Prince Gozie Okeke: O kwuola ihe mere o ji gụọrọ dibia egwu

Gozie Okeke bụ onye na-eti egwu ụka Kraịst abanyela n'akụkọ asiri ọzọ

Ebe foto si, Gozie Okeke

Nkọwa foto, Gozie Okeke bụ onye na-eti egwu ụka Kraịst abanyela n'akụkọ asiri ọzọ

Gozie Okeke bụ otiegwu a ma ama na Naịjirịa ọkachasị n'etiti ndị okpukperechi Kraịst, ekwuola nke ọ sị bụ eziokwu n'okwu na-efegharị na soshal midia banyere ya ugbua.

N'ihe onyonyo ọhụrụ o zipụtara n'ụtụtụ Sọnde, Okeke sara ndị na-atụ ya aka ma kpụrụ ya n'ọnụ banyere ihe onyonyo ọzọ fegharịrị n'izu gara gara ma kwuo:

"Kedụ ihe bụ nsogbu unu, sọ ihe unu ma bụ ịkatọ mmadụ ka unu abụ ndị kachasị dị nsọ..."

Gịnị na-ese?

Dịka Gozie Okeke bụ onye na-agụ egwu ụka, aha ya abanyela n'ọtụtụ asịrị nke tetọrọ etu ndị mmadụ si ahụ ya.

Mana akụkọ ọhụrụ nke a mụnyere ọkụ n'izu gara aga mgbe otu ihe onyonyo malitere fegharịwa na soshal midia.

Ihe onyonyo ahụ gosiri ka Okeke na-agụ egwu na-ekwu okwu iti aka n'obi nye otu nwoke e mechara chọpụta na ọ bụ dibia afa.

Egwu ọ kpụ n'ọnụ na ya bụ ihe onyonyo kwuru:

"Ma ndị nọ n'Anambra nakwa na Naịjirịa niile, unu ahụla onye na-enye ego ka Akwa?"

Ndị nọ ebe ahụ sara ya "mba", ọ gara n'ihu na-agụ egwu otuto nye nwoke ahụ nke ọha chọpụtara ugbua na aha ya bụ "Akwa".

Ihe mere kpalitere ọtụtụ akụkọ dịka ndị mmadụ katọrọ ya na ọ gụrụ nwoke onye dibịa egwu otuto ebe ọ bụ onye na-agụ egwu ụka Kraịst.

Ịgụ egwu ụka Kraịst bụ ihe e ji mara Gozie Okeke na Naịjirịa nakwa na mba Afrịka dị iche iche

Ebe foto si, Gozie Okeke

Nkọwa foto, Ịgụ egwu ụka Kraịst bụ ihe e ji mara Gozie Okeke na Naịjirịa nakwa na mba Afrịka dị iche iche

Kedụ ka ihe a si mee n'ezie?

N'ihe onyonyo ọhụrụ a nke Gozie Okeke zipụtara n'ụbọchị Sọnde, 23 Jenụwarị, 2022, ọ kọwara ihe ọ sị bụ eziokwu banyere akụkọ a na-akpalite nkatọ aha ya.

O kwuru na ihe mere bụ na e nwere ndị kpọrọ ya oku ka ọ gụọrọ ha egwu na mmeme a mere n'Oba, Anambra steeti.

O kwukwara na mgbe ọ nọ n'ọrụ ịgụ egwu, na e nwere otu nwoke batara bọwaya ego nke mere o ji tuwe ya aha n'egwu ya.

Na ya bụ ihe onyonyo, egwu Okeke gụrụ gosiri na ọ ma kpọmkwem onye nwoke ahụ bụ.

Nke a mere ka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na okpukperechi Kraịst anabataghị ka mmadụ kpaa ụdịrị agwa a.

Gịnị ka Gozie Okeke sara ndị a?

N'ihe onyonyo a pụtara n'akara Facebook Okeke, o gosiri na obi adighi ya mma chaa chaa maka ihe ndị mmadụ kwuru banyere ya n'egwu ọ gụrụ nwoke dibịa ahụ.

O ji iwe kwuo: "Ahụghị m ihe ọjọọ dị n'ihe m mere, Akwa bọrọ m ego, gosi m ịhụnaya nke mere m ji gụọrọ ya egwu otuto".

O jikwa iwe kwuo na ndị na-akatọ ya na-eme ka ọ bụ ha bụ ndị kacha ndị nsọ.

Na ngwụcha, o kwuru na ọ ga-atụ ndị ahụ n'anya mgbe ụbọchị ikpe nke oge ikpeazụ ruo, na Akwa ga-esonye na ndị nsọ nke eluigwe, ebe ha bụ ndị nkatọ ga-anọ n'ọkụ mmụọ.