Emefiele bipụtara ego ọhụrụ nke onyeisiala na-akwadoghị - Onye akaebe

Onye bụbu onyeisi mbipụta ego n’ụlọakụ etiti bụ Central Bank og Nigeria bụ Ahmed Bello Umar e kwuola na ego ọhụrụ ahụ e bipụtara n’afọ 2022 nke onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele hụrụ maka ya, dị iche na nke onyeisiala Muhammadu Buhari kwadoro.
Bello Umar kwuputara nke oge ọ gbara akaebe n’ikpe gọọmenti na-ekpe Emefiele.
O kwuru na ego ọhụrụ nke Buhari kwadoro ka e bipụta nwere ihe njirimara dị iche iche nke na-adịghị na nke Emefiele wepụtara.
Onye ọzọ gbara akaebe ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ na-ebipụta ego bụ Nigeria Security Printing and Minting Company (NSPMC) Umar Halilu, kwuru na ihe Bello Umar kwuru bụ eziokwu.
Halilu kwuru na ọ bụ n’ọnwa Oktoba afọ 2022 ka Emefiele gwara ya na onyeisiala enyela nkwado maka ibipụta ego ọhurụ ahụ, mana oge ahụ, ụlọọrụ NSPMC enweghị ihe e ji ibụta ego ọhụrụ ahụ. Ọ bụ ya mere ha ji wee kpọtụrụ ụlọọrụ De La Rue dị na mba UK ndị bipụtara ego ahụ.
Mgbe onye ọkaiwu juru Halilu ka ọ hụrụ nkwado onyeisi maka ibipụta ego ọhụrụ ahụ, Halilu siri mba na ya ahụghị ya.
O kwuru na ọ bụ £205,000 ka a kwụrụ De La Rue nke o kwuru na ya ahụghị akwụkwọ nkwado nke onyeisiala maka ya.
Onye okaikpe mechere tinye Septemba 19 na Octoba2, 9 na 17 mgbe a ga-alaghachita maka ikpe ahụ.
Ụlọikpe enyela Emefiele ikike i si n'ụlọ ya abịa ikpe

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela Godwin Emewfiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti ohere ị si n'ụlọ abịa ikpe ya taa.
Ọkaikpe Maryann Anenih tinyere ụgwọ mgbapụta ahụ dịka 300m nakwa mmadụ abụọ aka ha kwụ ọtọ nwere akụnaụba na Naịjirịa n'Abuja ị kwụrụ Emefiele dịka ndị akaebe.
Anenih kwuru na ndị ahụ ga-eweta kwa akwụkwọ ha ji zụ ala ha ma nyefee ya n'aka ụlọikpe ukwu ahụ.
Nke a na-abịa dịka Emefiela gọrọ isi onwe ya n'ebubo ndị e boro ya gụnyere iji N18.96bn ebiputa N684.5m na ndị ọzọ.
Emefiele ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje rue mgbe e mezuru ihe ndị a tupu a tọghapụ ya.
Nke ahụ so n'ebubo ọhụrụ anọ nke EFCC boro Emefiele dịka ikpe ya na-aga n'ihu.

EFCC ebokwasala Godwin Emefiele ebubo ọhụrụ

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka na Naijiria bụ EFCC n'ịchafụ ebokwasala Godwin Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ CBN ebubo n'elu nke e boburu ya. Nke a mere ka ngụkọ ebubo ndị e boro ya iji kpee ya ikpe siri n'isii rue iri abụọ. Isi sekpụ ntị n'ebubo ndị e boburu ya bụ izupu ego ruru otu ijeri naira na ụma nke mere ka ụlọikpe manyere ya nde naira narị atọ dịka ego mgbapụta ma gbochikwa ya ịhapụ Abuja kpam kpam. Okaiwu na-anọchite anya Emefiele bụ Matthew Burkaa rịọrọ ụlọikpe ahụ ka agbanwee iwu machiri Emefiele n'ime naanị Abuja ma nye ya ohere ịga ebe ọbụla na Naijiria nke ha kwetara.
Nke a mere n'agbanyeghị na okaiwu Efcc bụ Rotimi Oyedepo kwuru na o doghi ya anya maka na ụfọdụ mmadụ na-enye ụlọikpe akwụkwọ njem ha ma gaa n'azụ kwuo na o furu efu ma rịchapụ Naijiria rịbanye mba ọzọ. Ebubo ọhụrụ ndị e boro Emefiele gụnyere ịmepụta ihe adigboroja, ịkpa nkata mmepụta ihe adigboroja nakwa ikpa nkata ịda iwu wdg. Okaiwu Emefiele kwuru ka enye ya obere oge iji hazi asịsa ha n'ebubo ọhụrụ ndị a.
Ugbua, Emefiele ga-agba Ekeresimesi n'ụlọ ya

Ebe foto si, Mansur Ibrahim
Onye bụbụ onyeisi Ụlọakụ Etiti 'Central Bank of Nigeria'(CBN), Godwin Emefiele ga-enwe ohere ịgba Ekeresimesi n'ụlọ ya dịka a tọhapụrụ ya na mkpọrọ Kuje dị n'Abuja bụ ebe e jichiri ya , ụbọchị Fraide abalị 22 nke ọnwa Disemba, afọ 2023.
Ụlọntaakụkọ Punch bụ ndị gbara ama ụbọchị satode kwuru na ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ mkpọrọ bụ Adamu Duza, gwara ha na o mezuola ihe a tụrụ n'anya n'aka ya ime iji nweta ohere izi n'ụlọ abịa ikpe ya.
Cheta na ụlọikpe na-ekpe Emefiele ikpe n'ebubo mpụ n'ihe ọ zụrụ oge ọ bụ onyeisi CBN nyere ya ohere isi ụlọ na-abịa ikpe n'akwụkwọ nke ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka gbara ya ma ọ bụrụ na ọ kwụta nde narị naira atọ(300m) ma kpọta mmadụ abụọ nwere ụlọ na Maitama Abuja dịka ndị nkwụdo ga-akwụdoro ya.

Ebe foto si, CBN
Ọkaiwu Godwin Emefiele kwuru ụbọchị Tuzde na nwa amadi ahụ bụbụ Onyeisis Ụlọakụ Etiti bụ CBN enwebeghị ndị akaebe ga-akwụdoro ya.
Ụlọikpe Ukwu nke Abuja ebugala ikpe maka ebubo nrụrụaka e bọrọ onye bụbu Gọvanọ nke Central Bank of Nigeria (CBN), Godwin Emefiele gaa abalị 18 na 19 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024.
A na-ekpe Emefiele ikpe maka ebubo imefu ego ruru otu ijeri naira na ụma isii (N1.6Bn )n'ịzụ ụgbọala.
Emefiele gọrọ ebubo e boro ya ma sị na aka ya dị ọcha.
Ụlọikpe nyere Emefiele ohere isi n'ụlọ na-abịa mkpe ya n'abalị Nọvemba 17, 2023 ma sị ya kwụọ ego dị N300m, ma weta ndị akaebe mmadu abụọ, ma kpọchie ya n'ụlọ mkpọrọ Kuje, rụọ mgbe ọ zutere ọnọdụ mgbapụta ya.
N'okwu ikpe ya maliteghachiri, onye wetara ikpe ahụ mabụrụkwa onyeisi ụlọ ọrụ 'Corporate Affairs Commission (CAC) gwara ụlọikpe na Emefiele abụghị onye nwe ya ma ọ bụ onye nwe ụlọ na April 1616 Investment Limited, nyere CBN n'ịkwanye ụgbọala N1.2bn mgbe Emefiele nọ n' ọche.
Onye ọkaiwu EFCC bụ Rotimi Oyedepo duru ya n'ihe akaebe mgbe ọ na-enye ọtụtụ akwụkwọ gbasara etu esi weba ụlọọrụ ahụ n'August 1, 2016.
Ọ gụpụtakwara aha ndị nwe ụlọọrụ ahụ nke gụnyere Aminu Yaro, Maryam Abdullahi na Saadatu Yaro.
Ọkaiwu Emefiele, Mathew Burkaa, onye jụrụ ikwu okwu na igwe foto, kwuru na Emefiele emezubeghị ọnọdụ mgbapụta ya.

Ebe foto si, Mansur Ibrahim
Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja enyela ntuziaka ka a tọhapụ Onye bụbu onyeisi Ụlọakụ Etiti Central Bank of Nigeria(CBN) bụ Godwin Emefiela, ka o si n'ụlọ abịa ikpe.
Gọọmentị Etiti kpụrụ Emefiele ụloikpe maka ebubo nrụrụaka
Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstịs bụ Hamza Muazu kwuru ka Emefiele wetara ụlọikpe N300m ma kpọta mmadụ abụọ nwere ala na Maitama Abuja dịka ndị ga-akwụdoro ya.
Cheta na akwụsịrị Emefiela ọrụ n'ike n'ọnwa Juun.
Ndị uweojii nzuzo nwụchiri ya, emecha kpụ ya ụlọikpe ugboro ugboro n'ihi ebubo gụnyere inwe egbe mana Emefiel kwuru na aka ya dị ọcha.

Ebe foto si, CBN
Gọọmentị Etiti agbaala onyeisi ụlọakụ etiti 'Central Bank of Nigeria’ (CBN) akwụkwọ n’Uloikpe Ukwu nke Etiti dị n’Ikeja, Legọs, maka ebubo inwe egbe na mgbọ egbe.
Gọọmentị na-ebo ebubo na Godwin Emefiele dara Akụkụ nke Anọ n’Iwu Naijiria nke metụtara Ngwaọgụ nke Afọ 2004( Section 4 of the Firearms Act, Cap F28 Laws of the Federation 2004.)
Nke a na-abịa dịka Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja nyere ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n’ịchafu bụ ndị ji ya iwu ka ha tọhapụ ya na mkpọrọ ha.
DSS nwụchiri Emefiele n’abalị iri nke ọnwa Juun afọ 2023 ma jichie ya maka ebubo iji ego akwado iyi ndu egwu, isa ego na ihe ndị ọzọ.
Mana Emefiele gbara DSS akwụkwọ n’ ụlọikpe maka ikike dịịrị ya n’iwu ịga ebe masịrị ya.
Ụlọikpe akagbuola nnwụchi DSS nwuchiri onyeisi ụlọakụ etiti

Ebe foto si, Aso Rock
Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja akagbuola nnwụchi nke ndị uweojii nzuzo Naijiria a kopọrọ Department for State Security(DSS) DSS nwụchiri Onyeisi Ụlọakụetiti bụ Godwin Emefiele.
Ụlọikpe ahụ nyere DSS iwu ka ha tọhapụ nwamadi ahụ.
N'ikpe ya ụbọchị Fraide, Ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstịs Bello Kawu, kwuru na nnwuchi na-ịgba ajụjụ ọnụ DSS mere Emefiele megidere mkpebi na ntuziaka nke Jọstis Hassan nyere n'akwụkwọ nke DSS gbaburu nwa amadi ahụ n'ikpe nke akara ya bụ FCT/HC/GAR/CV/41/2022.
Akụkọ ka na-abịa
N'ụbọchị Tozde, DSS kpụrụ Emefiele iwu ka ụlọikpe nyechara ha iwu ha tọhapụ ya maọbụ kpụpụ ya ụlọikpe kama ijichi ya n'ogige ha.
DSS nwụchiri n'abalị iri nke ọnwa Juun,afọ 2023 ma jichie ya maka ebubo iji ego akwado iyi ndụ egwu, ịsa ego na ịkpa agwa megidere ọdịmma ala Naijiria.
Mana Emefiele gbara DSS akwụkwọ si na ụlọọrụ ahụ na onyeisi ha bụ Yusuf Magaji Bichi akwụkwọ n'ụlọikpe maka ịnapụ ya ikike dịịrị ya ịkpagharị dịka nwaamala.
DSS akpụpụla Godwin Emefiele ụlọikpe

Ebe foto si, CBN
Dịka Ụlọikpe Ukwu nke Abuja nyere iwu taa, ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'ịchafụ ak pụpụla onyeisi ụlọakụ etiti Central Bank of Nigeria(CBN ụlọikpe.
Ụlọikpe Ukwu Naịjirịa dị n’Abuja nọrọ ụbọchị Tọzde, abalị 13 nke ọnwa Julai, afọ 2023 nye iwu ka DSS kpụkpụ Emefiele ụlọikpe maọbụ tọhapụ ya n’otu izuụka.
N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunaya binyere aka, ọ rụtụrụ aka "na n'afọ 2022, DSS tinyere akwụkwọ ịnata ikike ijichi ya maka nnyocha metụtara mpụ."
Ọ gara n'ihu kwuo sị,"Na-agbanyeghị na Emefiele natara ikike igbochi nnwuchi ya site n'ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, DSS nwuchiri ya ọzọ n'ọnwa Juun afọ 2023 n'ihi ebubo mpụ ọhụrụ pụ nke e ji ekpe ya ikpe ugbua.
Godwin Emefiele: DSS, tọhapụ ya maọbụ kpụpụ ya ụlọikpe - Ụlọikpe Ukwu
Oge ntuliaka imeụlọ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche na-aga n'ihu n'afọ 2022, maka ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala na 2023, akụkọ pụtara na Emefiele chọrọ iso zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
Nke a mere dịka otu kpọrọ onwe ha otu jikọrọ ndị ọrụ ugbo na mpaghara ugwu Naịjirịa, zụtara akwụkwọ n'aha Emefiele ka o wee sonye na ntuliaka imeụlọ nke pati 'All Progressives Congress' maka ịzọ ọkwa onyeisiala.
Nke a gbagwojuru ọtụtụ mmadụ anya, maka na dịka ọkwa ya si dị, onyeisi ụlọakụ etiti ekwesịghị ịbụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ọ bụ eziokwu na Emefiele pụtara n'oge ahụ kwuo na aka ya adịghị n'okwu ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla, mana ụfọdụ ka na-ekwu na e kwesịrị ime nnyocha iji mata ma Emefiele ọ dara iwu.
Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na ndị ọrụ nchekwa ejidela Emefiele, mana BBC amabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.

Ebe foto si, Central Bank of Nigeria
Ọkaikpe Hamza Mu'azu nke ụlọikpe ukwu Naịjirịa n’Abuja enyeela iwu ka ụlọọrụ DSS kpụkpụ Godwin Emefiele ụlọikpe maọbụ tọhapụ ya n’otu izuụka.
Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa nke a kwụsịrị ọrụ nwamgbenta maka ebubo ụfọdụ nọ n’aka ndị ụlọọrụ DSS nwụchiri ya kemgbe izuụka olemole gara aga.
Ọkaiwu ya bụ Joseph Daudu gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Tọọzde abalị 13 nke ọnwa Jụlịa na “ịga n’ihu jichie ya megidere iwu dịka akpụkpụbeghi ya ụlọikpe kemgbe, ọ bụ ihe na-ezighi ezi ịjichi mmadụ tupu ịmalite ịchọ ihe akaebe ịga iji kpụkpụ ya ụlọikpe”.
“Anyị na-atụ anya na ụlọọrụ DSS ga-atọhapụ ya ka o si n’ụlọikpe na-abịa ikpe ya taa”.
“Ọ bụghị ihe ziri ezi na onyeisiala ọhụrụ Bola Tinubu ga-eji ịnupuru ụlọikpe isi kọọ ọchịchị ya ihu”.
Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka onyeisiala Tinubu gwa ụlọọrụ DSS ka a tọhapụ Emefiele ngwa ngwa.
Cheta na ụlọọrụ DSS nwụchiri ya n’ụbọchị 10 nke ọnwa Juun ka onyeisiala Tinubu nyechara iwu ka ọ kwụsị ọrụ ya dịka onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa nwamgbenta.

Ebe foto si, DSS/AFP
Etu e siri nwụchie ya
Ụlọọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ 'Department of State Services (DSS) ekwuola na ha ejichiela Godwin Emefiele, bụbu onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa.
Ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Afunanya kwupụtara nke a site n'akara Twitter nke ngalaba ahụ.
Nke a na-abịa ihe dịka awa abụọ maọbụ ata Afunanya kwuchara na ha ejideghị Emefiele.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Akụkọ malitere ifegharị n'ụbọchị Satọde nke kwuru na ndị DSS jidere Emefiele.
Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwụsịla Emefiele ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ etiti na mgbede ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Jun 2023.
N'ebe elekere iri nke ụtụtụ Satọde, DSS zipụtara ozi n'akara Twitter ha ma kwuo sị: "Ka ọ dị ugbua, Emefiele anọghị n'aka DSS."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Getty Images/FIRS
Ụlọakụ Etiti nke Naịjirịa enwetala onyeisi ọhụrụ nke nchereoge dịka Onyeisiala Bola Tinu chụpụrụ Godwin Emefiele.
Aha onyeisi ọhụrụ a bụ Folashodun Adebisi Shonubi, onye jibu ọkwa 'Deputy Governor (Operations Directorate) n'ụlọakụ etiti.
A họpụtara Shonubi dịka osote gọvanọ n'ụlọakụ etiti n'ọnwa Ọktoba afọ 2018.
Lee ụfọdụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ Folashodun Adebisi Shonubi:
- A mụrụ ya n'ụbochị asaa nke ọnwa Maachị afọ 1962
- Ọ bụ onye Ogun Steeti
- Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na ụlọakwụkwọ 'Government College' nke Ibadan
- Ọ gụrụ akwụkwọ dị elu na Mahadum Legọs, malite n'afọ 1978 ruo 1983
- O nwere ọzụzụ na ngalaba 'Mechanical Engineering', mana n'etiti afọ 1988 ruo 1989 ọ gbanwere ngalaba ọzụzụ ya gafee na ngalaba ego dịka o nwetara nzere 'Masters' na 'Business Administration'
- Ọ malitere ọrụ n'ụlọakụ Citibank n'afọ 1990
- O sonyeere ụlọakụ etiti dịka osote gọvanọ n'afọ 2018
- O sokwa na ndị isi na ngalaba gọọmentị na-anakọ ụtụisi a kpọrọ 'Federal Inland Revenue Service' (FIRS) ebe ọ na-anọchite anya onyeisi ụlọakụ etiti
Ihe mere Onyeisiala Tinubu ji kwụsị Godwin Emefiele ọrụ dịka onyeisi ụlọakụ Etiti

Ebe foto si, Tinubu/CBN
Akụkọ pụtara n'abalị ụbọchị Fraịde na Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akwụsịla Godwin Emefiele ọrụ dịka Gọvanọ ụlọakụ etiti nke Naịjirịa,
Akwụkwọ ozi si n'aka ụlọọrụ Odeakwụkwọ nke Gọọmentị Etiti kwuru na nkwụsị ọrụ a bụ "iji nye ohere maka nnyocha nke na-aga n'ihu ugbua n'ụlọọrụ Emefiele nakwa atụmatụ iji wulite ngalaba ego nke Naịjirịa".
Emefiele ga-enyefe ọrụ n'aka onye ji ọkwa osote gọvanọ (Operations Directorate) na-egbughị oge, dịka ntuziaka gọọmentị si dị.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Akwụkwọ ozi ahụ ekwughị kpọmkwem ihe Emefiele mere e ji akwụsị ya ọrụ, o kwughịkwanụ kpọmkwem ihe nnyocha ahụ na-aga n'ihu ugbua bụ maka ya.
Mana dịka ndị ọkachamara na ngalaba ego Naịjirịa si kwuo, ihe a merenụ bụ ihe a tụrụ anya na ọ ga-eme n'ihi ihe dị icheiche mere n'ebe ngwụcha afọ 2022 ruo mgbe e mechara ntuliaka nke afọ 2023.
Gịnị bụ ihe ndị a:
Mgbanwe akwụkwọ ego Naịra

Ebe foto si, Getty Images
N'ebe ngwụcha afọ 2022, Godwin Emefiele kwuru na ụlọakụ etiti ga-agbanwe akwụkwọ ego naịra nke N1000, N500, na N200.
Ụlọakụ etiti wepụtakwara iwu ọhụrụ nke belatara ego mmadụ nwereike iwere n'ụlọakụ maọbụ site n'igwe ATM n'otu ụbọchị maọbụ otu izuụka maọbụ otu ọnwa.
Ihe Emefiele kwuru kpatara atụmatụ mgbanwe ego a gụnyere:
- Iji jikwaa ego Naịjirịa maka na ijeri kwuru ijeri naịra dị n'aka ndị mmadụ nkịtị kama ịdị n'ụlọakụ dịka o si kwesị.
- Ọtụtụ ego naịra emeela ochie nnukwu ma jọọ njọ ile anya nke pụtara na ha na-ebutere Naịjirịa ihe ihere.
- Iji gbochie ndị na-ebipụta naịra adịgboroja.
- Iji gbochie ndị na-atọrị mmadụ maka ego a ga-akwụ ha
Mana ọtụtụ, ọ kachasị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị katọrọ atụmatụ ahụ ma kwuo na ọ bụ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị ka Emefiele ji wepụta ya bụ atụmatụ.
N'agbanyeghị nke a, onyeisiala oge ahụ bụ Muhammadu Buhari nyere Emefiele nkwado ka ọ gaa n'ihu.
Atụmatụ mgbanwe ego a butere oke ihe isi ike na Naịjirịa malite n'ọnwa Disemba 2022 oge ego ọhụrụ ndị ahụ pụtara ruo oge e mechara ntuliaka, n'ihi na ego ọhụrụ ndị ahụ agazughị ọnụ, ọ na-ara ahụ tupu mmadụ enweta ya, bịakwa bụrụ na ọtụtụ ndị mmadụ akwụnyela ego ochie ha n'ụlọakụ n'ihi na CBN kwuru na ego ndị ahụ adịghịzi ire.
Ụfọdụ ndị gọvanọ wegara mkpesa maka nke a n'ụlọikpe kachasị, ha wee nye iwu ka ụlọakụ etiti weghachite ego ochie ruo ngwụcha ọnwa Disemba afọ 2023.
Okwu gbasara ịzọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, Premium Times








