Niger coup: Nnwale ọchịchị onyekwuouche ya n'Ọdịda Anyanwụ Afrika

- Onye dere ya, Yusuf Akinpelu
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos
Onyeisiala Bola Tinubu, bụ onyeisi mba kajara akaja bụ Naijiria ekwuola na nkwatu ọchịchị n'ike na Nijie bụ nnwale ọchịchị onyekwuoucheya n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
Dịka o weghara ọkwa dịka onyeisioche Ecowas, izụka atọ gara aga, he chere ya n'ihu bụ nnukwu ihe bụ mweghara ọchịchị n'ike nke ndịagha mere na mba Nijie- ezi ọyị na mbọ ibu agha megide ndị agha nnupuisi jịhad na mkpamkpa ha na-akpa n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.
Tinubu onye gbarụrụ ihu banyere nkwatu ọchịchị n'ike mere na Burkina Faso, Mali nakwa Guinea oge ọ banyere n'ọkwa n'ọnwa Mee, kwuru na Ecowas kwesịrị ike ajị n'ume igbochi nkwatu ọchịchị n'ike nakwa ịga n'ihu n'ibu agha megide ndị agha nnupuisi.
Ya mere oge a kwaturu Onyeisiala Nijie bụ Mohamed Bazoum n'ọkwa n'izuụka gara aga, Tinubu kpọrọ ọgbakọ ndị ndu Afrịka nna-egbughị oge.n'obi gọọmentị n'Abuja Ụbọchịụka.
Otu Ecowas kwekọrịtara ịta Nijie ahụhụ .
Nke a butere enweghị ọkụ latrik na Niamey na obodo ndị ọzọ mepere emepe na mba ahụ dịka Naijiria gbubiri ọkụ latrik ha na-enye ha, dịka ụlọrụ ọkụ latrik Nijie si kwuo.
Ecowas nyekwara Ọchịchị ndịagha Nijie iwu ịhara n'etiti inyeghachi ọchịchị n'aka onyeisial n'otu izuụka maọbụ "Ecowas esoro ụzọ abụla ụzọ iweghachite ọnọdụ dịka iwu si kwuo.".
"Ụzọ abụla ụzọ gụnyere iji aka ike" dịka ndị isi agha ga-enwere ọgbakọ "ozugbo", dịka ozi ha wepụtara si kwuo.
Na-agbnyeghị na a na-gbagha mmeri Tinubu n'ụlọikpe dịka ndị ya na ya zọkọrọ ntuliaka onyeisiala na-ebo ebubo na e mere wuruwuru, Tinubu na-edebe ahụ dịka onye ọchịchịonyekwuouche ya bụ onye so gbaa mbọ megide ọchịchị ndịagha na Naijiria n'agbata afọ 80s.
Wole Ojewale, bụ onye si n'ụlọmmụta maka mmụta nchekwa(Institute for Security Studies) s irị, "Echere m na ọ na-ahụta ya9nkwatu ọchịchị ahụ) dịka ịrụnye aka n'anya nye nkwenya nọchịchị onyekwuouche ya ọkachasị ugbua ọ bụ onyeisioche otu Ecowas."

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ọzọ dịkwa oke mkpa bụ na nkwatu ọchịchị ga-emetụta Naijiria.
Mba abụọa nwere okeala nke karịrị kilomita 1,500 (930 miles),ha na-azụrịta ahịa ma nwekwa omela jịkọrọ ha nke dịwarala tupu ọchịchị ndịọcha abịa dịka mba abụọ nọbu n'okpuru 'Sokoto caliphate'.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2022, Nijie gwụpụta ọnatarachi 'uranium' dị pasent anọ n'ime nke nile a na-egwupụta n'ụwa ndu, ma bụụkwa mba nke asaa kachasị egwupụta 'uranium nakwa ndị nke ha kachasị mba n'Afrịka.
Ma Ecowas ma ndị enyi ka si Ọdịda Anyanwụ Yurop enwgehị ndị ga-achọ ka uranium- ma ọchịchị ọdị n'aka ndị nkịta maọbụ n'aka ndịagha danye n'aka ndị agha nnupusi maọbụ Rọshịa maọbụ otu agha e goro ego bụ Wagner bụ ndị na-agbasa mkpatu ha ebe nile.
Ka ha kwatuchara ọchịchị ndị nkịtị, Mali na Burkina Faso legawara anya na Rọshia, ebe ọchịchị ndịagha banyere na Nijie naedewe ahụ ka ha ga-eme otu ihe ahụ.
Onye ndu Chad bụ Mahamat Idriss Déby Itno -onye ndịagha tinyere n'ọchịchị dịka ndị agha nnupuisi gbuchara nna ya n'afọ 2021- gara Nijie n'ụbọchụka iji rịọ ha ka ha gee Ecowas ntị.
Chad esoghị na Ecowas mana Déby gara ọgbakọ ha nwere Ụbọchịụka
Dịka onyeagha, a hụrụ ya dịka onye ọ ga-ekwe ya na ndị ndu agha mere nkwatu ọchịchị na Nijie kpaa iji kpo ha oku ka ha rituo.
Mana rue ugbua , ha ekweteghị.











