Exclusive Interview: 'Ndị ritere ọkwa gọvanọ n'ụlọikpe ma n'ime obi ha na ha abụghị gọvanọ' - Rochas Okorocha
Aka chiburu Imo Steeti, bụ Rochas Okorocha, gwara BBC Igbo ọtụtụ ihe banyere ihe na-eme na steeti ahụ ugbua nakwa etu o siri metụta ya.
Rochas sị na ọ teela ndị mmadụ si ebe dị iche iche rụọwara ya ka ya pụta ịzọ ọchịchị onyeisiala maka ihe ọma ya megoro ha tupu ya abata ndọrọndọrọ ọchịchị.
O kwuru na nke a bụ nke ugboro anọ ya ọ ga-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa maka na ọ dị ya mnwute na nnukwu obodo dị ka Naịjirịa bụ ihe ndị mmadụ jizi eme "karịkaọchị".
Ọ sị na "ọ bụ ihe mnwute na Naịjirịa adịghị n'otu. Ọ bụ ihe mnwute na ana egbuzi mmadụ ka ọkụkọ na Naịjirịa'. Ọ sị na ọ bụ ya mere ya jiri chọọ ịpụta maka ịzọ ya bụ ọkwa.
Mana ugbua, na ya apụtabeghị maka nke a maka na ihe niile nwere usoro.
Ọ sị na oge ruo na ya ga-apụta kwuo otu a.
Geezia ọkpụrụkpụ okwu ndị ọzọ o kwuru.


