Nwunye Ifeanyị Okoh ka dị ndụ oge m rutere ụlọọgwụ - nwanne nwoke ezinaụlọ mmadụ isii nwụrụ n'ụlọ ọhụrụ ha kwabara

Aha onyonyo, Etu otu nwoke na ndị ezinaụlọ ya ise si nwụọ n'otu ụbọchị n'Anambra
    • Onye dere ya, Uche Akolisa, Ebere Ekeopara& Amaka Bassey
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist/Reporter/Technical Director
Onyinye Okoh bụ nwanne Ifeanyị Okoh lara mmụọ
Nkọwa foto, Onyinye Okoh, diọkpara nna Ifeanyị Okoh lara mmụọ sị na azọtaghị ndụ nwa nwanne ya nwoke n'ihi enweghị akọrọngwa

Diọkpara ezinaụlọ Ifeanyị Okoh akọwaala etu nwaanye ya nwoke nke obere na ndị ezinaụlọ ya siri zute ọnwụ ntụmadị n'ụlọọhụrụ ha ha kwabara na nsonso a.

N'abalị 17 nke ọnwa Julai, afọ 2023, a hụrụ ozu Ifeanyị Thephilus Okoh gbara afo 32, onye Amagu Akegbe-Ugwu n'Enugwu Steeti, nwunye bụ Chiamaka Okoh, gbara afọ 28, ụmụ ha abụọ; Chinecherem gbara afọ atọ, Catherine gbara afọ abụọ na ọgọ ya nwaanyị bụ Anthonia Onwukwube gbara afọ 56 n'ụlọ ha, ha kwabara ọhụrụ na Nkwelle Ezunaka, Anambra steeti.

BBC Igbo zutere ezinaụlọ ha na Akegbe-Ugwu dị n'Enugwu ebe ebe Nwanne Ifeanyi ma bụụkwa diọkpara nna ya bụ Onyinye Okoh kọwara etu o siri nweta ozi maka ọdachi ahụ.

Ọ kọwara na a kpọrọ ya n'ekwentị n'ụtụtụ ụbọchị ahụ gwa ya maka ọdachi dakwasịrị ezinaụlọ ha.

Mana oge ọ garụrụ ụlọọgwụ, nwunye nwanne ya nwoke na otu nwa ha ka dị ndị mana ha mechara kubie n'ihi enweghị ezi akọrọngwa n'ụlọọgwụ.

Ọ rụtụkwara aka na ọ bụ naanị nwa e ku n'aka nke a mụrụ abalị ole na ole tupu ọdachi ahụ bụ ihe dị ndụ.

Nwanne nna ha kọwakwara ihe o jii mara Ifeanyị Okoh.

Cheta na ndị uweojii Naịjirịa kwuru n' ozi ha wepụtara na nnyocha ha gosiri na ọ bụ anwụrụ si n’igwe na-enye ọkụ kpọchapuru ezinaụlọ ahụ,

Kirie ihe ha kwuru nmn'uju n'elu:

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ọ bụ anwụrụ igwe na-enye ọkụ gburu ezinaụlọ mmadụ ise na Nkwelle Ezunaka,n'Anambara Steeti na nsonso a.

Ifeanyi Oko na ezinaụlọ ya

Ebe foto si, Ifeanyi Okoh/Facebook

Akwụkwọ mgbasaozi nke Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwuy Ikenga binyere aka kwuru na oge ndị ọrụ ha gara n'ụlọ ebe ihe mere ha hụrụ igwe na-enye ọkụ nke e dotere n'ụlọ ebe kpara akpa, ikuku anaghị aba ọfụma.

Igwe ọkụ na Ifeanyi Okoh na nwunye ya

Ebe foto si, Ifeanyi Okoh/Anambra Police Command

Ozi ahụ sịrị, "Nnyocha ozu e mere gosiri na ihe butere ọnwụ ha bụ 'carbonmonoxide. Ọ bụ anwụrụ si n'igwe na-enye ọkụ gburu ha."

Kọmishona ndị uweojii gara n'ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị sị ka ha kpachapụ anya ghara ịdọta igwe na-enye ọkụ ha na-ebe ikuku adịghị.

Etu mmadụ isii; nwoke, nwunye ya, ụmụ ha abụọ na ndị ọzọ sị nwụọ n'otu abali n'ụlọ ọhụrụ ha kwabara

Ifeanyi Theophilus Okoh

Ebe foto si, Theophilus Oko/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala iji chọpụta ihe butere ọnwụ ndị si otu ezinaụlọ n'Onicha Anambra steeti na nsonso a.

Ifeanyị Theophilus Okoh, onye Amagu, Akegbe Ugwu dị n'Okpuru Ọchịchị a Nkanu-West, Enugwu steeti, nwunye ya, ụmụ ha abụọ , ọgọ ya nwaanyị na nwa na-agbara ya bọị nwụrụ n'ụlọ ha kwabara ọhụrụ na Nkwelle GRA, Onịcha, Anambara steeti.

Otu onye agbatataobi ha achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo sị, " Ha dị mmadụ isii nwụrụ; Ifeanyị, nwunye ya, ụmụ ha abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị, ọgọ ya nwaanyị bịara ile ọmụgwọ na nwa na-amụ ahịa."

" Ihe anyị nụrụ nwa bụ na nwunye ya mụrụ nwa na Wenezde. Ha kwabaa n'ụlọọhụụ ụbọchị Satode. O rute Ụbọchịụka, ha mee obere 'house-warming. "

Ọ pụta Monde, a sị na ha nile anwụọla. Mana nwa ọhụrụ dị ndụ."

Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na otu nwoke, nwunye ya, ọgọ ya nwaanyị bịara ile nwa ọhụrụ nwunye ya mụrụ ọmụgwọ na nwa odibo ha nwụrụ n'ụlọ ha na Nkwelle Ọnicha Anambara steeti, n' Ụbọchịụka, abalị 17 nke ọnwa Julai, afọ 2023.

Akụkọ kwuru na nwoke ahụ na ezinaụlọ mere emume nwa ọhụrụ ha nakwa nkwaba n'ụlọ ọhụrụ ha n'ehihie Ụbọchịụka(17/7/2023) mana chi fo, ha dọrọ n'ozu.

Akụkọ kwuru na dịka ndị ọbịa ha lara na mgbede Ụbọchịụka, ezinaụlọ ahụ labara ụra mana o rutere na ndeeri, nwaanyị kulie, were hụ di ya na nne ya ka ha tọgbọ, were kpọọ nwanne ya nwaanyị n'ekwentị na-akọrọ ya ihe ọ hụrụ tupu ekwentị ya akubie.

Akụkọ ahụ gara n'ihu kwuo na oge e ji rute ebe ahụ, nwaanyị ahụ amaghịkwa onwe ya, e bugara ya ụlọọgwụ akpọghị aha ya ebe e kwuru na ọ nwụọla.

Ndị uweojii Anambara steeti kwuburu na ha ma maka ọdachi ahụ ma sịkwa na ha malitela nchọpụta.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo n'ekwentị sị,"Anyị achọtala ụlọ ebe ihe ahụ mere ."

" Anyị na-eme nchọpụta ịmata ụlọọgwụ ebe e bugara ha."