Mohbad: Ihe nwunye Mohbad kwuru maka akụkọ nna ụlọikpe sị ya mee nwa ya nnyocha 'DNA'?

Ebe foto si, C33why/Instagram
Nwunye otiegwu Ilerioluwa Oladimeji Aloba a ma dịka Mohbad bụ Wunmi Aloba ekwuola na o nweghị ụlọịkpe ọbụla wetaara ya akwụkwọ ntuziaka ya ga mee nnyocha onye bụ nna nwa ya.
Ụlọikpe majie dị n'Ikorodu Legọs nyere iwu ka nwunye Mohbad gaa mee nnyocha DNA ịchọpụta na ọ bụ Mohbad nwe nwa ya n'ezie.
Mana onye ọkaiwu Oriaku Aloba bụ Taiwo Olawanle kwuru na “anyị enwetaghị akwụkwọ sị na ụlọikpe ahụ, ọ bụrụ na anyị nwetara ya anyị ga amara ihe anyị ga-azaghachị”.
Cheta na ụbọchị 12 nke ọnwa Septemba, afọ 2023, ka ndị ọrụ Mohbad kwuputara na ọ nwụọla.
Kemgbe onye otiegwu Mohbad nwuru, ọgbaaghara na ịhe mgbagwoju anya sochiri.
Ọtụtụ ndị mmadu na-ekwu ka e mee nyocha chọpụta ịhe gburu Mohbad.

Ebe foto si, Mohbad/Instagram
Ụlọikpe na-eme nyocha banyere ọnwụ oti egwu a ma ama bụ Ilerioluwa Oladimeji Aloba e ji Mohbad maara kpọrọ ụfọdụ ndị akaebe ka kwuo ihe ha ma maka ọnwụ ya.
Ụfọdụ ndị ụlọikpe a kpọro oku taa bụ Joseph Aloba bụ nna ya, Wunmi bụ nwunye ya, onye na-akwakọ egwu nakwa nne Mohbad.
Nna ya nyere ụlọikpe akwụkwọ nke bu ihe ndị o nwere ikwu banyere ọnwụ ya dịka ọ malitere ịza ajụjụ.
Ndị ọkaiwu dị iche iche ga-agba ndị a akaebe a ajụjụ ọnụ banyere ihe butere ọnwụ nwamadị a.
Ihe nna Mohbad kwuru n’ụlọikpe
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Joseph Aloba bụ nna Mohbad gbara ama n’ụlọikpe na nwa ya anwụchaala tupu a kpọọ ya n’ekwentị.
“Ahụrụ m ya n’ụbọchị tupu ọ nwụọ, mụ na ya kwuru okwu. Mụ na ya biri n’ụlọ afọ asatọ ruo mgbe o kpebiri ịkwapụ biri ebe ọzọ, naanị oge ọ rịara ahụ m du ya gaa n’ụlọọgwụ bụ mgbe afọ ya zara aza mana a gwọrọ ya.”
“Ọ nwụọla tupu a kpọọ m. O nwere oge ọ kpọrọ m sị na ndị NDLEA nyere ihe ka ọ ṅụọ nke bugara ya n’ụlọọgwụ.”
Nna ya kwuru na e werela akwa ọcha mechie imi ya mgbe o ruru n’ụlọ ha n’ụbọchị 12 Sepụtemba 2023, ụbọchị ọ nwụrụ.
“Nne ya kpọrọ n’ebe elekere ise nke mgbede sị na a gwara ya na o nwere ihe mere Mohbad. N’ihe dịka 9:30 nke abalị ka m ji ruo ebe ahụ mgbe ahụ ọ nwụọla. Mgbe m ruru ụlọ ya ọtụtụ ndị mmadụ juru ebe ahụ.”
O kwuru na ụlọebe a na-echekwa ozu jụrụ ịnabata ozu Mohbad mgbe ha bu ya gaa ebe ahụ
“Anyị bu Mohbad gaa n’ụlọọgwụ dị n’Ikorodu mana ha jụrụ ịnabata ya maka na anyị ejighi akwụkwọ si n’aka ndị uweojii. Mgbe anyị gara n’ụlọọrụ ndị uweojii m tinye aka n’akwụkwọ mana ha ekweghi m were akwụkwọ ahụ e buru ozu nwa m pụọ”
“Mgbe ụlọozu jụrụ ịnabata ozu ya, a gwara m ha dozie ozu ya maka olili. Ahapụrụ m ya pụọ ka m chọọ ebe a ga-eli ya.”
“Dika nwafọ Yoruba, e kwesighi m ịna-ele ozu nwa m anya maọbụ dosa ya n’ụlọ m.”
Nna ya kwuru na ọ bụ onye a kpọrọ Darosha hụrụ maka igbe ozy ya. O kwuru na ọ bụ Davido wetere ego ha ji zụọ igbo ozu ya.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na o nwere mgbe Mohbad na ndị otu egwu ya nwere nsogbu, ọ sị ka o tinye ọnụ mana Mohbad jụrụ sị na ọ ga-emezi ya.
Ndị ụwe ọjii awuchiela Sam Larry

Ebe foto si, Sam Larry/Mohbad/Instagram
Ụloọru ndị ụweọjii nke Lagos steeti kwụrụ na ha awuchiela Balogun Olamilekan Eletu, onye ama dika Sam Larry.
Ha kwuru na ọ na-enyere ha aka na nyocha banyere ọnwụ otiegwu Mohbad
Cheta na ndị ụweeojii kpọrọ Sam Larry oku ka ọ bia zaa ajuju ịhe gbasara ọnwu otiegwụ bụ Ilerioluwa Oladimeji Aloba, ama dika Mohbad.
Na ịzuka gara-aga, ndị ụweojii kwụrụ na ha emechala nyocha ozụ Mohbad nke ndị bekee kpọrọ ‘’Autopsy’’ nke ndị mmadu na-eche ka enwepụta ịhe ha chopụtara.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka 'coroner's inquest' Gọọmentị Legọs ga-amalite

Ebe foto si, Mohbad/BBC
Gọọmentị Legọs steeti agbaala ama na ha ga-amalite nnyocha pụrụ iche nke Bekee kpọrọ 'coroner's inquest' maka ọnwụ Ilerioluwa Aloba a ma dịka Mohbad n'Elekere 12 nke ehihie nke ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba, afọ 2023, n'ụlọikpe Majie dị na #3 Candide-Johnson Courthouse,Ita-Elewa dị na Ikorodu,Legọs
'Coroner's inquest' bụ nnyocha nke a na-eme n'ụlọikpe pụrụ iche maka nke a iji mata onye nwụrụ, etu o siri nwụọ, oge ọ nwụrụ nakwa ebe ọ nwụrụ.
Akwụkwọ ozi ahụ bu akara LAS/313553/Vol1/APO/002/2023 nke onyeisi ụlọikpe pụrụ iche maka nnyocha ọnwụ(Coroner Magistrate) bụ T.A Shotobi binyere aka n'aha onyeisi nnyocha ọnwụ bụ Jọstịs M.A Dada kwuru sị, "Nke a bụ iji gbara gị ama na nnyocha ọnwụ Ilerioluwa Oladimeji Aloba a ma dịka 'Mohbad' ga-amalite na Fraide, abalị 29 nke ọnwa Septemba Afọ 2023."

Ebe foto si, Mohbad/Instagram

Ebe foto si, Naira Marley/Mohbad/Instagram
Otiegwu Naijiria a ma ama bụ Azeez Adeshina Fashola a ma dịka 'Naira Marley' ekwuola na aka na ụkwụ ya adịghị n'ọnwụ nwa be ya bụ Ilerioluwa Aloba a ma dịka Mohbad.
Mohbad nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Septemba afọ 2023 n'ụzọ edoghị anya nke mere ka ụfọdụ ndị mmadụ na-ebo Naira Marley na otu na ndị isi egwu ya a kpọrọ, 'Sam Larry' ebubo n'aka ha dị n'ọnwụ ya.
Tupu ọ nwụọ, Mohbad wepụtaburu ozi nke o kwuru sị a chọ ya ma a hụghị ya, sị jide Naira Marley.
E nwekwara ihe onyonyo fegharịị nke gosiri eme ndị ntorobia a na-ebo n'ebubo na ha si n'aka ụlọegwu Marlian Records na-emekpa ya ahụ.
Mana n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde n'akara Instagram ya, Naira Marley kwuru sị, " Hooha, aka m adịghị n'ọnwụ Ilerioluwa n'ụzọ abụla ụzọ."
Ọ bụghị ihe a hụbeghị na onye egwu na ibe nwere nghọtahịe, ọbuladị ndị ụmụnne na-enwe ngọtahie. Mana nghọtahie anyị nwere erubeghị mmadụ i chere ibe ya echiche ọnwụ."
Naira Marley gara nihu kwuo na ọbụladi nghọtahie ha nwere maka nkwekọrịta metụtara ọrụ ha, na ha ji ụzọ iwu achọ idozi esemokwu ahụ tupu Mohbad anwụọ.
O kwuru na ihe mere ya ji gba nkịtị kemgbe ihe nile na-akpọtụ maka ọnwụ Mohbad bụ iji nye ohere ka ngalaba gọọmentị ọ dị n'aka mee nnyocha ha dịka o kwesịrị.
Naira Marley, onye gbara a ma na ọ nọghị na Naijiria kemgbe abalị 31 nke ọnwa Ọgọstụ, kwuru na ya na-akwado ịlọta ịba zaa oku ndị uweojii kpọrọ ya.












