Mbaka DSS: Fada Mbaka bunyere m ụgbọala 'SUV' ọhụrụ - Prince Gozie Okeke

Ebe foto si, Prince Gozie Okeke Instagram
Otiegwu a ma ama dịka Prince Gozie Okeke ewepụtala onyonyo gosiri ebe ọ nọ n'ime ụgbọala ọhụrụ.
Onye na-ekwu okwu n'onyonyo ahụ kwuru" lekwa ụgbọala ọhụrụ Fada Ejike Mbaka bunyere Prince Gozie Okeke dịka ihe onyinye nke afọ ọhụrụ."
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Okeke nọ n'ime ụgbọala dịka onye ihe niile juru anya.
O depụtakwara n'akara Instagram ya "na ọ na-ekele Jesus. "Nna m Fada Ejike Mbaka ị gaha anụ ozi si n'aka m." Chineke m dowe gị. A hụrụ m gị n'anya nke ukwu."
Cheta na Fada Mbaka ji abali ụka 'cross over' tipụta egwu ọhụrụ ya na Gozie Okeke tiri nke ha kpọrọ , "Hapụ Fr Mbaka".

Kpere m ekpere maka oku ọhụrụ DSS kpọrọ m - Fada Mbaka

Ebe foto si, Mbaka Fcaebook/Getty Images
Fada Ejike Mbaka bụ onye ndu Adoration ministries dị n'Enugwu steeti ekwuola na ndị Department of State Services (DSS) akpọọla ya oku n'Abuja.
Ọ gwara ndị otu ya nke a ụnyaahụ bụ Sọnde, abalị abụọ nke ọnwa Jenụwarị, 2022.
Ọ gwakwara ndị nso nso ya na Nnamdi Kanu na-alụ ezigbo ọgụ, na Chukwu ga-ekpuchi ya.
O kwuru na a ga ha atọghapụ Kanu bụ onye ndị DSS ji kamgbe ọnwa Juun nke afọ 2021.
O kwukwara ka ndị mmadụ nụrụ olu ya gbasara mmaja ndị DSS na-amaja ya, ma jide ha ma o nwee ihe mere ya.
O kwuru na ọ bụ onye ọ na-agaghị akpọpụta aha ya zitere ya ozi oku ndị DSS ma kwuputekwa na ụdịrị a ozi bịara ya n'ọnwa Juun nke afọ 2021.
Mbaka gwara ndị nso nso ya ka ha tinye ya n'ekpere makana ndụ ya nwereike nọrọ na nsogbu.
Cheta na Mbaka kwuru na Nnamdi Kanu bụ nwa ya nwoke n'abalị a na-eme ụka ịbata afọ ọhụrụ, ma kpekwara ya ekpere.
Egwu ọhụrụ Fada Mbaka tiri na ihe o kwuru maka Nnamdi Kanu

Ụkọchukwu ụlọụka Adoration bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na isi ekpere ya na-afọ ọhụrụ a bụ ka gọọmenti Naijiria tọghapụ Mazi Nnamdi Kanu.
Mbaka kwuru nkea oge ọ chikọbara ekpere"cross over" nke eji si afọ 2021 bata n'afọ ọhụrụ 2022.
Puku kwụrụ puku igwe mmadụ juputara n'ụmụchigbo iji-Nike ebe ọ kara ya bụ ụka uchichi batara afọ ọhụrụ.
Fada Mbaka kpere ọtụtụ ekpere ma bukwaa amụma maka Naijiria, mana isi okwu o jiri bido bụ na ikpe ekpere ka Nnamdi Kanu eji eji nwere onwe ya.
Mbaka kwusiri ike na ya ga na agọzi Nnamdi Kanu n'ihi na ihe ya na amasi ya, ma gwa onye ọbụla bụ ụkọchkwụ achọghị igọzi ya ka ọbụo ya ọnụ.
Mbaka kwukwara na ọ ga-amalitezi ekpere uchichi friday ọbụla tinyekwara nke wenezde na ọnwa febuwarị 2022.
Cheta na ya bụ Ekpere Adoration abali Fraịde bụ nke ọkwụsịrị ka mgbe 2020 n'ihi ọrịa Corona Virus.
Ugbua Fada Mbaka emechiela Adoration ka ozuo ike otu onwa ma malite ekpere na Februari 2022.
Kama ọ were ohere a we tipụta egwu ọhụrụ ya na Gozie Okeke tiri nke ha kpọrọ , "Hapụ Fr Mbaka".











