'Ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụ m n'obi' - Ihe onyeisiala Tinubu kwuru na mgbasaozi ya

Bola Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu agwala ụmụ Naịjirịa na ahụhụ na ihe nhịahụ ha na-agabiga ugbua na-emetụ ya n'obi, mana n'oge adịghị anya "anyị ga-esi ọchịchịrị a pụta ma banye n'ihe nke Naịjirịa ọhụrụ.

Tinubu kwuru nke a na mgbasaozi pụrụ iche nke o mere n'elekere asaa nke uhuruchi ụbọchị Mọnde, bụ ụbochị 31 nke ọnwa Julaị 2023.

Onyeisiala kọwara na atụmatụ 'Fuel Subsidy' bụ ihe e wepụtaburu iji nyere ụmụ Naịjirịa aka, "mana ọ bụzi ihe mmadụ olemole ndị ọgaranya ji ebukọrọ Ego Naịjirịa."

O kwuru na n'ime ọnwa abụọ gọọmentị ya kwụsịrị ịkwụ 'subsidy' Naịjirịa echelwaa ego ruru otu tarị naịra bụ nke a ga-etinye na ngalaba mmepe ndị ọzọ na Naịjirịa.

Tinubu gara n'ihu kwu na ya ma na dịka ọ na-ebu agha ịkwalite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa, mmadụ olemole ndị ji akụnụba Naịjirịa baa ọgaranya ga-ebusokwa ọchịchị ya agha, "mana anyị dị njikere maka ha".

"Ahụla m etu ọnụahịa mmanụ ụgbọala si gbalie, hụkwa etu ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ si soro ya gbalie. Ihe nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga na Naịjirịa ugbua na-emetụ m," Tinubu kwuru.

"Ọ bụrụ na e nwere ụzọ ọzọ ka mfe iji mee ihe ndị a, a gaara m esoro ụzọ ahụ, mana enweghị ụzọ ọzọ."

Mana Tinubu kwuru na naanị ihe ya nwereike ime bụ itinye atụmatụ dị icheiche nke ga-enye aka wetulata ihe nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga.

Lee ụfọdụ atụmatụ Tinubu kwuru na ya tinyere iji belata ihe isi ike na Naịjirịa

Bola Tinubu

Ebe foto si, Screengrab

  • Ịmapụta Ijeri naịra 75 (N75b) iji nye ụlọọrụ 75 na-arụpụta ihe na Naịjirịa ego mgbazinye otu ijeri naịra n'otu n'otu iji kwalite ọrụ ha. Ha ga-enwe ohere ọnwa 60 iji kwụghachi ụgwọ a n'ọmụrụnwa pasentị itoolu.
  • A mapụtara ijeri naịra 125 maka ụlọọrụ nta (MSME) dị icheiche iji nye ha ohere ịgbazite ego n'ọmụrụnwa pasentị itoolu bụ nke ha ga-enwe ohere ọnwa 36 iji kwụghachi
  • Ime ka nri dị n'ụbara ma dịkwa ọnụ ala. Iji mee nke a, gọọmentị mapụtara nri 'grain' dị 'Metric Tonne' 200,000 iji kesaa ezinụlọ dị icheiche na steeti 36 dị na Naịjirịa nakwa FCT. A mapụtakwara 'Metrc tonne' fetịlaịza 225,000 iji kesaara ndị ọrụ ugbo na steeti dị icheiche
  • Ịmapụta ijeri naịra 200 (N200b) iji kọọ obosara ala dị hekta 500,000. N'ime ego a, gọọmentị wepụtara ijeri naịra 50 (N50b) n'otu n'otu iji kọpụta Ọka, osikapa, akpụ nakwa wheat
  • Ịmapụta ego pụrụ iche a kpọrọ 'infrastructural fund' bụ nke a ga-enye steeti dị icheiche maka ịrụpụta ọrụ a hụrụ anya.
  • Gọọmentị mapụtakwara ijeri naịra 100 (N100b) iji zụta ụgbọala na-eji ikuku gaasị (Compressed Natural Gas) agba, ọnụọgụgụ ya dị puku atọ, nke ga na-ebu mmadụ 20 n'otu n'otu ma kesaara ya steeti na okpuru ọchịchị dị icheiche iji belata ụgwọ njem ụgbọala. A ga-ekesa ụgbọala ndị a nye ụlọọrụ njem ụgbọala dị icheiche na mgbazinye nke ọmụrụnwa ya ga-abụ pasentị itooly, bụkwa nke ha ga-enwe ohere ọnwa 60 iji kwụghachi ya.
  • Gọọmentị na otu jikọrọ ndị ọrụ na-enwe mkparịtaụka iji kwekọrịta n'ụgwọ ọnwa opekata mpe ọhụrụ nke gọọmentị ga na-akwụ ndị ọrụ. Tinubu kwere nkwa na "mbuli ụgwọọnwa ndị ọrụ na-abịa".

Onyeisiala Tinubu kwuru na ya ma na atụmatụ ndị a niile ga-arụ ọrụ, mana ọ dị mkpa ka ndị mmadụ nweere ọchịchị ya ndidi.