Supreme Court judgment: Atiku arụọla Inec,ngalaba ikpe aka maka etu ikpe ọkwa onyeisiala 2023 si gaa

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Twitter
Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka 2023 n'aha otu PDP bụ Atiku Abubakar akpọọla oku ka a na-ekpecha ikpe nile metụtara ntuliaka tupu e duo ndị meriri na ntuliaka iyi ọrụ.
Atiku kwuru nke n'ụbọchị Monde dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ọ gachara abalị ole na ole Ụlọikpe Kachasị kpebiri n'ezie na ọ bụ Onyeisiala Bola Tinubu nke APC meriri na Ntulika 2023.
Atiku katọrọ Inec nakwa ngalaba na-ahụ maka ikpe maka etu okwu metụtara Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023 si gaa n'ụlọikpe.
" Ọ bụrụ na Ụlọikpe Kachasị site na mkpebi ha sịrị na mpụ dị mma, ị mara na ọ bụ Naijiria ka ihe furu. Obodo a nọ na nnukwu nsogbu, onye ọ sọrọ ya ya bụrụ ya nọ n'ọkwa Onyeisiala."
"Ọ bụrụ na Ụlọikpe Kachasị ga-ekpebi na Inec haziri ntuliaka nwere ikike ịgwa ọha ndị mmadụ otu ihe, mee ọzọ , iji hụ na e neyere mkpebi aghụghọ, ị mara na ọchịchị onyekwuoucheya ala anyị enweghị olileanya ọbụla."
Atiku kporo oku 'ka Anyị mee iji igwe tụọ vootu ma kpokọta mpụtara iwu" nakwa " "Ka ikpe nile metụtara ntuliaka bie tupou e duo onye meriri n'iyi ọrụ."
N'okwu ebe ọkwụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria, Atiku sịrị, "Ọ bụrụ na i chere na m ga-ahapụ ndọrọndọ ọchịchị, o nweghị ebe m na-aga."
Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mkpebi ahụ ga-apụta agaghị ebi n'ọtụtụ afọ na-abịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

















