Nigerian Independence Day 2023: Akwụsịrị m 'fuel subsidy' maka ọganihu Naịjirịa - Bola Tinubu

Ebe foto si, NTA
- Mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala
- Ntinye N25,000 n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmentị
- Mbelata ọnụego e ji eme njem
- Nhazigharị ụlọọrụ CBN
- Mgbanwe ụtụ isi
- Ọrụ
- Nleta anya ọha
- Nchekwa ọha
- Ndị ọrụ nchekwa nwụrụ maka obodo Naịjirịa
- Inye ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa ọrụ na gọọmentị
- Otu ndị ọrụ
- Onye dere ya, Chioma Nkemdilim Daramola
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
Dịka taa bụ ụbọchị ncheta nnwereonwe Naịjirịa, onyeisiala Bola Tinubu kwuru okwu iji kwalite mmụọ ndị ọ na-achị. Nke a mere n'elekere asaa nke ụtụtụ a.
Lee ihe ndị o kwuru.
Maka mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala
Aghọtara m ihe unu na-agabiga dịka m wepuru ego mbelata mmanụ ụgbọala. A na m ahụ ihe na-eme nụ. Ọ na-emetụta m n'obi.
Mana ọ bụ ihe anyị ga-edi maka ọdịmma, ọganihu na ntolite akụnaụba obodo anyị.
Abụghị onye ga-arụ ụlọ Naịjirịa na ntọala apịtị. Ka anyị diwe, ka anyị nwe ike ịrụ ụlọ anyị na ntọala siri ike.
Maka ntinye ego N25,000 n'ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmentị
Site na mkparịtaụka anyị na ndị ọrụ, achụmnta ego, na ndị ọzọ, anyị ga-ebulite ụgwọ ọnwa.
Nke a bụ iji hụ na ụgwọ mpekatampe emeghị ka ọnụ ahịa rịa elu.
Site ugbua ruo ọnwa isii, onye na-arụ ọrụ dị ala ga-enweta ụgwọ ọnwa ruru puku naịra iri abuo na ise (N25,000) kwa ọnwa.
Maka mbelata ọnụego e ji eme njem
Ịhụ na akụnaụba siri ike dị mkpa.
Anyị emepeela otu na-ahụ maka ụgbọ njem ọha ga-eji Compressed Natural Gas (CNG) dị ọnụ ala n'ebe niile na Naịjirịa.
Ọnụego bụss ndị a erughi ndị a na-etinye mmanụ ụgbọala.
Nhazigharị ụlọọrụ CBN
A na m ekwe unu nkwa na a ga m ekpochapụ ndị na-emebi ụlọọrụ CBN. Etinyela m onyeisi ọhụrụ ebe ahụ.
Ọzọkwa, onye dunyere ọrụ ime nyocha ga-ekwupụta ihe ọ chọpụtara, na etu a ga-esi kwụsị mpụ ime ebe ahụ ọzọ.
Site ugbua gawa n'ihu, iwu gbasara ego ga-abanyere onye ọbụka uru, ọ gaghịzi abụ naanị ndị ji ike na ego.
Mgbanwe ụtụ isi
Amalitela m 'Committee for Tax Reforms' ga-emelite nchịkwa ụtụ isi n'obodo.
Ha ga-eleba anya na mmefu ego na ihe ndị na-egbochi ntolite akụnaụba Naịjirịa.
Ọrụ
Iji kwalite ọrụ na ụgwọ ọnwa, anyị ga-etinyetụ ego n'ụlọọrụ dị iche iche.
Nleta anya ọha
Malite n'ọnwa a, ezinaụlọ ruru nde iri na ise ga-enweta ego iji belata ụbịam.
Nchekwa ọha
Okpuruọchịchị m ga-ahụ na ihe kachasị anyị mkpa bụ nchekwa onye ọbula.
Mmekọrịta ọrụ n'etiti ndị nchekwa na ndị gọọmentị ndị ọzọ na-aga n'ihu.
Ndị ọrụ nchekwa nwụrụ maka obodo Naịjirịa
Ana m enye ndị nchekwa ụkpa ekele pụrụiche maka ọrụ ha. Ọtụtụ n'ime ha alaala mụọ. Anyị na-echeta ha na ezinaụlọ ha taa.
Anyị ga-ahụ na nwetara ngwaọrụ kwesịrị iru ha aka, nke ga-enye ha aka n'ọrụ ha na-arụ.
Inye ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa ọrụ na gọọmentị
Anyị ga-aga n'ihu ịhụ na enyere ọrụ pụrụiche dịka iwu obodo siri kwuo, site n'ụzọ ziri ezi.
Ụmụnwaanyị, ndị ntorobịa na ndị nwere nkwarụ ga-enweta ọrụ ebe ha kwesịrị.
Otu ndị ọrụ
Ana m ekele ndị otu 'civil society' na ndị ọrụ 'labour ụnịon' maka etu ha si etinye uche ha na nnwereonwe Naịjirịa.
Anyị anaghị ekwekọrịta mgbe niile, mana ana m anabata ndụmọdụ unu.
Unu bụ ụmụnne m. Ana akwanyere unu ugwu.








