'Itu ndị mmadụ aha bụ ihe dopuru m iche' - Akachukwu Iwuchukwu
- Onye dere ya, Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Akachukwu Iwuchukwu bụ onye na-ere akwa ọgazi n'okporoụzọ Obosi dị nso n'Ọnịcha.
O malitere iwu ewu mgbe ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-etu mmadụ aha n'ụzọ pụrụiche dịka ọ na-achọ iresi ya akwa.
O ji ilu Igbo, okwu igbo pụrụiche na ihe ndị ọzọ akpalite ndị mmadụ obi aṅụrị ma ọ na-etu ha aha n'ụzọ. Itu aha a emepeerela ya ụzọ akụ nakwa ihu ọma ndị ọzọ kemgbe ihe onyonyo ya pụtara
Ọ kọwaara BBC ihe mere o ji eme nke a mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ.
Gee ihe o kwuru n'uju.

Ebe foto si, BBC/Screenshot
Kedụ uru itu aha bara n'ala Igbo?

Itu aha bụ otu omenala Igbo a ma ama na mba ụwa niile.
Ọ bụkwa ụzọ pụrụiche e ji ekele ndị isi ahụrụ kwaba okpu.
N'oge gboo ọ bụ ụfọdụ ndị Eze, ndị ọgaranya na ndị chiri echichi ka a na-emere ya bụ ihe.
Ọ bụkwa naanị ụfọdụ ndị mmadụ ma eme ya bụ ihe pụrụiche maka na ọ bụ ihe a na-amụta.









