Akụkọ mwakpo ndị ojiegbe, ntọrọ mmadụ, nakwa ogbugbu mmadụ bụ ihe a na-anụ kwa mgbe kwa mgbe na steeti ise nke mebere mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjiria.

Etu e si tọrọ dibịa anya nzụ Akwa Okuko Tiwara Aki n'Oba

Akwa okuko tiwara aki

Ebe foto si, Akwa okuko/Facebook

Ndị uweojii Anambra steeti kọwara etu e si tọrọ Akwa Okuko ma sị na-eme nyocha maka ya.

Tochukwu Ikenga kwuru na ha na-esi imi n’ala ugbua iji nwuchie ndị tọọrọ nwamadị a.

O kwuru na a tọọrọ Akwa ọkụkọ n’ụlọ ndina ọ rụrụ nke dị n’obodo Oba n’okpuruọchịchị Idemili South nke Anambra steeti mgbe o ji ọkara gafee elekere iri na otu nke abalị (11:30pm)

Akụkọ na-ekwu na ndị ojiegbe tọọrọ ya gbagburu ndị nchekwa ya mmadụ abụọ tupu ha tọrọ ya.

Tupu akụkọ a apụta o nwebeghi onye ma ọ bụ ndị maara ndị ojiegbe wakporo ma tọọrọ Akwa Okuko.

Ihe i kwesịrị ịma maka Akwa Okuko

Dibịa anya nzụ a ma ama

Ebe foto si, Akwa Okuko/Facebook

  • Ezigbo aha Akwa Okuko bụ Chukwudozie Nwangwu, a mụrụ ya n'afọ 1998.
  • Ọ bụ onye obodo Oba dị n'okpuruọchịchị Idemili South nke Anambra Steeti.
  • Ọ bụ onye dibịa ọdịnala a ma ama nke mere e jiri etu ya aha "Akwa ọkụkọ tiwara akị"
  • Ọ bụkwa onye ojiego achụ ego nwere ụlọ ndịnaa kapọrọ 'Triple P' dị n'Oba.
  • Ọ na-eji soshal midia nakwa ịntanetị agbasa ozi banyere ọrụ dibịa ya.
  • Ọ bụkwa onye ọrụ enyemaka nye ụfọdụ ndị mmadụ ọkachasị ndị ogbenye
  • A katọọrọ agwa ya n'oge gara mgbe ọ kpọrọ otu ụkọchukwu Anglịkan ka ọ gbapee ụlọ ndina ya nakwa oge fere ego n'isi otiegwu ụka Kraịst bụ Gozie Okeke. O na-ekesa ekpere nakwa egwu okpukperechi ya n'ịntanetị nakwa soshal midia.
  • Ọ na-egosikaarị akụnaụba ya na soshal midia nke gụnyere ọtụtụ ụlọ na ụgbọala dị iche iche.
  • Akwa Okuko a lụọla nwaanyị.