Supreme Court: Ihe ndị mere taa n'Ụlọikpe Kachasị n' ikpe Atiku,Obi megide Tinubu

Lee ihe niile gbasara ikpe mkpesa n'ụlọikpe na ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Chioma Nkemdilim Daramola, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Supreme Court judgment: Atiku arụọla Inec,ngalaba ikpe aka maka etu ikpe ọkwa onyeisiala 2023 si gaa

    Atiku Abubakar

    Ebe foto si, Atiku Abubakar/Twitter

    Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha otu PDP bụ Atiku Abubakar akpọọla oku ka a na-ekpecha ikpe nile metụtara ntuliaka tupu e duo ndị meriri na ntuliaka iyi ọrụ.

    Atiku kwuru nke n'ụbọchị Monde dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ọ gachara abalị ole na ole Ụlọikpe Kachasị kpebiri n'ezie na ọ bụ Onyeisiala Bola Tinubu nke APC meriri na Ntulika 2023.

    Atiku katọrọ Inec nakwa ngalaba na-ahụ maka ikpe maka etu okwu metụtara Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023 si gaa n'ụlọikpe.

    " Ọ bụrụ na Ụlọikpe Kachasị site na mkpebi ha sịrị na mpụ dị mma, ị mara na ọ bụ Naijiria ka ihe furu. Obodo a nọ na nnukwu nsogbu, onye ọ sọrọ ya ya bụrụ ya nọ n'ọkwa Onyeisiala."

    "Ọ bụrụ na Ụlọikpe Kachasị ga-ekpebi na Inec haziri ntuliaka nwere ikike ịgwa ọha ndị mmadụ otu ihe, mee ọzọ , iji hụ na e neyere mkpebi aghụghọ, ị mara na ọchịchị onyekwuoucheya ala anyị enweghị olileanya ọbụla."

    Atiku kporo oku 'ka Anyị mee iji igwe tụọ vootu ma kpokọta mpụtara iwu" nakwa " "Ka ikpe nile metụtara ntuliaka bie tupou e duo onye meriri n'iyi ọrụ."

    N'okwu ebe ọkwụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria, Atiku sịrị, "Ọ bụrụ na i chere na m ga-ahapụ ndọrọndọ ọchịchị, o nweghị ebe m na-aga."

    Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mkpebi ahụ ga-apụta agaghị ebi n'ọtụtụ afọ na-abịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  2. Ihe Tinubu kwuru ka 'Supreme Court' nyechara ya mmeri

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwuola na ọ nabatara ikpe ahụ ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kpere nke nyere ya mmeri dịka onyeisiala na ntuliaka e mere n’ọnwa Febụwarị 2023.

    Tinubu kwuru na ndị ọkaikpe chabiri ikpe a mere nke a na-atụghị egwu maọbụ lee mmadụ anya n’ihu.

    O kwuru na nke a gosiri na ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa ngalaba ikpe na Naịjirịa agbaala mgbọrọgwụ n’ime ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa site n’ikpe a ndị ọkaikpe kpere.

    O kwuru na dịka ikpe a merela ka o doo anya onye bụ ezigbo onyeisiala Naịjirịa, na obi ya adatụbeghi mba n’ebe ngalaba ụlọikpe Naịjirịa nọ n’ikpe ikpe ziri ezi.

    Tinubu gara n’ihu kpọkuo ndị niile zọsara ya ọchịchị ka ha mịnye mma ha n’ọbọ ma tinye aka ka e mezie Naịjirịa site n’ọchịchị ya.

    Ọ gakwara n’ihu rịọ ụmụafọ Naịjirịa ka ha biko dọnyere ọchịchị ya ukwu ka o nwee ike rụọrọ ọfụma ma wulite ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.

    Cheta na ụlọikpe kachasị kụchapụrụ ebubo niile Atiku Abubakar nke PDP na Peter Obi nke Lavour Pati gbara Bola Tinubu na ụlọọrụ Inec maka mmeri ya na ntuliaka ọkwa onyeisiala.

  3. Ụlọikpe kachasị eweliela mmeri Onyeisiala Tinubu

    Obi Tinubu nakwa Atiku

    Ebe foto si, Obi/Tinubu/Atiku

    Ụlọikpe kachasị eweliela mmeri onyeisiala Tinubu ma tụpụ akwụkwọ ndị Peter Obi nke Labour Party nakwa Atiku Abubakar nke PDP gbara ya.

    Ụlọikpe kachasị nwere ọkaikpe asaa bụ nke Inyang Okoro bụ onyeisi ha jidesiri ike na ọ bụ Bola Tinubu meriri ntuliaka ọnwa Febụwarị ahụ.

    Okoro sị "dịka ahazichara okwu niile selitere isi megide Tinubu, ọ bụ ebumnuche m na o nweghi ebe ọ gbadoro ụkwụ nke mere na atụpụla ya".

    "Mkpebi nke ụlọikpe obere nyere n'ụbọchị 6 nke ọnwa Sepụtemba afọ 2023 kwuru na Tinubu bụ onyeisiala bụkwa nke anyị na-akwado ugbua" ka o kwukwara.

    Dapo Abiodun bụ aka na-achị Ogun steeti etinyela ọnụ n'okwu mmeri a.

    Ọ gwara ụlọntaakụkọ Channels gbasara ya ma sị na mmeri bụ nke mmadụ niile.

    Ọ bụ mmeri Naịjirịa nakwa APC ọ bụghị naanị nke Tinubu. Anyị kelekwara ndị ụlọikpe kachasị n'ihi na ikpe ha kwụ ọtọ, ọ bụkwa nke ndị ụwa niile hụrụ na ọ dị mma.

    Ndị ọzọ ga zuzie ike ma chọrọ ụzọ ha na onyeisiala ga-esi jikọ aka ma rụọ ọrụ ọchịchị.

  4. "Agaghị akagbu mmeri Tinubu maka ..." - Ụlọikpe kachasị

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe kachasị ekwuola na agaghị akagbu mmeri Onyeisiala Tinubu n'ihi ejighi ụzọ latrik zisaa mpụtara ntuliaka e mere n'ọnwa Febụwarị.

    Ọkikpe Inyang Okoro kwuru nke a n'ịnụrụ na mkpebi mkpesa nke Atiku Abubakar zọrọ ọkwa n'aha otu Peoples Democratic Party bụ PDP nakwa Peter Obi nke Labour Party mere.

    Ọkaikpe Okoro tụpụkwara okwu gbasara ịnweta 25% n'Abuja.

    A tụpụrụ ikpe niile Atiku Abubakar wegaara ụlọikpe kachasị ikpe gbasara okwu ntuliaka.

    N'okwu gbasara akaebe ọhụrụ nke Atiku webatara, ụlọikpe kachasị kwuru na ọ bụghị hanwa ka ọ dịịrị ịnụrụ ikpe metụtara ihe akaebe ọhụrụ ahụ o wetara.

  5. Etu ọ dị n'ụlọikpe kachasị ga-enye ikpe maka Peter Obi, Atiku na Tinubu ugbua

    Ụlọikpe kachasị ga-enye ikpe maka ikpe Peter Obi, Abubakar Atiku nyere maka mmeri Onyeisiala Bola Tinubu taata
    Nkọwa foto, Ndị nchekwa na-enyo ndị chọrọ ịba Ụlọikpe Kachasị

    Nchekwa dị egwu dị n'akụkụ ebe niile n'ụlọikpe kachasị taata bụ ụbochị 26 n’owa Ọktọba 2023, ụlọịkpe kachasi ga ekpe ịkpe gbasara arịrịo onye zọrọ ọkwa ịsịala Niajịrịa n’okpru Labour paty bụ Maazị Peter Obi nakwa onye nke PDP bụ Alhaji.Atiku Abubakar,ha rịọrọ ka akachaa ntụrịaka nwebatara onyeịsịala Bola Ahmed Tinubu n’ọchịchị dịka onyeịsịala Niajịrịa, sịte n’ịnapụ ya ọchịchị.

    Mana n'ime ogbe ụlọikpe dara jụụ.

    Ndị ọgaranya bịara Ụlọikpe taata gụnyere Nyesom Wike, Onyeisioche APC bụ Ganduje, NOnyeisi ndụmọdụ maka nchekwa Naịjirịa bụ Maazị Nuhu Ribadu nakwa onyeisi ndị ọrụ nyere Onyeisiala bụ Femi Gbajabiamila) makwa ndị ndị ọzọ.

    Ụlọikpe kachasị ga-enye ikpe maka ikpe Peter Obi, Abubakar Atiku nyere maka mmeri Onyeisiala Bola Tinubu taata
    Nkọwa foto, Lee ka Ụlọikpe kachasị dị n'ụtụtụ a
    Ụfọdụ na-eme ngagharị iwe site n'ikwado mmadụ dị icheiche nyere ikpe ha
    Nkọwa foto, Ụfọdụ na-eme ngagharị iwe site n'ikwado mmadụ dị icheiche nyere ikpe ha
  6. Unu asaala chi?

    Ndeewo nu soro anyị ka Ụlọikpe kachasị si enye ikpe maka mmeri Onyeisiala Tinubu taata

  7. 'Supreme Court' ga-apịachi ikpe ntuliaka n'etiti ndị a na Tọzde

    Ndị zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023

    Ebe foto si, Obi/Tinubu/Atiku/Facebook

    Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ehiwela Tọzde 26 Ọktoba dịka ụbọchị ọ ga-achabi ikpe banyere ntuliaka ọkwa onyeisiala nke dị n’etiti Bola Tinubu, Atiku Abubakar na Peter Obi.

    Cheta na Obi na Atiku ji aha Labour Party na Peoples Democratic Party zọọ ọkwa ahụ kpụpụrụ Bola Tinubu nke All Progressive Congress na Ụlọọrụ ntuliaka bụ Independent National Electoral Commision n’ụlọikpe maka mmeri Inec kwuru na ọ bụ Tinubu meriri.

    Cheta na ụlọikpe nọọrọ n'ụbọchị Mọnde 23 Ọktoba nabata mkpesa niile Atiku na Obi wetere n'ụlọikpe banyere ntuliaka ahụ ma sị na ha ga-eleba ha anya tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme banyere mkpesa ndị a.

    Ndị pati niile nke a metụtara nabatara ozi banyere ụbọchị nchabi ikpe a.

  8. Supreme Court: E higharịala ikpe Atiku, Peter Obi megide Tinubu

    Peter Obi, Bola Tinubu na Atiku Abubakar

    Ebe foto si, Peter Obi/ Bola Tinubu/ Atiku Abubakar/Facebook

    Ụlọikpe Kachasị ehigharịala akwụkwọ nke Atiku Abubakar nke PDP na Peter Obi nke Labour Party gbara Onyeisiala Bola Tinubu nke ha ji agbagha mmeri Tinubu na ntuliaka ọkwa Onyeisiala nke e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.

    Ụlọikpe ahụ kpụpụkwara n'akụkụ mkpesa nke onye feere ọkọlọtọ otu Allied Peoples Movement (APM) bụ Uchenna Solomon.

    N'ikpe ahụ nke Jọstis John Inyang Okoro du ndị ọkaikpe isii ndị ọzọ kpee,ụlọikpe nụrụ arịrịọ nke Ọkaiwu Atiku bụ Chris Uche ka o webata asambodo Tinubu si mahadum 'Chicago State University dịka ihe akaebe ọhụrụ.

    Ọ sịrị, “Ihe gbasara asambodo Maazị Tinubu bụ nnukwu ihe gbara ọkpụrụkpụ ma metụtara Iwu nke kwesịrị ka Ụlọikpe Kachasị nabata."

    "Ana m arịọ ụlọikpe a ka ha na-abata ihe akaebe ọhụrụ banyere asambodo Onyeisiala Tinubu site na mahadum Chicago State University nke Atiku wetara."

    Ọkaiwu Tinubu bụ Wole Olanipekun na nke Inec bụ Abubakar Mahmoud rịọrọ ụlọikpe ka ha kụpụ arịrịọ Atiku ahụ na ụsọ.

    N'aka nke ọzọ, Ọkaiwu Peter Obi bụ Livy Uzoukwu rịọkwara ụlọikpe ka o gee mgbagha ya banyere mkpebi nke Ụlọikpe Puru Iche Maka Ntuliaka nke Peter Obi gbadoro ụkwụ na ihe 51 were agbaga.

    Ihe ndị Obi guzoro agba ha mkpebi Uloikpe kpeburu ikpe ahụ gụnyere na "Tinubu enwetaghị oke pasent 25 na vootu a tụrụ n'Abuja".

    Obi na-agbaghakwa na Inec ejighi igwe zipu mpụtara ntuliaka ahụ.

    O kwuru na Ụlọikpe pụrụ iche kpere ya bụ ikpe dahiere site na ikwu na ọ bụ Tinubu nwetara vootu kachasị na ntuliaka ahụ.

    Cheta na ọnwa Julai, Ụlọikpe Pụrụ Iche maka Ntuliaka (Election Tribunal) kpụpụrụ akwụkwọ nke Obi n,Atiku Abubakar na Solomon Uchena nke APM gbara iji gbaghaa mkpọpụta Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka Onyeisiala afọ 2023.

    N'abalị mbụ nke Ọnwa Maachị afọ 2023, Onyeisi Inec bụ Mohmood Yakubu kwupụtara na Bola Tinubu bụ ya meriri na ntuliaka e mere n'abalị 25 nke ọnwa Maach.

    Dịka o siri kwuo, INEC, Tinubu nwetara vootu dị 8,794,726 Atiku nwetara vootu dị 6,984,520, ebe Obi nwetara vootu 6,101,533.

  9. Presidential Election Petition: Ụlọikpe Kachasị ga-anụ mkpesa Atiku, Peter Obi taa

    Ụlọikpe Kachasị

    Taa ka Ụlọikpe Kachasị Nke Naijiria ga-anụ mbụ ya mkpesa n'aka mmadụ atọ zọrọ ọkwa Onyeisiala afọ 2023 megide mmeri nke Ụlọikpe pụrụ iche nyere Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu.

    Ọkaikpe asaa ga-anụ mkpesa ahụ Peter Obi nke Labour Party, Atiku Abubakar nke PDP na Uchenna Solomon nke APM wegaara ụlọikpe ahụ iji ịgbagha mkpebi nke Ụlọikpe pụru iche maka ntuliaka nyere ọnwa abụọ gara aga nke kwadoro mkpọpụta Inec kpọtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka e mere n'abalị 25 nke ọnwa Maach afọ 2023.

    Atiku wetara ikpe ya ọzọ na-ekwu na ya nwetara ike aka ebe ọhụrụ nke gụnyere asambodo mahadum Tinubu si mahadu "Chicago State University".

    Ndị ọkaiwu ahụ nụchaa ya bụ ikpe, ha ga-ewepụta ụbọchị ha ga-enye mkpebi ikpeazụ ha n'okwu ahụ.

  10. Ndewoonụ , Igbo ndị ọma!

    Ndewoonụ, Igbo ndị ọma!

    Ndụ mmiri ndụ azụ.

    Sonyere anyị ebe a maka ka o si aga n'akụkọ ihe na eme n'ụlọikpe Kachasị taa n'ike ọkwa na Ntuliaka Onyeisiala nke Afọ 2023.

  11. Peter Obi etinyela akwụkwọ mkpegharị ikpe n'ụlọikpe kachasị

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Peter Obi etinyela akwụkwọ ka ekpegharịa ikpe na-achị ikwapụ mmeri onyeisiala Bola Tinubu na ntuliaka e mere n'ọnwa Febụwarị.

    N'akwụkwọ o tinyere iji mee mkpegharị a, ọ sị na ụlọikpe ntụliaka nyere mkpebi ahụ esoghi ụzọ iwu mgbe ha tụpụrụ ikpe ya o wetaburu mbụ n'ihu ha.

    O kwuru na ọ bụghị ikpe nkwụmọtọ ka ndị ọkaikpe isee mere ebe ọ nọ mgbe ha sị na o kwughi ọgbọ ntụliaka ebe na ebe e nwere nrụrụaka na ntuliaka ahụ.

    Cheta na Obi ekwubuola na o kwenyeghi na mkpebi ụlọikpe pụrụiche ahụ kpebiri n'okwu ya o bugaara ha.

  12. Ekwetaghị m na mkpebi ‘tribunal’- Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi

    Onye fere ọkọlọtọ otu 'Labour Party' na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 bụ Peter Obi ekwuola na ya jụrụ mkpebi nke ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka kpebiri n’akwụkwọ ọ gbara Bola Tinubu nke APC o ji gbagha nkọpụta Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

    N’okwu ọ gwara ndị ntakụkọ n’Ọnicha ,Anambara steeti ụbọchị Tọzde, Obi sịrị na ya ga-agbaebe ndị ọkaikpe kpere ikpe ahụ kwụ were nye mkpebi há.

    N’ụbọchị Wenezde, ndị ọkaikpe ise nke Jọstis Haruna Tsammani bụ onyeisioche ha kpụpụrụ mkpesa Obi wetara nke o boro ebubo na e nwere nrụrụaka na ntuliaka ahụ, sị na ọ chịtaghị aja.

    Obi sịrị, "Dịka ndị wetara mkpesa, anyị na-akwanyere mkpebi ụlọikpe ugwu mana anyị ekwetaghị na ebe ha gbadoro ụkwụ na kwa ihe ha kpebiri."

    "Ọ bụ ebumnobi m dịka onye fere ọkọlọtọ ọkwa Onyeisiala nakwa nke Labour Party ịgbagha ikpe ahụ dịka iwu Naijiria si nye ohere."

  13. Anyị anabataghị mkpebi ụlọikpe- Labour Party

    Peter Obi/Okolotoio Labour Party

    Ebe foto si, Labour Party

    Otu Labour Party ajụla ịnabata mkpebi Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka nyere nke kụpụrụ ikpe nke onye fere ha ọkọlọto na ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023 bụ Peter Obi.

    Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka ọkwa Onyeisiala nọ n'Abuja nọrọ n'Abuja ụbọchị Wenezde kụpụ mkpesa nke Labour Party na Peter Obi wetara megide Bola Tinubu nke APC bụ onye Inec kpọpụtara dịka onye meriri na ntu;liaka ahụ.

    N'ozi nke Odeakwụkwọ mgbasaozi pati ahụ bụ Obiora Ifohbinyere aka ma wepụta n'abalị Wenezde, "Labour Party ji obi mwute na mgbawaobi ele nkụpụ nke otu ọkaikpe mmadụ ise nke onye nọ n'isi ya bụ Jọstịs mere taa. Anyị na-ajụ mpụtara ikpe ahụ kpamkpam n'ihi na ọ bụghị ikpe nkwụmọtọ, o gosịụịghị uche na ob=ebunobi ndị mmadụ. "

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  14. Ụlọikpe akụpụla akwụkwọ LP, Peter Obi gbara Tinubu

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

    Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka akụpụla mkpesa nke otu Labour Party(LP) na onye fere ọkọlọtọ pati ahụ bụ Peter Obi wetara maka ntuliaka Onyeisiala afọ 2023.

    Ụlọikpe akụ kwuru na mkpesa ahụ achịtaghị aja.

    LP na Obi na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ nke nyere Bola Tinubu nke APC maka na o nwetaghị pasent 25 n'Abuja nakwa na Tinubu enwetaghị vootu kachasị na ntuliaka ahụ.

    Ọkaikpe Jọstịs Haruna Tsammani nọ n'isi ikpe ahụ nke ọkaikpe ise chịkọtara gbadoro ụkwụ na Iwu Naijiria Akụkụ nke 134(2a) sịrị inweta pasent 25 n'Abuja na ntuliaka onyeisiala abụghị iwu.

    Ọ gara n'ihu kụpụ ikpe ahụ, sị na ọ chịtaghị aja.

  15. Ụlọikpe akụpụla mkpesa Peter Obi na Tinubu enwetaghị 25% n'Abuja

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

    Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka akagbuola mkpesa otu labour Party na onye fere ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka 2023 bụ Peter Obi na Bola Tinubu ya na ya zọkọrọ ọkwa ahụ enwetaghị vootu ruru pasent 25 n'Abuja isiobodo Naijit=ria na ntuliaka ahụ.

    Ụlọikpe ahụ kwuru na mkpebi ha n'ehihie Wenezde na ya bụ okwu achịtaghị ata.

    Onyeisioche ụlọikpe ahụ pụrụ iche bụ Jọstis Haruna Simon Tsammani, kwuru na Abuja enweghị ọkwa pụfụrụ iche dịka ya na steeti ndị ọzọ dị na naijiria ha nhatanha.

  16. Amaghị Tinubu ikpe maka ibu ọgwụike na mba Amerịka

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ekwuola na Bola Tinubu nke APC adaghị iwu ibu ọgwụike ọbụla na mba Amerịka.

    Ụlọikpe a kụchapụrụ ebubo na a nwụchiri Tinubu n’ihi ọgwụike na mba Amerịka.

    Ha kwuru na ụlọikpe mba Amerịka amaghị Tinubu ikpe kama na ọ bụ akụnaụba ya ka a na-apụrụ ya maka na a rụrụ ya aka, nke a kpọrọ “civil forfeiture’

    Ha kwuru na ndị mere mkpesa egosighi ihe akaebe na a nwụchiri Tinubu n’Amerịka ma ọ bụ maa ya ikpe n’okwu banyere ibu ọgwụike.

    Ha kwuru na o nweghi mgbe a kpọpụrụ ya n’ụlọikpe.

    Na o nweghi ikpe ọbụla a mara ya, n’ihi nke a na o gbochughi Tinubu ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Ụlọikpe kwuru na nyocha e mere bụ nke ndị ọrụ nchekwa mba Amerịka tinyere aka na ya gosiri na Tinubu enweghi akụkọ ime mbụ maọbụ ịda iwu n’iwu n’ụzọ ọbụla.

    Ụlọikpe gara n’ihu kwubie na Tinubu tozuruoke ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

  17. Peter Obi enweghi akaebe gosiri na e mere nrụrụaka na ntuliaka

    Onye ji aha Labour Party zọo ọkwa onyeisiala

    Ebe foto si, Peter Obi

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ekwuola na Labour Party nke Peter Obi enweghi ihe akaebe zuru oke iji gosi na e mere nrụrụaka na ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

    Ụlọikpe a kwuru na ndị mere mkpesa eweteghi ezi na akaebe gosiri na e nwere ọgbaghara kwụrụ ndị mmadụ ịtụ vootu ka ndị e boro ebubo zaghachị ha.

    Ụlọikpe a gara n’ihu kwuo na ndị a mere mkpesa kwuru na e mere nrụrụaka na ntuliaka mana ha enweghi ihe akaebe gosiri kpọmkwem ebe e mere nrụrụaka ndị a.

    Ụlọikpe enweghi ikike ileba anya n’ihe banyere onye bụ otu pati na onye abụghị onye pati, n’ihi nke a na mkpesa ahụ kwuru na Peter Obi etozughi iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

    Ụlọikpe kwuru na ndị akaebe Labour Pati na Peter Obi kpọtara ka ha gbaa etuzighi oke ịgba ama n’ihu ụlọikpe a maka na oge ha nwere ime nke a agaala.

  18. Kirie ihe onyonyo etu ikpe a si aga

    Soro ihe onyonyo a ka ị mata etu ikpe ahụ si aga

  19. Ụlọikpe agaala ezumike nkeji iri na ise

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka a agaala ezumike nkeji iri na ise.

    Nke a bụ ka onye ọbụla ma ndị ọkaikpe ma ndị ọkaiwu ṅụrụ obere mmiri ma lọghachịta azụ.

    Ngwa ngwa ha lọtara, ha ga-eleba anya na mkpesa PDP na LP mere.

  20. Ụlọikpe akụchapụla ebubo na Kasheem Shettima nwere nhọpụta abụọ

    Kasheem Shettima nke APC

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa akụchapụla akwụkwọ pati Alied Peoples Movement (APM) gbara n’ụlọikpe megide osote onyeisiala Kasheem Shettima na o nwere nhọpụta ugboro abụọ nke gụnyere ịzọ ọkwa sịneto na osote onyeisiala.

    Ndị ọkaikpe nọ n’isi ikpe ahụ kwuru na Shettima degaara ụlọọrụ Inec akwụkwọ na ọ ga-ahapụla nhọpụta ya dịka onye na-azọ ọkwa sịnetọ tupu ọ nabata nhọpụta ịzọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa.

    Ha gara n’ihu kwuo na o nweghi ihe gbochiri onye na-azọ ọkwa ịhọpụta osote ya ma ọ bụrụ na osote ya ahụ edeela akwụkwọ ma sepu aka ya n’ịzọ ọkwa ọzọ tupu ahọpụta ya.

    Ha gbakwụnyere na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa adịla mbụ chabie ikpe ahụ mgbe pati PDP mere mkpesa a.

    N’ihi nke a, ndị ọkaikpe ise nọ n’ikpe ahụ nke onyeisi ha bụ ọkaikpe Tsammani kachapụrụ ebubo na Shettima nwere nhọpụta abụọ.