Rochas Okorocha: Sineti na-emefu nnukwu ego na ekwesighi ekwesi
Okorocha chọro ka e weleta mmadụ ole ndị na-aga ụlọ nnọchiteanya n'ụlọomeiwu.
N'uche ya, "o nweghị ihe mmadụ atọ mere n'ụlọomeiwu otu onye agaghị emeli".
Okorocha sị na a sị ya pụọ na ya bụ ụlọomeiwu ka Naịjirịa dị mma, na ya ga-apụ.
O kwukwara na ọ dịmkpa ka Naịjirịa tiny uche na ịchọwa ụzọ ọzọ ha ga-esi kpata ego na abụghị mmanụ agbidi.