Rochas Okorocha: Sineti na-emefu nnukwu ego na ekwesighi ekwesi

Aha onyonyo, Rochas Okorocha: Ọ bụrụ na asị m pụọ na Senate ka Naịjirịa dị mma, aga m apụ

Okorocha chọro ka e weleta mmadụ ole ndị na-aga ụlọ nnọchiteanya n'ụlọomeiwu.

N'uche ya, "o nweghị ihe mmadụ atọ mere n'ụlọomeiwu otu onye agaghị emeli".

Okorocha sị na a sị ya pụọ na ya bụ ụlọomeiwu ka Naịjirịa dị mma, na ya ga-apụ.

O kwukwara na ọ dịmkpa ka Naịjirịa tiny uche na ịchọwa ụzọ ọzọ ha ga-esi kpata ego na abụghị mmanụ agbidi.

Akụkọ ga-amasị gị