Little Prophet: "A taara m ahụhụ n'ụwa mbụ m lọrọ dịka onye dibia"

Aha onyonyo, Little Prophet: "A taara m ahụhụ n'ụwa mbụ m lọrọ dịka onye dibia"

Nwamadị Ejike Iloanya bụ onye e ji Little Prophet maara kọwaara etu o si mụta ma malite ịtụ ilu Igbo ndị ọ na-eji akpa ọchị.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ejike sị na ọ bụ n'aka nna ya nwụrụ anwụ ka o si mụta ọtụtụ ilu Igbo ọ na-atụ.

Ọ gaara n'ihu kwuo na ihe mere o ji anọkaarị n'etiti ndị okenye bụ maka na ọ na-amụta ezi ihe dị mkpa n'aka ha karịa n'etịtị ụmụaka ibe ya, bụ ebe ọ bụ naanị egwuregwu ka ụmụaka ma.

Ejike sị na ọ chọrọ ịbụ onye amụma maka na ụwa mbụ ọ lọrọ n'obodo Umunya dịka onye dibia na ọ tara ahụhụ.

Ọ mekwara ka anyị mata na iti egwu na-amasị ya nke ukwuu.

Kiriie ihe o kwuru n'uju;

Ndị mere ya bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: