Bola Tinubu Inauguration: Lee nwale ise na-echere onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Presidency
- Onye dere ya, Nduka Orjinmo
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Ebeg o si, Abuja
A na-akpọ Naịjirịa 'Dike nke Afrịka', n'ihi ọnụọgụgụ ndị bi na ya nakwa olileanya e nwere na ọnọdu akụnụba mba ahụ kwesịrị ịgbalite, mana Naịjirịa nwekwara ọtụtụ nsogbu tara akpụ bụ nke ga-echere Bola Tinubu aka mgba dịka ọ na-amalite ọrụ onyeisiala n'ụbọchị Mọnde.
A na-atụ anya na nsogbu ndị a agaghị abụ ihe ọhụrụ nye Tinubu, onye gbanwere ma wulie ọnọdụ akụnụba nke Legọs steeti oge ọ bụ govanọ steeti ahụ ugboro abụọ.
Mana ọtụtụ ụmụ Naịjirịa, ọbụladị ndị na-atụnyeghịrị Tinubu vootu, ga na-atụ anya ịhụ mgbanwe dịka ọ na-amalite ọchịchị ya. Lee ụfọdụ ọdachi ndị ga-eche Tinubu n'ihu nakwa etu o nwereike isi soo ha.
Ịkwụsị 'fuel subsidy'

Ebe foto si, AFP
N'agbanyeghị na Naịjirịa nwere mmanụ agbịdị ebe o buru ibu, ha enweghị ụlọọrụ ọbụla na-arụ ọrụ nke ọma ebe a na-emepụta mmadụ ụgbọala, kama ha na-esi mba ndị ọzọ ebubata mmanụ ụgbọala, nke na-eme ka ego a na-ere mmanụ ụgbọala gbalie elu.
Iji wetulata ọnụahịa mmanụ ụgbọala, gọọmentị na-akwụ ụfọdụ ego ahụ nke a na-akpọ subsidy na bekee.
Ka ọtụtụ afọ na-aga, ego a gọọmentị na-akwụ iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala eruola ijeri kwuru ijeri dọla, nke mere ka ọtụtụ na-akpọ oku ka a kwụsị ya.
Ugboro ugboro ka ọchịchị Muhammadu Buhari kwere nkwa idozi ụlọọrụ na-emepụta mmanụ ụgbọala ndị nke dị na Naịjirịa, iji mee ka a kwụsị isi mba ofesi atụbata ya, mana nkwa niile ahụ enwebeghị isi.
Mana Tinubu n'onwe ya ekwukwaala ugboro ugboro n'oge gara aga na 'subsidy' ga-akwụsị, ọtụtụ ndị nkwado ya ekwukwaala na o nwere ikike ime ya.
Enweghị nkwado ọtụtụ mmadụ

Ebe foto si, AFP
Naanị mmadụ pasentị 37 ndị niile tụrụ vootu tụnyeere Tinubu, nke mere ka ọ bụrụ onyeisiala nwetara vootu kacha nta kamgbe afọ 1999.
Ntuliaka nke Tinubu meriri jupụtara na nkewa agbụrụ nakwa okpukperechi nke pụtara ihe ma n'obodo ndị mepere emepe.
Ọ dị mkpa na Tinubu ga-ejikwa nkewa ndị a dịka ọ na-ahọpụta ndị ya na ya ga-eso rụọ ọrụ.
Ụfọdụ na-ekwu na Tinubu amalitelarị ime nke a site n'izute mmadụ abụọ welitere isi na pati ndị so zọọ ọkwa onyeisiala:
- Musa Kwankwaso, onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na mpaghara Ugwu, onye gbara onye nke anọ na ntuliaka ọkwa onyeisiala
- Nyesom Wike, bụ gọvanọ Rivers Steeti nke na-apụ apụ
Mana ọtụtụ na-ekwu na ọ ga-ara Tinubu ahụ inweta nkwado ọtụtụ ndị ntorobịa, ọ kachasị ndị na-akwado Peter Obi nke 'Labour Party'.
"Ị ga-ahụ gọọmentị ga-anabata atụmatụ nakwa tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ, nke pụtara na ị ga-ahụ ọtụtụ ndị ntorobịa n'akụkụ Tinubu," Babatunde Fashola, bụ aka chịburu Legọs Steeti gwara BBC na mkparịtaụka.
Iwulite akụnụba

Ebe foto si, AFP
- Ngụụkọ gosiri na ọnọdụ Naịjirịa n'ihe gbasara akụnụba dị nnukwu njọ ugbua:
- Otu onye n'ime mmadụ atọ enweghị ọrụ
- Mgbali elu ọnụahịa eruola 22%
- Mmadụ nde 96 dara ụbịam nke ukwuu ha anaghị enweta ihe ruru $1.90 n'ụbọchị
- GDP n'isi n'isi bụ $2,065 na 2021 (tụnyere $70,248 na mba US na $46,510 na UK)
- Ego a na-enweta na mmanụ agbịdị na-agbada
Seye Oyetade, bụ enyi Tinubu gwara BBC na ọ bụkwa ụdị ihe a ka Tinubu hụrụ oge ọ malitere ọchịchị dịka gọvanọ Legọs n'afọ 1999, mana ọ gbara mbọ wulite ego na-abatara Legọs steeti karịa pasentị 400 n'ime afọ asatọ.
Enweghị nchekwa

Ebe foto si, AFP
Dịka Tinubu na-amalite ọchịchị ya, ndakpọ ọnọdụ nchekwa Naịjirịa so n'ihe mbụ ga-echere ya aka mgba.
N'oge achụmnta vootu, osote Tinubu bụ Kashim Shettima kwuru na ihe gbasara nchekwa ga-abụ ọrụ ya, dịka o busoro ndị ọgụ Boko Haram agha oge ọ bụ gọvanọ nke Borno Steeti, bụ ebe ndị Boko Haram ji mere isi ụlọọrụ.
Mana ọnodụ enweghị nchekwa Naịjirịa ugbua agafeela naanị Boko Haram; enweghị nchekwa agbasaala mpaghara Naịjirịa niile ugbua.
Otu nkwa Tinubu na Shettima kwere bụ ihibe otu ndị ọrụ nchekwa pụrụ iche ndị ọrụ ha ga-abụ ibuso ndị ntọrị mmadụ nakwa ndị na-eyi ndụ egwu agha.
Ha kwukwara na ha ga-akpọpụta ọtụtụ ndị uweojii na-eche ndị ọgaranya nche iji mee ka ọnụọgụgụ ndị uweojii gbalite iji gbochie mpụ.
Ahụ ike - na ihe ndị ọzọ
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụfọdụ ndị na-akatọ Tinubu na-ekwu na ike adịghịkwa ya dịka ọ dịbu oge ọ na-achị Legọs.
Kamgbe e mechara ntuliaka 2023, Tinubu emeela njem gaa mba ofesi ugboro abụọ, nke kpalitere ọtụtụ ajụjụ maka ọnọdụ ahụike ya. N'afọ 2021 ọ nọrọ ọtụtụ ọnwa na London dịka ọ na-anata ọgwụgwọ maka ọrịa amaghị aha ya.
Kama ọtụtụ oge ka o kwuru na ọkwa onyeisiala abụghị ịgba ọsọ 'Olympic', ebe ọtụtụ ndị nkwado ya rụtụkwara aka na onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden dị afọ 80.
Ike agwụla ndị Naịjirịa ịhụ ka onyeisiala ha na-anọ ọtụtụ oge n'ụlọọgwụ na mba ofesi, mezie ka ọ dịka enweghị onye nọ n'isi gọọmentị.
Ihe dị otu a mere n'ọchịchị Buhari, nakwa nke Umaru Yar'Adua, onye mechara nwụọ n'ọchịchị n'afọ 2010.
Ọzọkwa bụ ebubo ndị ọzọ a na-ebo Tinubu, nke gụnyere na o nwere akwụkwọ njirimara nwaafọ nke mba Guinea.
Inwe akwụkwọ a emegideghị iwu, mana Tinubu ekwubughi na o nwere ya.
N'ọdị nso a kwa ka nnyocha gosiri na nwa Tinubu bụ Seyi nwere ụlọ na London nke ọnụ ahịa ya ruru nde paụnd 11.













