CBN Governor: Godwin Emefiele ritue n'ọkwa tupu ị chọwa ọkwa onyeisiala - Ezekwesili

Oby Ezekwesili na Godwin Emefiele

Ebe foto si, Getty Images/Oby Ezekwesili

Oby Ezekwesili, onye bụbu Mịnịsta agụmakwụkwọ na Naịjirịa, asaala Godwin Emefiele maka agụgọ na ọ bụghị ya zụrụ akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala.

Cheta na akụkọ pụtara na Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa a kpọrọ 'Central Bank' na bekee, azụrụla akwụkwọ iji zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati 'All Progressives Congress'.

Ezekwesili gwara Emefiele na "ọ bụ ọchịchọ ziri ezi ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 mana ị ga-ebu ụzọ rituo n'ọkwa dịka onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa."

O depụtara n'akara Twitter ya sị "egwuregwu iji ndụ ndị Naịjirịa na ọkwa gị egwu nwere nsogbu. Ritue n'ọkwa"

Nke a na-abịa dịka Emefiele gọrọ n'onweghi onye ọ sị ya zụtara ya akwụkwọ mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala.

Ọ sị na ọ ga-eji ego ya zụta ya maọbụrụ na ọ batara ya n'uche ịzọ ya bụ ọkwa.

"M ga-eji aka m zụta akwụkwọ mmasị ma oge ruo"

Godwin Emefiele

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Godwin Emefiele bụ Govanọ ụlọakụ ukwu Naijiria

Onyeisi ụlọakaụ etiti bụ Godwin Emefiela apụtala kwuo na onweghi mgbe o ji zie onye ọbụla gbatara ya akwụkwọ ịzọ onyeisiala.

O kwuputara nke a n'akara Twitter dịka ọ na-ewu ebe niile na otu ndị ọrụ ugbo jịkọrọ aka zụtara akwụkwọ iji zọ onyeisiala.

Emefiele sị "Ọ bụrụ na m chọọ ịzọ ọkwa ọbụla, m ga-eji ego m rụtara n'ọrụ dịka onye ọrụ ụlọọakụ kemgbe afọ iri atọ na ise"

Ọ si na ọ ga-eme nke ya n'uzo ziri ezi debere iwu kpuchiri ala Naịjirịa.

Iwu ụlọakụ etiti ogbochiri Godwin Emefiele ịzọ ọkwa Onyeisiala?

Godwin Emefiele

Ebe foto si, CBN

Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti esonyela ndị na-azọ ọkwa ọkwa Onyeisiala Naịjịrịa nke afọ 2023.

Nwamadị a dị afọ iri isii chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha pati All Progressive Congress (APC).

Otu onye ọrụ na pati APC gwara BBC na Emefiele azụọla akwụkwọ mmasị isonye na ntuliaka ime ụlọ nke pati ahụ.

Ọ bụ ihe a hụtụbeghi na mbụ na onye ji ọkwa onyeisi ụlọakụ etiti ka nọ n'ọrụ ga-apụta ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

Kedụ ihe Central Bank kwuru maka onyeisi ha ịzọ ọkwa

O nweghi ebe iwu ụlọakụ etiti kwuru na onye bụ onyeisi ha maọbụ osote ya agaghị azọ ọkwa onyeisiala mama iwu gbochiri ịbụ onye omeiwu gọọmentị etiti maọbụ nke steetị ọbụla.

Iwu ụlọakụ etiti

Ebe foto si, CBN

Iwu ụlọakụ etiti

Ebe foto si, CBN

Iwu ụlọakụ etiti

Ebe foto si, CBN

Iwu ụlọakụ etiti

Ebe foto si, CBN

N'otu akụ iwu ntuliaka egbochibeghi onye ọbụla ji ọkwa na gọomentị ịpụta zọọ ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Nke a so n'iwu e na-ebe anya na mmegharị iwu ntuliaka bụ gọọmentị na ndịome iwu ka na-arụrịta ụka banyere ya.

Emefiela abụghị onye mbụ ji ọkwa na gọọmentị ga-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, ndị ọzọ merela nke a gụnyere;

Chibuike Amaechi bụ minista na-ahụ maka ime njem, Chris Ngige bụ minista na-ahụ maka ndị ọrụ bekee, Ogbonnaya Onu bụ minista na-ahụ maka sayensị na tekịnụzụ na ndị ọzọ.

Ihe i kwesịrị ịma maka Godwin Emefiele

  • Gowin Emefiele bụ onye obodo Ika South dị na mpaghara Agbor nke Delta Steetị
  • A mụrụ ya na Legọs Steetị n'ụbọchị anọ nke ọnwa Juun, afọ 1961
  • Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Ansar Udin ma gụọ Sekọndịrị Maryland Secondary dịcha na Legọs
  • Ọ gụrụ mahadum na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na ngalaba Banking and Finance ma bụrụ onye mbụ na klassị n'afọ 1984.
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na Stanford University, Harvard University (2004) nakwa Wharton School of Business (2005)
  • Ọ rụrụ ọrụ n'ụlọakụ dị iche iche ruo ihe karịrị afọ iri na asatọ, ọ rụrụ ọrụ dịka otu n'ime ndịisi ụlọakụ Zenith Bank na Naịjirịa nakwa Gambia.
  • O were ọkwa dịka onyeisi ụlọakwụ etiti n'afọ 2014 bụ ebe ọkwa o ji rute ugbua.