Nnyocha 'Autopsy' egosila ihe gburu Ifeanyi David Adeleke

Ebe foto si, Davido/Instagram
Ndị uweojii Legọs Steetị ekwuola na nyocha ahụ 'autopsy' e mere n'ozu nwa Davido bụ Ifeanyi David Adeleke gosiri na ọ nwụrụ site na mmiri riri ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC Pidgin nke a n'ekwentị ma sị na mpụtara nnyocha ahụ nwa a akụrụla ọnụ ugbua.
O kwuru na ọ bụ ọrụ ndị uweojii ime ụdịrị nnyocha a ma etu mmadụ si nwụọ edochaghị anya, mana ezinụlọ onye ahụ ga-akwadoo ka e mee ya bụ 'autopsy'.
Ọ gara n'ihu kwuo na e bugala mmadụ abụọ a na-enyocha maka ọnwụ Ifeanyi gawa na ngalaba nnyocha 'State criminial investigation department' (SCID) dị na Yaba.
Hundeyin kwuru na ọ bụghị eziokwu na ha nwụchiri onye a ma ama bụ Eniola Badmus maka ọnwụ Ifeanyi dịka akụkọ si efegharị na soshal midia.
Kamgbe akụkọ ọnwụ nwata pụtara nna ya bụ David Adeleke na nne ya bụ Chioma Rowland ekwubeghi pịịm banyere ya.
Ihe onyonyo a sị na-egosi mgbe Ifeanyi Adeleke nwụrụ bụ asị - Ndị uweojii

Ebe foto si, OTHER
Ndị uweoji ekwuola na ihe onyonyo na-efegharị nke na-egosi ihe ndị mmadụ siri na ọ bụ oge nwa otiegwu Davido nwụrụ na mmiri bụ akụkọ ụgha.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin kwuru sị, " Anyị ebidobeghị ile ihe onyonyo ụlọ ahụ nke anyị nwetara. Ihe onyonyo ọbụla na-efegharị ugbua bụ akụkọ asị".
Dịka o siri dị, ndị ngalaba BBC na-enyeocha maka akụkọ ugha nke bụ BBC Disinformation Unit kwuru na ya bụ ihe onyonyo esighị na Naijirịa.
Ha nyochapụtara na ihe onyonyo a na-efegharị bụ nke nwatakịrị dị afọ abụọ bụ onye mba Chaịna.
Ihe mere Ifeanyi Adeleke ji bụrụ nwa ọha niile hụrụ n'anya

Ebe foto si, Davido/Instagram
Dịka akụkọ ọnwụ nwa Davido bụ onye otiegwu a ma ama malitere iwu, ọtụtụ ndị mmadụ amalite ilebanya n'oge ndụ ya kacha metụta mmụọ ha. Foto nakwa ọtụtụ ihe onyonyo ya na-efesa na soshal midia dịka ụwa na-akwa arịrị.
Lee ụfọdụ oge ndụ ya metụrụla ndị mmadụ dika ozi si na soshal midia nakwa intanetị si egosi.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Mgbe Davido ji foto ifeanyi mere ihu nchịkọta egwu ya bụ ‘Better Time’
Nchịkọta egwu Davido wepụtara n’afọ 2020 a kpọrọ ‘Better time’ gosiri ọmarịcha foto e sere Ifeanyi ebe ọ na-egbe igbe n’ala.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ejikarị foto ihe gbara ọkpụrụ na ndụ ha maọbụ ihe kachasị metụta ha eme ihu nchịkọta egwu ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Ihe onyonyo ebe Chioma na-enye Ifeanyi nrị
E nwere mgbe Chioma kesara ihe onyonyo ebe ọ na-enye nwa ya nrị n’aka Instagram ya nke medara obi ọtụtụ.
Nne na nwa nọ na-ege otu egwu Davido bụ ‘One thing’ n’ihe onyonyo ahụ.
Chioma dere “Otu ihe m kacha achọ kemgbe bụ gị”
“Nwata m a hụrụ egwu n’anya nke ukwuu”
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 3
Mgbe Chioma kesara foto ya na Ifeanyi ebe ọ kpara isi
Ifeanyi na nne ya kpalitere mmụọ n’ụzọ ọma dịka Chioma gosiri ọha etu o siri hụ nwa ya n’anya ma bụrụ ọkaibe na nleta nwa.
O kesera foto ebe ha abụọ nọkọ ọnụ nakwa nke ha abụọ na-ekpori ndụ ma mekwa ọnụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 4
Ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke abụọ
E nyinyere Ifeanyi uwe ụdị nke ejiji ndị Yoruba na ife foto e kesara iji cheta ụbọchị ọmụmụ ya nke abụo. Foto saara ọkụ na soshal midia mgbe Davido kesara ya dịka ọtụtụ ndị nso nso ya gosiri na ọ masịrị ha nke ukwuu.
Davido gwara ọha na ọ hụka nwa ya nwoke n’anya dịka ọ kesara foto ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 5
Ihe onyonyo gosiri ebe David na Ifeanyi na-egwu egwu
N’otu ihe onyonyo Davido kesara na soshal midia ya, ọ gosiri ebe Ifeanyi na-agba ọsọ n’ime ụlọ ha ma dee na ‘ụkwụ na-ọghọ ya nkọ’ n’egwuregwu ma kwuo na ọ na-atụ anya na otu ụbọchị Ifeanyi ga-aga asọmpị Olympics nke ụwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 6
Foto ụbọchị ncheta ya nke atọ
N’ụbọchị 20 nke ọnwa Ọktoba ka gara aga, Davido na Chioma kesara foto nwa ha ebe ọ n’elu oche na-achị ọchị. A chịkọrọ isi ya ma nyinye ezigbo uwe ọma.
Davido dere na soshal midia ya “E ji m obi niile na-ekpe ekpere ka Chukwu nye gị ahụike zuruoke nakwa obi aṅụrị nke mmadụ agaghị enweike nye onye ọzọ, ka ogogo gị karịa nke n’ụzọ niile”
Etu ndị uweojii si nwụchie mmadụ asatọ maka ọnwụ Ifeanyi, nwa Davido

Ebe foto si, Chioma/Davido
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị uweojii Legọs Steetị sị ha anwụchiela mmadụ asatọ maka ọnwụ Ifeanyi David Adeleke bụ nwa oti egwu a ma ama bụ Davido
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Lagọs Steetị bu Benjamin Hundeyin gwara BBC Pidgin na nwata a anwụọla n'ezie.
Ọ sị na ha eburula ozu ya gawa n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu mmadụ.
Akụkọ maka ọnwụ nwatakịrị a bidoro na-efegharị na Soshal Midịa n'abalị Mọnde 31 Ọktọba 2022 na-asị na ọ bụ n'ime 'Swimming Pool' ka mmiri nọọrọ rie ya bụ nwatakịrị.
Hundeyin kwuru na ọ bụ otu n'ime ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ ha bịara gwa ndị uweojii ihe mere.
O kwuru sị, "Anyị ga-atọhapụ ndị ọrụ asatọ a anyị nwuchiri mgbe anyị mechara nyocha anyị".
Dịka o siri dị, enwebeghị ihe nne na nna nwatakịrị a kwuru maka ọnwụ nwa ha.
Tupu nke a emee, e nwere ihe onyonyo na-egosi ebe Davido na-akụzịrị ya bụ nwatakịrị etu esi egwu mmiri.
Hundeyin kwuru na ha ebidola nyocha ha ma sịkwa na ha na Davido na Chioma na-akpa.
Nke a bụ ugboro abụọ mmiri gburu nwa onye a ma ama na Naijirịa dịka nwa D'banji nwụrụ n'afọ 2018.
Ihe ị kwesịrị ịma maka David Adeleke bụ 'Davido'.

Ebe foto si, Davido/Instagram
David Adeleke bụ nwaafọ Naijirịa na-eti egwu ama ama n’ọtụtụ ebe na mba ụwa niile.
Ya na ndị ọzọ etiela egwu ma na Naijirịa na mba ndị ọzọ.
Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ị kwesịrị ịma maka Davido.
Ndụ ime ụlọ ya
A mụrụ ya n’ọnwa Nọvemba nke afọ 1992.
Ọ bụ onye Osun steeti.
A mụrụ ya n’Atlanta Georgia nke mba Amerịka.
Ọ mụrụ ụmụ anọ kama ọlụbeghị nwaanyị.
Ọ gụrụ maka egwu na Babcock University nke dị n’Ogun Steeti ma jiri ntụruugo kachasị were pụta n’afọ 2015.
Ndụ ya dịka onye na-eti egwu
O tipụtara egwu mbụ ya ọ kpọrọ ‘Dami Duro’ n’afọ 2011.
O tipụtara ọba egwu mbụ ya ọ kpọrọ ‘Omo Baba Olowo’ n’afọ 2012
Ya na nwanne ya nwoke bidoro ụlọọrụ egwu bụ HKN kama Davido hapụrụ ya bido nke ya ọ kpọrọ DMW dịka ya na ụloọrụ Sony nwechara nkwekọrịta.
Onye bụ Chioma Rowland

Ebe foto si, chefchiomaofficiall/Instagram
Chioma Avril Rowland eji Chef Chioma mara bụ nne mụrụ Ifeanyi.
Ọ bụ n'afọ 2018 ka Davido gosiri ndị uwa na ya na Chioma na-ayị ọyị.
Chioma na-esi nri ma na-akwa kwa akwa.
Ọ bụ Chioma n'ime ndị niile mụụrụ Davido nwa ka ya na ya kacha dị na mma.
Chioma na Davido

Ebe foto si, chefchiomaofficiall/Instagram
Chioma na Davido kwere nkwa ilụonwe ha n'afọ 2019.
Ndị mmadụ nọ na-atụanya na ha ga-alụ onwe ha n'afọ 2020 kama o meghị.
N'ọnwa Oktoba afọ 2022 ka ihe onyonyo na foto pụtara nke gosiri Davido na Chioma ebe ha nokọrọ ọnụ.
Kama ha abụọ pụtara mee emume ncheta ụbọchị ọmụmụ nwa ha n'ọnwa Oktoba nke afọ a.
Etu ndị mmadụ si anabata ozi ọnwụ Ifeanyi
Ọtụtụ ndị a ma nakwa ndị ogbo Davido n’ọrụ ịkpa obi ụtọ amalitela izipụta ozi iti aka n’obi nye David na Chioma banyere ọnwụ nwa ha.
Ọtụtụ na-eru uju na soshal midia dịka ozi mwagba obi jupụtara ebe niile.
Ozi iti aka n’obi ndị a gụnyere ndị si n’aka Peter Obi na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’aha Labour Party, Bola Ahmed Tinubu na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’aha All Progressives Congress (APC), Osote onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'aha PDP bụ Ifeanyi Okowa, Burna Boy Psquare, Obi Cubana, Waje, Stefflon Don, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Otu pati Peoples Democratic Party (PDP) nke alaka Osun steeti amachiela atụmatụ ndọrọndọrọ ọchịchị nwa mgbe nta iji nkwanyere Davido na ezinaụlọ ya ugwu pụrụiche n’oge a.
Cheta na Davido so na ndị kacha rụọrọ nwanne nna ya zọtara ọkwa gọvanọ steeti ahụ n’aha PDP ọrụ achụmnta vootu n’ọnwa Jụlaị, 2022 mgbe e mere ntuliaka gọvanọ steeti ahụ.
Davido ji akara soshal midia ya nakwa ikike ya dịka onye a ma ama gosi Ademola Adeleke nkwado pụrụiche.











