Etu itukwu ala n’akụkụ ahụ aja ga-esi beleta ọbara mgbali elu

'Plank' so n'ụdịrị megharị ahụ nnyocha ọhụrụ sanyesi gosiri nwereike ibelata ọnọdụ mgbali elu ọbara mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, 'Plank' so n'ụdịrị megharị ahụ nnyocha ọhụrụ sanyesi gosiri nwereike ibelata ọnọdụ mgbali elu ọbara mmadụ

Otu mpụtara nnyocha sanyesi na-ekwu na ụfọdụ usoro megharị ahụ dịka ndị nke a kpọrọ ‘wall squats’ maọbụ mmadụ itinye onwe ya n’ọnọdụ ‘plank’ so n’usoro kacha mma iji balata ọbara mgbali elu.

Ndị ọrụ nnyocha sayensi na mba Briten na-ekwu na ha chgọrọ ka ntuziaka e nyere maka ndụmọdụ megharị ahụ ndị nwere ọnọdụ ahụike kwesịrị ime tinyekwuo usoro megharị ahụ ndị nke a n’elu ndị nke e nyeburu n’oge gara aga dịka ịga iji, ịgba ọsọ, nakwa ịnya igwe.

Akwụkwọ mpụtara nnyocha nke e dipụtara n’akwụkwọ ‘British Journal of Sports Medicine’ gosiri na megharị ahụ e nyochara n’ahụ mmadụ 16,000 nyeereaka beleta ọnọdụ ọbara mgbali elu ha mana ụdịrị megharị ahụ nke ‘wall squats’ na ‘planking’ budara ya ala ruo etu ụdịrị nke ịga ọsọ, ịga iji nakwa ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Foto gosiri etu e si eme megharị ahụ 'plank'
Nkọwa foto, Foto gosiri etu e si eme megharị ahụ 'plank'

'The plank'

  • Ụdịrị megharị ahụ a bụ nke mmadu ga-edila ala, bido aka ya na’ala ma were aka abụọ ya bulie onwe ya elu.
  • Onye na-eme ụdịrị megharị ahụ ga-anọrọ n’ọnọdụ ahụ, kpatie azụ ya ma mee ka afọ ya sie ike ruo ihe ruru nkeji abụọ.
Foto gosiri etu e si eme megharị ahụ 'wall squats'
Nkọwa foto, Foto gosiri etu e si eme megharị ahụ 'wall squats'

'Wall squats'

  • Etu esi eme ụdịrị mmegharị ahụ nke a bụ mmadụ ịme ka o tukwuru ala ma bido azụ ya n’ahụ aja
  • Onye ahụ ga-ebuga ụkwa ya ihu pụọ ahụ aja ahụ ruo fịtị abụọ
  • Apata ya ga-anọ n’elu ma ghara iru ala
  • Ọ ga-aga anọ n’ọnọdụ ahụ ruo nkeji abụọ

Dọkịnta Jamie O'Driscoll nke mahadum Canterbury Christ Church na mba Briten kwuru na ụdịrị megharị ahụ a na-emetụta ahụ mmadụ etu dị iche karịa ndị nke ụdịrị ịgba ọsọ, ịwụ ụdọ, ịga ije nakwa ndị yiri ha.

Ọnọdụ ahụike nke ọbara mgbali elu na-eme ka ọbara na-agagharị n’ime ahụ mmadụ raa ahụ ngafe nke nwereike ibutere mmadụ obi nkolopụ nakwa mkpọnwụ ahụ.

A na-adụ ndị merela okenya ruo afọ 40 maọbụ gafee ka ha na-enyocha ọnọdụ mgbali elu ọbara ha kwa mgbe kwa mgbe.

Akara ọbara iri elu nọ n’okpuru 130/85mmHg bụ nke dị mma mana ọ rịa elu karịa akara 140/90 mmHg ị mara na ọ nọ n’ọnọdụ na-adịghị mma.

Na nnyocha ndị ọrụ sanyesi nke mahadum Canterbury Christ Church nakwa mahadum Leicester mere, ha natara mmadụ 15,827 ozi bụ ndị mere megharị ahụ ruo izuụka abụọ site nakwa site n’ozi ụlọ ahụike 270 malite n’agbata afọ 1990 na 2023, ha hụrụ na:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
  • Ọnọdụ ọbara iri elu ndị gbara ọsọ maọbụ nyaa igwe ruru 4.49/2.53mmHg
  • Ọnọdụ ọbara iri elu ndị buru ibu dị arụ maọbụ ‘kpụrụ ụzụ’ ruru 4.55/3.04mm
  • Ọnọdụ ọbara iri elu ndị mere nchịkọta ha abụọ ruru 6.04/2.54mmHg
  • Ọnọdụ ọbara iri elu ndị mere mgharị ahụ ndị dị ike ngwa ngwa n’obere oge ruru 4.08/2.50mmHg

Dọkịnta O'Driscol kwuru na ya bụ ihe mere ka ọbara ndị mmadụ gara iri oke elu mana ọ nwereike inyere aka gbochie mmadụ idanye n’ọnọdụ ahụike nke mkpọnwụ ahụ.

O kwukwara na tinyere mgharị ahụ a sị ka ndị mmadụ na-eme kwa izu, ka ha gbaa mbọ nwaa na-eme megharị ahụ nke ‘plank’ nakwa ‘wall squats’ ruo nkeji abụọ ugboro anọ otu ụbọchị.

O kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ị chee maka ime nke a ugboro atọ kwa izuụka.