Chioma Egodi Vs Erisco Foods : Etu e si nwuchie nwaanyị maka ide na tomato mkpọ ọ zụrụ n'ahịa nwere shuga

Chioma Egodi(Jnr) na njirimara Ersco Foods Limited

Ebe foto si, Chioma Egodi Jnr/Ersco Foods Limited/Facebook

Ngalaba na-echekwa ọdịmma ndị na-azụ ihe bụ 'Federal Competition and Consumer Protection Commission' (FCCPC ) ekwuola na ọ bụ ezie na a nwụchiri otu nwaanyị maka ihe o kwuru banyere tọmato mkpọ ọ sị ọ zụrụ n'ahia ma kpụga ya Abuja.

Chioma Egodi, danyere na nsogbu dịka o wepụtara ozi n'akara ya na Facebook n'abalị 17 nke ọnwa Septemba afọ 2023 na-ekwu na ya zụrụ mkpọ tọmatọ nke ụlọọrụ Erisko Food Limited, detụ ya ire ọ na-atọ shuga shuga.

Ozi ahụ nke Egodi gara n'ihu jụọ ndị na-eso ya ma o nweela ndị zụrụ tọmatọ mkpọ ahụ, ha gwa ya ka ha sị hụta ya, rụrụ ụlọọrụ Erisco Food Limited afọ nke mere ha ji wega mkpesa mere ka ndị uweojii nwụchie Egodi na Legọs ma kpụga ya Abuja.

Ozi si n'aka Chioma Egodi

Ebe foto si, Chioma Egodi/Facebook

Ụlọọrụ Erisco Foods Limited bụ ndị nwe 'Nagiko Tomato Mix' bụ tomato mkpọ ahụ Oriaku Egodi dere maka ya kwuru na ihe o dere bụ "ụgha" ma bụrụkwa aka ọrụ ndị ọ na-ewe iwe na ahịa ha na-erezị gwoogwoo.

N'ozi mgbasaozi ha wepụtara n'abalị 21 nke ọnwa Septemba, ha sịrị, " Anya ụlọọrụ Erisco GFood Limited erutela ozi nke otu onye kpọrọ onwe ya Chioma Egodi Jnr wepụtara n'abalalị 17 nke ọnwa Septemba nke kwuru na shuga karịrị na Nagiko Tomato Mix bụ otu n'ime ụdị tomato atọ anyị nwere, na ọ dịghị mma mmadụ iri."

"Nke a bụ okpotomkpo asị."

"Anyị chọburu ịgbachi ozi ahụ nke ndị zipụtara chọrọ iji rafuo ndị na-azụ anyị ahịa,nkịtị bụ aka ọrụ ndị ọ na-ewe iwe na ahịa anyị na-erezi ebe ọ dị ukwu."

Erisco Food Limited ndị kwuru na ọ bụ naani tomato ka ha ji eme tomat mkpọ ha, kwukwara na ha gaewegara ngalaba ndị ọ dịrị mkpesa maka ihe Egodi deere.

Erisco Foods Limited

Ebe foto si, Erisco Foods Limited/Facebook

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu

Ọtụtụ ụmụ Naijiria nụrụ akụkọ ihe mere na soshali midia malitere ịkatọ ụlọọrụ na-emepụta tọmatọ mkpọ ahụ, sị na agwa ha gosiri ịkpagbu onye ahịa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Mana ụfọdụ ụmụ Naijria katọrọ Egodi maka ihe ha kpọrọ imebi ahịa onye ọzọ.

Ebe FCCPC kwụ

Ngalaba ọ bụ ọrụ ha ichekwa ndị na-azụ ihe bụ FCCPC kwuru na ha ga-akpọ ụlọọrụ Erisco Food Limited oku maka nnwụchi a nwụchiri Egodi.

Onyeisi FCCPC bụ Babatunde Irukera kwuru n'ozi o wepụtara n'ọbaozi X(bụbuTwitter) sị na ọ bụ eziokwu na anwụchiri Egodi kpụga ya Abuja na ya na ndị uweojii Abuja na-akpa dịka ya zigarala ụlọọrụ Erisco Foods ozi akpomoku.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4