Nsogbu anyị nwere bụ na ndị Anambara anaghị akwụ ụtụisi - Soludo

Aha onyonyo, Charles Soludo: Nsogbu anyị nwere bụ na ndị Anambara anaghị akwụ ụtụisi
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara na Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter na Video Journalist

Aka na-achị Anambra steeti bụ Charles Soludo ekwuola na mmepe obodo ndị mmadụ na-atụ anya ya, dịka agụmakwụkwọ na ezigbo ọkporoụzọ, bụ n'ego ụtụisi gọọmentị na-anakọta ka ọ ga-esi.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, o kwuru na ọtụtụ ndị nnukwu mmadụ ndị nwere ụlọ na ụlọọrụ, kwesịrị ị na-atụ ụtụisi ha oge niile, anaghị eme nke a.

Soludo kwuru na ọrụ ọchịchị ya bụ ịgbanwe nke a, ma kwụsịkwa ndị agbara na-ana ụtụisi iji nye ohere ka ego na-abata n'akpa gọọmentị etu o kwesịrị.

Charles Soludo

Ọ rụtụkwara aka n'ihe ndị ọzọ ọchịchị ya na-eme iji kwalite akụnaụba, agụmakwụkwọ nakwa iji belata ahụhụ so mwepụ gọọmentị etiti wepụrụ ego nkwụbilata ego mmanụ ụgbọala (fuel subsidy removal), na ihe ndị ọzọ.

Gere mkparịtaụka a n'ụju n'ihe onyonyo dị n'elu: