NLC Protest: Ihe mere otu a ji ama ọkwa ime ngagharịiwe ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Otu jịkọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress ezipụtala ozi n’abalị Tọọzde na-ekwu na ha ga-amalite ngagharịiwe ha ọzọ malite 14 nke ọnwa Ọgọstụ ma ọ bụrụ na ụlọikpe kọọ ha oku maka imegide iwu machiri ime ngagharịiwe n’akụkụ Naịjirịa ọbụla.
Nke a na-abịa dịka ministri ikpe nke gọomentị etiti ziteere otu a akwụkwọ maka imegide iwu ụlọikpe n’ụbọchị Wenezde nke machiri ha ime ngagharịịwe.
NLC dọrọ aka na ntị na ha ga-ahụ na ha kwụsịrị ịrụ ọrn̄ụ n’akụkụ Naịjirịa niile ma ọbụrụ na gọọmentị etiti ewepụghị akwụkwọ mkpesa mere ka a machie ha ime ngagharịiwe bụ nke mere ụlọikpe ji zitere ha ozi ịda iwu.
Onyeisi NLC bụ Joe Ajaero, zipụtara ozi n’abalị Tọọzde a ka otu a nwechara ọgbakọ ime ụlọ ha n’Abuja.
Cheta na gọọmentị etiti site na ministri ikpe Naịjirịa n’ọnwa gara aga natara ikike iwu n’ụlọikpe nke kwuru na NLC nakwa Trade Union Congress (TUC) agaghịzị enwe ikike mee ngagharịiwe ruo mgbe ụlọikpe ahụ kpebiri.
Ngagharịiwe NLC gboro ụkwụ na etu ọnụ ahịa ihe siri ria elu kemgbe onyeisiala Bola Tinubu mara ọkwa mwepụ ego mbelata ọnụahị mmanụ ụgbọala (Fuel subsidy) dịka ha kpọrọ ya "iwu megidere ọdịmma ndị mmadụ".
N'izuụka ka ha mechara ngagharịiwe, ndị isi otu a na gọọmentị etiti zutere n'Abuja.

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook/NLC/Facebook
Ihe NLC na Tinubu kpatara n'ọgbakọ ha nwere
Cheta na NLC na TUC kpebiri izute gọọmentị etiti Naịjirịa maka okwu ebubo “imepụta atụmatụ ndị megidere ọdịmma ndị mmadụ”.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N’ozi onyeisi NLC na TUC bụ Joe Ajaero na Festus Osifo jịkọrọ aka wepụta n’abalị Wenezde ka ha mechara ngagharịiwe n’akụkụ Naịjirịa niile ha kwuru na ga-akwụsị ngagharịiwe a ma malite izute gọọmentị etiti ọzọ.
Dịka Ajaero na Osifo zutechara onyeisiala Bola Tinunu n’obi gọọmentị nkle Abuja, otu abụọ a wepụtara ozi a.
Ozi ha kwuru:
“Dịka anyị gbadoro ụkwụ n’okwu nakwa nkwa onyeisiala, anyị ekpebiela ịlaghachi azụ ma malite mkparịtaụka ọhụrụ iji hụ na-emezuru n’isi ihe ndị e kwuru na a ga-eme”.
Cheta na otu a n'akụkụ Naịjirịa niile mere ngagharịiwe a n'ihi etu ọnụahịa ihe siri ria elu ọkachasị kemgbe ewepụrụ ego mbelata mmanụ ụgbọala nke mere ka ego ime njem nakwa ihe mmepụta ihe ria elu.
N'ụfọdụ steeti dị iche iche gọọmentị malitere iwepụta ihe enyemaka nye ụmụafọ Naịjirịa nakwa ndị ọrụ ha.
N'ụbọchị Wenezde, gọvanọ Enugu steeti bụ Peter Mbah wepụtara ozi banyere iwe ndị NLC na steeti ahụ ma awepụtala kọmitee ga-atinye anya n'ụgwọ 'pension' na 'gratuity' eji ndị ọrụ oyibo lara ezumike nka n’Enugwu ọkachasị n'oge ihe isi ike a.

Etu ndị na-eme ngagharịiwe si kwatuo ọnụụzọ ụlọomeiwu Naịjirịa
N'ụbọchị Wenezde dịka ndị otu a nọ n'eme ngagharịiwe n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ụfọdụ ndị otu a kwaturu ọnụụzọ ụlọomeiwu dị n'Abuja n'ụbọchị 2 Ọgọstụ 2023.
Nke a mere mgbe ndị a buuru ngagharịiwe gaa n'ụlọomeiwu, ya bụrụ na a gbachiri ọnụụzọ ya a gbachi.
Ha bidoro na-akwa ụzọ ahụ aka ma na-eti mkpu ka a gbapee ya mana ha mechara kwatuo otu ngalaba ọnụụzọ ahụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Otu NLC gara n'ihu ime ngagharịiwe a na-agbanyeghi mgbasaozi Onyeisiala Tinubu mere maka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ma kwee nkwa ibuli ego ọnwa ha.
Abụbụọrụ na ngagharịiwe a ga-eme na steeti niile dị na Naịjirịa bụ ebe ndị otu a ga-agbakọta ma kpagharịa n'ebe dị iche iche.

Steeti dị iche iche a na-eme ngagharịiwe a

N’Ebonyi Steeti
N’Abakaliki bụ isiobodo Ebonyi Steeti, ndị ọrụ pụtara n’igwe sonye ibe na ngagharịiwe ka ọ dị na Najiirịa gbaa gburu gburu.
Onyeisi ndị NLC na steeti ahụ bụ ọkanmụta Ogugua gbara ndị otu ya ume ma gwa ha mkpa ọ dị isonye na ngagharịiwe a.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtara na ụfọdụ ụlọakụ emepeghi emepe n’Abakalili dịka ndị bịara ịdọrọ ego kwụcha n’ihu ụlọakụ na-amaghị nke ga na-eme.
O nweghi onye maara kpọmkwem ihe mere ụlọakụ emepeghi mana ụfọdụ na-eche na ọ bụ n’ihi ngagharịiwe a ndị ọrụ na-eme.


Na Legọs
Ndị ọrụ n’otu aka ahụ gbakọtara n’ebe a na-akpọ Ojota dị na Legọs ma malite ime ngagharịiwe nke.
Ha ga-esi ebe ahụ kpagharịa ọtụrụ ebe dị iche iche na Legọs.
Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na-eme gụnyere ndị uweojii, ndị DSS nọ ndị a nso maka ichekwa ha ma gbochie ọgbaghara ọbụla.


Abuja
Ndị ọrụ Naịjirịa agbakọtala n'ebe a kpọọ 'Unity Fountain' dị n’Abuja maka ịmalite ngagharịiwe ha taa.
A na-ache ka ndịisi ha pụta ma gwa ha okwu ịgba ume tupu ha azọpụ njem ngagharịiwe.
A na-atụ anya na ndị otu ha nọ na mapaghara Naịjirịa dị iche iche ga-agbakọta n'otu ebe ma malite ngagharịiwe ha.

N’Abia Steeti, Rivers nakwa Enugwu steeti
Ngagharịiwe a mekwara n’ọtụtụ steeti ndị ọzọ gụnyere Abia, Rivers, Enugwu Steeti na ndị ọzọ.
Ndị ntaakụkwọ BBC Igbo kpagharịrị na steeti ndị a ma chọpụta ndị otu NLC nupụtara n’igwe ma mee ngagharịiwe nke ha.
Otu okwu ha kpụụ n’ọnụ dịka ndị otu ha ndị ọzọ bụ ka gọọmentị wepu ụfọdụ iwu ha mere nke ha sị na-akpagbu ụmụafọ Naịjirịa.
N’otu aka ahụ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ so ha iji hụụ na ọgbaghara agaghị adapụta.

Ụgwọ opekatampe ndị ọrụ na Naịjirịa ka bụ puku naịra iri atọ ugbua (N30,000) kamgbe afọ 2019, na-agbanyeghi mbulie ọnụego mmanụ ụgbọala site na N180 ruo N617 mgbe gọọmentị wepuru ego enyemaka ha na-achụ n’elu ya (subsidy) n'ọnwa Juun 2023.
Mana Onyeisi NLC bụ Joe Ajaero kwuru na ha ka si na mkparịtaụka ha na gọọmentị nwere na-apụta ugbua kama na ihe ha kpatara agaghị egbochi ha ịgba abụbụọrụ ha chọrọ ịgba.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ ngagharịiwe ka ha ga-eji malite abụbụọrụ a na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.


Kedụ ihe NLC na-achọ n’aka gọọmentị?

Ebe foto si, NLC
- NLC chọrọ ka gọọmentị mezuo ihe dị na nkwekọrịta ha na ogbo ha nke Trade Union Congress (TUC) nwere bụ nke ha mbinyere aka na ya.
- Ka gọọmentị wepụ iwu ọbụla ha tinyere maka akụnaụba bụ nke na-emekpa ndị mmadụ ahụ ugbua, gụnyere mbuli elu ọnụegọ mmanụ ụgbọala, ụgwọ akwụkwọ nakwa ụtụisi.
- Ka gọọmentị mezie ụlọọrụ ebe a na-esi mmanụ agbidi dị na Portharcourt, Warri na Kaduna.
- Ka gọọmentị kwuo ndị nkuzi mahadum ụgwọ ọnwa asatọ ha a kpachiri mgbe ha gbara abụbụọrụ n’afọ 2022.
- Ka ha kagbuo iwu ọbụla gọọmentị tinyere nke na-emekpa ndị mmadụ ahụ.
- Ka ha kwanyere kọmitii onyeisiala e hiwere ugwu ma nye ha nkwado ruuru iji rụọ ọrụ.









