Ladipo Market: Ihe mere gọọmenti Legọs steeti ji kpọchie ahịa anyị - Ndị isi ahịa Ladipo

ahia ladipo

Ndị isi ahịa Ladipo spare parts market na Legọs na-ekwu na gọọmenti enyeghị ha ịdọ aka na ntị obụla tupu ha emechie ahịa ha maka ebubo iru unyi.

Otu n'ime ndị ahịa ahụ aha ya bụ Onyekachukwu Igwe gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka n'ụbọchị Fraide.

Igwe kwuru na gọọmenti sị na ha mechiri ahịa Ladipo n'ihi na okirikiri ahia ahụ ruru nnukwu unyi, mana ha bụ ndị ahịa enwetaghị ozi ịdọ aka na ntị obụla n'aka gọọmenti gbasara nke a.

ahia ladipo

O kwuru sị: Onweghị ihe ọbụla na-esere anyị na gọọmenti.

Anyị na-erube isi n'iwu gọọmenti niile mana ọ gbara anyị gharịị etu has si mechie ahịa anyị.

"Arịrịọ ka anyị na-arịọ ha, maka na anyị na Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu dị na mma.

Ha biko mepeere anyị ahịa maka na puku kwuru puku ndị mmadụ na-azụ ahịa ebe a bụ kwa ụbọchị ka ha na-enweta ego ha ji enye ezinụlọ ha nri.

Oge BBC jụrụ Mazị Igwe ma ọ bụ eziokwu na ndị ahịa Ladipo ji gọọmenti ụgwọ maka mkpocha okirikiri, o kwuru sị, "Amaghị m maka ụgwọ ọbụla anyi ji gọọmenti, mana ọ bụrụgodi na anyị ji ụgwọ, anyị ga-akwụ ụgwọ anyị ji."

"Gọọmenti gaara enye anyị ozi ịdọ aka na ntị maka ụgwọ anyị ji, tupu ha emechie ahịa anyị.

Mana ka o sila dị, onye ji ụgwọ ga-akwụ ụgwọ o ji."

ahia ladipo

Akwụkwọ e ji mechie ahịa Ladipo nke BBC Igbo hụrụ, gosiri na ngalaba "Lagos State Waste Management Agency" (Lawma) si na ndị ahịa Ladipo dara iwu gbasara mkpocha okirikiri.

Lawma kwuru na ọ bụrụ na ndị ahịa ahụ Ladipo akwụchaghị nha ha maka ịda iwu, a gaghị emepe ahịa ahụ.

Ladipo bụ nnukwu ahịa dị na mpaghara Mushin na Legọs, ebe a na-ere akụkụ ụgbọala dị icheiche.

Ọtụtụ ndị na-azụ ahịa n'ahia ahụ bụ ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria, nke mere ọtụtụ ji ekwu, ọ kachasị na soshal midia, na mmechi ahịa Ladipo bụ mmegide nke a na-emegide ndị Igbo.

Mana Onyekachukwu Igwe, bụ otu n'ime ndị ndu n'ahia ahụ kwuru na nke a abụghị eziokwu.

Igwe kwuru na ha na gọọmenti Legọs steeti dị na mma, ma kwukwaa na ha amalitela mkparịtaụka iji mepee ahịa ahụ.

BBC na-agba mbọ inweta ndị Lawma ka ha tinye ọnụ n'okwu a.

Akụkọ ka na-abịa