Ọrịa ahụike ụbụrụ isi egbochighi ezinaụlọ anyị ịhụ nnenne m n'anya ruo n'ọnwụ

Aha onyonyo, Mental Health: Nnenne m rịara ọrịa 'isi mgbaka' mana di ya hụrụ ya n’anya ruo n’ọnwụ - Win
Ọrịa ahụike ụbụrụ isi egbochighi ezinaụlọ anyị ịhụ nnenne m n'anya ruo n'ọnwụ
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara & Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter & Video Journalist

Nwada Winifred Mena-Ajakpovi bụ onye nnenne ya rịara ọrịa metụtara ụbụrụ akọwaala ihe nnanna gabigara n'oge ahụ iji lekọta ya.

Nwada a bụ onye na-eme ihe ejije kọọrọ BBC Igbo etu nnenne ya siri rịa ọrịa a n’oge gboo n'he dịka n'afọ 1940 ka nnanna ya gara lụọ nnenne ya dịka esi alụ nwaanyị n’omenala Igbo.

Ngwa ngwa ha gbachara akwụkwọ ka ọrịa metụtara ụbụrụ malitere na-arịa nwunye ya.

Winifred kwuru na nnanne ya ahapụghị nwunye ya gaa lụọ nwaanyị ọzọ maọbụ chụpụ ya, kama o gosiri ya ịhụnanya ya ma chọwa ọgwụgwọ ya ruo mgbe nwaanyị ahụ kara nka ma nwụọ.

Nwada a nnenne ya rịara ọrịa metụtara ụbụrụ

N’ala Igbo a na-ahụta mmadụ ịnya ara dịka onye abụrụ ọnụ, ọtụtụ ndị omenala na-achụpụ onye ahụ n’ajọ ọhịa ma wuchipu ya ọkachasị n’oge gboo.

Winifred nyere ndụmọdụ ka ndi mmadụ, ọkachasị ndị Igbo kpochapụ omenala niile na-akpachapụ mmadụ dika iwuchi ndị nwere ọrịa ụbụrụ, iwuchi ndi osu, ohu, ụmụnwaanyị na-amụghị nwa na ụmụnwaanyi ajadụ.

Winifred kwuru ka a nabata ndị dị etu a maka na e nwere ihe kpatara ya na-abụghị ihe si n’ala ma ọ bụ ọgwụ agwọrọ agwọ.

Mana ugbua, odowala ọtụtụ mmadụ anya na ụfọdụ ọrịa metụtara ụbụrụ nwere ọgwụgwọ ma ọ bụ ọgwụ nwereike ime ka isi jụọ onye ahụ oyi.