Father Ejike Mbaka video: 'Amụma Fada Mbaka buru n'isi Charles Soludo na 2013 mezuru' - Fada Mentor

Ebe foto si, AMEN/Facebook
Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu n'Adoration Ministry Enugwu, asaala ndị mmadụ maka ihe o kwuru gbasara Charles Soludo n'otu onyonyo na-efegharị na soshal midia.
N'ozi a si n'aka Fada Mentor gbasaa n'elu Facebook ndị ụlọụka Adoration, ha kwuru na ya bụ ihe onyonyo bụ ebe Fada Mbaka na-ekwu na "Ndị Eluigwe ajụla Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo na ntuliaka" si n'afọ 2013, mgbe Soludo na Willie Obiano mechara bụrụ gọvanọ Anambra steeti zọrọ oche ahụ.
Fada Mentor kwuru na nke ahụ gosiri na amụma Fada Mbaka buru n'isi Soludo mezuru dịka ọ na-azọtaghị ya bụ oche mgbe ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na enweghi onye Fada Mbaka họpụtara sị na ọ bụ ya ga-emeri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti nke afọ 2021.
O kwuru na ndị mmadụ na-akatọ Fada Mbaka maka ya bụ ihe onyonyo na-efegharị dịka ha na-ekwu ma ndị Eluigwe ọ kpọrọ aha a na-agbanwe agbanwe.

"Ndị Eluigwe" agbanwere n'amụma e buuru Soludo?
Fada Mentor kwuru na ọ bụ eziokwu na "Ndị Eluigwe" ga-agbanweli ọnọdụ ha mgbe ọbụla ha chọrọ.
O kwuru na nke ahụ bụ ihe ime mmụọ dị omimi, ma dụọ ọdụ sị ka ndị na-aghọtaghị ihe ime mmụọ gbaara ụdịrị okwu a ọsọ ka ha ghara ịnata abụmọnụ.
O kwuru na "Ndị Eluigwe" nwere ike ịjụ ekpere na ọchịchọ obi Soludo n'afọ 2013 n'ihi na ọ dịbeghi njikere maka ọchịchị oge ahụ, na e nwere ike ọ gaara abụ ajọ gọvanọ ma ọ bụrụ na ọ bịara na mmezu oge ahụ.
Soludo o mechakwara bụrụ gọvanọ?
Fada Mentor kwuru na ọ bụrụ na Soludo mechaa zọta ọkwa gọvanọ Anambra steeti, a mara na ọ bụ Chineke hụrụ na o tozuru ime ihe dị n'ịbụ gọvanọ.
Ọ kọwara na ụzọ Chineke abụghị ụzọ nke mmadụ, nke bụ na o nwere ike gbatụ 'brake' mgbe ị na-arịọ ya ihe n'ihi na ọ ma na oge gị erubeghi.
Cheta na Fada Mbaka kwuru n'izu gara aga n'ụlọụka ya na enwebeghi onye ọ họpụtara ga-abụ gọvanọ n'agbanyeghi na ndị dị ka Andy Uba, Charles Chukwuma Soludo na Godwin Maduka na-azọ ya bụ gọvanọ bụ enyi ụlọụka ya.
Onye bụ Fada Mbaka?
Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu ndị Katọlik bụrụkwa onyeisi ndị Adoration Ministry bụ nke o hiwere n'Enugu, Enugu steeti, Nigeria.
Ama ya dịka onye nwere nkwuweokwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ọdịmma ndị mmadụ.
Ama ya maka amụma ọ na-ebukarị kwamgbe.
Onye bụ Soludo?
Chukwuma Soludo bụ onye ahọpụtara dịka Gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka Novemba 6 2021.
Ihe gbasara akụnaụba na achọmta ego dokwere ya anya nke mere o jiri bụrụ onyeisi na bọdụ ụlọakụ ukwu na Naịjirịa.









