IPOB etinyeghi ‘sit at home’ ọbụla n’oge ntuliaka Febụwarị a – Emma Powerful

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na ha enweghi atụmatụ itinye ‘sit at home’ n’Ọwụwa Anyanwụ n’oge ntuliaka.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru ha wepụtara n’ụbọchị Tọzde ma sị na otu ha nke onye ndu ya bụ Nnamdi Kanu egbochitụbeghi ntuliaka na Naịjirịa.
Kama ọ sị na ha akpọtụla oku ka ndị Biafra gbajọọ ntuliaka bụ nke ha mechara kagbuo, ma sị onye chọrọ ka tụọ vootu.
Powerful sị na he ekwuola ya ọtụtụ oge na uche ha adịghị n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa nke ntuliaka ga-abụ n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023.
Ọ sị na ebe uche ha dị ugbua bụ ka a tọhapụ onye ndu ha bụ Kanu nakwa ụbọchị a ga-eme ntuliaka maka nnwereonwe Biafra bụ ‘referendum'.
“Ka anyị kwusie ya ike, o nweghi mgbe ọbụla Ipob sị ka ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ n’ọnwa Febụwarị a ga-eme ntuliaka Naịjirịa maọbụ kpọọ oku ka ndị mmadụ gbajọọ ntuliaka. Onye a takwala Ipob ụta ma ọ bụrụ ndị ekperima kpaa arụ n’Ọwụwa Anyanwụ.
“Ebe anya anyị nọ bụ ka a tọhapụ onye ndu anyị bụ Nnamdi Kanu, e ji n’ụzọ na-ezighi ezi na-agbanyeghi na ụlọikpe asịla ka a tọhapụ ya nakwa inwete ụbọchị a ga-eme ntuliaka ‘referendum’.
Powerful gara n’ihu kwuo na otu ọbụla kpọrọ oku ka ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ n’oge ntuliaka abụghị ndị otu anyị nke Kanu bụ onyendu.
Ozi Powerful na-abịa dịka otu a kpọrọ Pan Nigeria President of Igbo Extraction Coalition (PANPIEC) boro Ipob ebubo itinyela iwu onye apụla ezi n’oge ntuliaka 2023.
Ọ sị na otu PANDIEC so n’otu ndị gọomentị na-akwado nke na-agba mgba okpuru imebi nakwa imetọ aha Ipob.

Cheta n’ọnwa Juun 2021 ka Gọọmentị Naịjirịa nwuchigharịrị Nnamdi Kanu na mba Kenya, kpọlata ya Naịjirịa ma malite ikpe ya ikpe.
Kamgbe ahụ ndị bi n’Ọwụwa Anyanwụ malitere ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla nakwa n’akwa ụbọchị ọbụla Kanu ga-apụta n’ụlọikpe site n’iwu Ipob tinyere ma sị na ọ bụ iji akwanyere ya ugwu.
Ipob mechara kwuo na ha akagbuo ịnọ n’ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla ka ọ bụrụ naanị ụbọchị Kanu ga-apụta n’ụlọikpe.
Mana otu mpaghara Ipob nke Simon Ekpa na-achịkọta, sị na ihe dị etu ahụ adịghị na iwu ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla ga-aga n’ihu.
N’ihi nke a, ndị ojiegbe sị na ha na-amanye ndị mmadụ n’ike ịnọ n’ụlọ egbuola ọtụtụ mmadụ ma laa ọtụtụ ngwaụlọ, ụgbọala na ihe ndị ọzọ n’iyi maka nnupuisi n’iwu a.
O butela nnukwu egwu na mpaghara ala Igbo nke mere ndị mmadụ ka ji anọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla rute ugbua.









