Nyocha ‘autopsy’ ekpuheela ihe e cheere gburu Mohbad

Nwamadị na-eti egwu nwụrụ anwụ

Ebe foto si, MOhbad/Instagram

Nyocha ahụ a kpọrọ ‘autopsy’ nke otu ụlọọrụ dị na mba Amerịka mere n’ahụ oti egwu a ma ama bụ Ilerioluwa Aloba (Mohbad) bụ onye nwụrụ anwụ agbaala n’anwụ.

Nyocha ahụ nke ụlọọrụ National Medical Service zigaara ụlọọgwụ Lagos Steeti University Teaching Hospital (LASUTH) kọwara ihe ha cheere kpara ọnwụ nwamadị a.

Nyocha ahụ kwuru na a hụrụ ọgwụ e ji agwọ ọrịa, ọgwụike n’ahụ Mohbad nakwa akụrụngwa ndị ọzọ na-adịghị mma n’ime ahụ Mohbad nke nwereike ibute ọnwụ ya.

Ụlọorụ a kwuru na ha na-eso ụzọ ziri ezi n’ime nyocha banyere ihe butere ọnwa mmadụ.

Ha gara n’ihu kwuo na ọ bụ n’ọnwa Eprel ka ha mechara nyocha banyere ọnwụ Mohbad ma zighachị mpụtara ya n’aka ụlọọrụn na-ahụ maka nyocha na Legọs.

Ihe anyị chọpụtara gburu Mohbad - Ndị uweojii Legọs

Idowu Owohunwa na Mohbad

Ebe foto si, Nigeria Police/Mohbad

Ndị uweojii na Legọs steeti agwala ọha na eze mpụtara nnyocha ha gbasara ọnwụ otiegwu Ilerioluwa Aloba onye a ma ama dịka Mohbad.

Na mgbasaozi nke onyeisi ndị uweojii Legọs bụ Idowu Owohunwa mere n'ehihie ụbọchị Fraịde, o kwuru na ha agbaala mmadụ 26 ajụjụ ọnụ ugbua gbasara ọnwụ Mohbad, nke gụnyere nne na nna ya, ụmụnne ya, nwunye ya, onye nlekọta ya, ndị enyi ya, ndị dọkịta nọ n'ụlọọgwụ oge e bubatara Lekki, ụfọdụ ndị otiegwu na ndị ọzọ.

Dịka Owohunwa si kwuputa, nnyocha ha merela ugbua na-arụtụ aka na mmadụ ise bụ ndị ha na-eche na aka ha dị n'ọnwụ otiegwu Mohbad. Ha gụnyere:

  • Feyisayo Ogedengbe - bụ onye ọrụ ahụike. Ndị uweojii kpọrọ ya 'auxilliary nurse' bụ onye a kpọrọ ka ọ bịa nye Mohbad ọgwụgwọ n'ihi ahụ o merụrụ oge ya na otu n'ime ndị enyi ya lụrụ ọgụ. Ogedengbe bụ onye a kacha enyo enyo n'ọnwụ Mohbad. Dịka ndị uweojii si kwuo, nwaada a enweghị ụlọọgwụ ọ na-arụ na ya ugbua, kama "ọ na-aga ebe ọbụla a kpọrọ ya".
  • Ayobami Sadique, a.k.a. 'Spending' - Enyi nwoke Mohbad onye kpọrọ Feyisayo Ogedengbe ka ọ bịa nye Mohbad ọgwụgwọ n'ụbọchị 11 nke ọna Sepụtemba 2023. Ebubo ndị uweojii boro Sadiq bụ 'conspiracy to commit felony'
  • Ibrahim Oluwatosin Owoduni a.k.a 'Primeboy' - Ya na Mohbad so gaa ọgbakọ ahụ n'Ikorodu' n'ụbọchị 10 nke ọnwa Septemba, mana ha abụọ mechara lụọ ọgụ n'ọgbakọ ahụ, nke mere Mohbad ji merụọ ahụ
  • Samson Balogun Eletu a.k.a. 'Sam Larry' - Ndị uweojii ji ya eji n'ihi ihe onyonyo dị icheiche a hụrụ na soshal midia nke gosiri mwakpo megide Mohbad, bụkwa nke e chere na o so na ihe butere ọnwụ Mohbad
  • Abdulazeez Fashola a.k.a 'Naira Marley - Ndị uweojii jikwa ya maka otu ebubo ahụ.

Ihe nnyocha gosiri

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Owohunwa kwuru na ha chọpụtara na Mohbad gara tie egwu n'otu ọgbakọ n'Ikorodu n'ụbọchị iri nke ọnwa Sepụtemba.

N'ebe ahụ ọ gara iti egwu, Mohabad na otu enyi ya nwoke bụ Owodunni Ibrahim Oluwatosin, onye e ji 'Primeboy' mara, lụrụ ọgụ, o wee merụọ ahụ.

N'echi ya, dịka Mohbad laghachiri n'ụlọ ya dị na Lekki, ebyi ya bwoke ọzọ, a na-akpọ 'Spending', kpọrọ otu nọọsụ ka ọ bịa nye Mohbad ọgwụgwọ.

Nọọsụ ahụ bịara n'ụlọ Mohbad n'ụbọchị 12 nke ọnwa Sepụtemba, wee gbaa Mohbad ọgwụ atọ - tetanus, paracetamol, na setrazone.

Dịka ndị uweojii si kwuo, nwata nwaanyị ahụ kwetara na ọ bụ ọgwụ ọ gbara Mohbad bọlitere ihe dị icheiche n'ahụ ya dịka ịgbọ agbọ, ahụ ịma jijiji na akpataoyi.

Oge nke a mere, ha kpọrọ otu onye agbatobi Mohbad, bụ onye butere ụgbọala ya iji buru ya gaa ụlọọgwụ, ebe a nọrọ kwuo na ọ nwụọla. Ha bugakwara ya n'ụlọọgwụ ọzọ, mana dọkịta kwukwara na ọ nwụọla.

Ndị uweojii sị na ha emeela nnyocha 'autopsy' n'ozu Mohbad iji mata kpọmkwem ihe gburu ya, mana mpụtara nnyocha ahụ apụtabeghị.

Ha kwukwara na ọtụtụ ndị ha gbara ajụjụ ọnụ kwetara na Naira Marley na Sam Larry mekpara Mohbad ahụ ugboro ugboro n'oge ọ dị ndụ.

"N'agbanyeghị na Naira Marley na Sam Larry kwuru na ha anọghị na Naịjirịa oge Mohbad nwụrụ, ọtụtụ ihe akaebe arụtụla aka na ha yiri ndụ ya egwu oge ọ dị ndụ, ma mekpkwaa ya ahụ ugboro ugboro. Nke a mere anyị ji jichie ha abụọ," ndị uweojii kwuru.

Primeboy enyefeela onwe ya n’aka ndị uweojii maka nyocha ọnwụ Mohbad

Ndị uweojii sị na nwamadị a nọ n'aka ha ugbua

Ebe foto si, Mohbad/Police/Primeboy

Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na Owodunni Ibrahim Oluwatosin e ji ‘Primeboy’ maara abịala enyefeela onwe ya n’aka ha.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Benjamin Hundeyin kwuru na ugbua na ha amalitela ịgba ya ajụjụ banyere ihe ọ maara maka ọnwụ lerioluwa Aloba (Mohbad).

O kwuru na nwamadị a mere nke n’ime otu ụbọchị ndị uweojii kwuru na ha na-achọ ya achọ, ma sị kwee nkwa na onye ọbụla aka ya dị n’ọnwụ Mohbad ga-ata ahụhụ dịịrị ya.

N’otu aka ahụ mmadụ abụọ ọzọ a na-enyo enyo bụ Naira Marley na Sam Larry nọ n’aka ndị uweojii ugbua ruo mgbe ha ga-emecha nyocha dịka ụlọikpe siri nye iwu.

Ndị uweojii na-achọ Primeboy

Ebe foto si, Nigeria Police

Cheta na ndị uweojii kwuru na ha kpọrọ nwamadị a oku ka ọ bịara zara ọnụ ya n’ihe ọ ma banyere ọnwụ Mohbad mana o kweghi abịa.

“Site n’isi akwara nwamadị a gbara ịbịa zaa oku anyị kpọrọ ya maka ihe metụtara ọnwụ Mohbad, anyị na-ekwupụta ya dịka onye a na-achọ achọ.”

Ndị uweojii gara n’ihu kọwaa ụfọdụ ihe njirimaara Primeboy nke gụnyere ogologo ya, ụcha ya nakwa akara ndị o nwere ma kọwaa ebe o bi.

Ndị uweojii kwere nkwa ịkwụ onye ọbụla ga-agba eziama ga-enye aka inwuchi nwamadị a egọ dị otu nde naịra (N1,000,000).

Cheta na Mohbad na-eti egwu nwụrụ n’ụbọchị 12 Sepụtemba 2023. Kamgbe ahụ ọnwụ ya ebutela ọtụtụ okwu maka etu o siri nwụọ nakwa etu e siri lie ya.

Nke a mere ndị uweojii jiri malite ime nyocha banyere ọnwụ ya ruo n’ogogo ịbọpụta ozu maka ime ya nyocha.

Ha kpọkwaala ọtụtụ ndị a na-arụ aka na aka ha dị n’ọnwụ ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Mohbad's Death: Ndị uweojii ejichiela Naira Marley

Naira Marley

Ebe foto si, Nairamarley/Instagram

Ndị uweoji Legọs anwụchiela otiegwu Azeez Fashola onye a ma dịka Naira Marley, maka ebubo na aka ya dị n'ọnwụ otiegwu Ilerioluwa Aloba, onye a ma dịka Mohbad.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Benjami Hundeyin kwupụtara nke a n'akara soshal midia ya n'abalị Tuzde.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

A na-atụ anya na Naira Marley ga-enyere ndị uweojii aka na nnyocha ha na-eme gbasara ọnwụ Mohbad bụ onye nọbụ n'otu egwu Naira Marley tupu ha abụọ enwee nghọtahie.

Naịra Marley tinyekwara n'akara soshal midia ya na ya lọbatara na Naịjirịa iji nye aka na nnyocha a na-eme.

"Mụ na ndị uweojii ga-enwe ọgbakọ, olileanya m bụ ka eziokwu pụta ihe, ka ikpe ziri ezi guzosie ike," ka o dere.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Cheta na ndị uweojii nwụchikwara otu onye ntorobịa a ma ama bụ Sam Larry, bụ onye e boro ebubo na ọ kpọrọ ndị mmadụ ga tie Mohabd ihe n'oge gara aga.